Igbo Mass Readings for June 5 2023, Mọnde n’ime Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 5 2023, Mọnde n’ime Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:1, 2; 2:1-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Tobit
Akụkọ maka ihe ndị Tobit mere, nwa Tobiel, nwa Ananiel, nwa Aduel, nwa Gabel nke agbụrụ Asiel na ọnụmara nke Naftali, onye nke a dọkpụụrụ n’agha site na Tisbe nke nọ na ndịda Kadesh-Naftali n’ime Galili n’elu Asha, n’oge ọchịchị Shalmanesa bụ eze ndị Asịria.
N’oge ọchịchị Esahadọn alọghachitere m n’ụlọ. Enyeghachiri m nwunye m Anna na nwa m Tobiyas. N’oge emume Pentikọst, bụ emume izu ụka asaa, e nwere ezigbo oriri. Eweere m ọnụdụ m maka oriri a.
Mgbe m hụrụ ọtụtụ nri a kwadobere, agwara m nwa m sị, “Gaa kpọta onye ogbenye ọbụla ị hụrụ n’etiti ikwuniibe anyị, nke na-atụrụ Dinwenụ egwu. Aga m echere gị”.
Tobiyas mere dịka nna ya, siri gwa ya. Ma ọ laghachiri azụ sị, “Nna, a hịgbuola otu onye ikwuniibe anyị ma tụnye ya n’ọgbọ ahịa”. Ebiliri m ozigbo tupu m metụ ihe ọbụla ọnụ buru ozu ya buga n’ebe ndo dị, na-eche ka anwụ daa tupu m lie ya.
Mgbe m lọghachitere, asachara m onwe m bịa jiri iru ụjụ rie nri m. Mgbe ahụ echetara m amụma Amọs buru sị, “Emume ụnụ ga-aghọ iru ụjụ, mmemme ụnụ ga-aghọ akwa arịrị”.
M wee bee akwa. Mgbe anwụ dara, agara m gwuo ili wee lie ozu ahụ. Ndị agbataobi m chịrị m ọchị na-asị, “Ọ nakwaghị atụ egwu na a ga-egbu ya maka ime ihe a; o nwere mgbe ọ gbafuru, ma ugbu a ọ na-eli ozu ọzọ!”.
Mgbe m lọtara n’abalị ahụ m lichara ya, arahụrụ m n’akụkụ mgbidi obi n’ihina adịghị m ọcha, ekpuchikwaghị m ihu m n’ihina, ekpomọkụ dị n’abalị ahụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 112:1-2,3-4,54
Azịza: Añụrị na-adịrị onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu.
1. Añụrị na-adịrị onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu,
onye ji ọñụ na-edebe iwu ya!
Ụmụ onye dị otu a ga-abụ ndị nwere ike n’ụwa,
agbụrụ onye ezigbo omume ga-enweta ngọzi. Azịza
2. Ezinụụlọ ya ga-enweta akụnụụba,
eziomume ya agaghị enwe mgbanwe
N’ihina onye ezigbo omume
ga-achawapụta dịka ihe n’etiti ọchịchịrị,
ọ dị ebere, ịhụnaanya na-akwụba aka ọtọ. Azịza
3. Ya bụ ezigbo mmadụ anaghị ana ọmụrụnwa ma o binye ego,
ọ bụ onye eziokwu n’ihe niile ọ na-eme.
Ebe eziomume chedoro ya, ọ na-enwe ịkwụdosike,
ọ na-ahapụ ncheta ga-adị ebeebe n’azụ ya. Azịza
MBEKU – Jemis 1:21
Alleluia, Alleluia:
Werenụ nwaayọ nara okwu ahụ nke a kụrụla n’obi ụnụ dịka mkpụrụ, nke pụrụ ịzọpụta mkpụrụobi ụnụ.
Alleluia.
OZIỌMA – 12:1-12
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Jesu malitere iji ụkabụilu gwa ndị isi nchụaja, ndị odeakwụkwọ, na ndị okenye okwu sị, “Otu nwoke kọrọ ugbo vaịn, gbaa ya ogige gburugburu gwuo olulu ebe ọ ga-echekọta mmanya a ga-apịpụta na mkpụrụ vaịn, wukwaa ụlọelu nche maka ubi ya.
O nyefere ya n’aka ndị nlekọta, gaa n’obodo ọzọ. Mgbe oge ịghọ mkpụrụ ruru, o zigaara ndị nlekọta ahụ otu nwodibo ya ka ọ nata ha oke nke ya n’ihe e wetara n’ugbo vaịn ahụ. Ma ndị nlekọta ubi ahụ jidere nwodibo ahụ, tie ya ihe, zilaa ya n’aka efu.
E mechaa, o zigakwa nwodibo ọzọ, ndị nlekọta ugbo vaịn ahụ a kụwaa ya isi, menye ya ihere. Onye nwe ugbo ahụ zitekwara nwodibo ya ọzọ, ha wee gbuo ya. Ha mesokwara ọtụtụ ụmụodibo ya otu aka ahụ, ụfọdụ ka ha tiri ihe, ụfọdụ ka ha gburu egbu.
Ọ ka nwere otu onye fọrọ nke ọ na-ezitebeghị, bụ nwa ya nwoke ọ hụrụ n’anya. N’ikpeazụ o zigaara ha nwa ya nwoke, chee sị: Ha ga-asọpụrụ nwa m nwoke. Ma ndị nlekọta ahụ kwurịtara n’etiti onwe ha sị, “Leenụ onye ga-eketa akụnụụba nna ya, bịanụ ka anyị gbuo ya, ka ihe niile a bụrụ nke anyị.
Ha wee jide ya, gbuo ya ma tụpụ ozu ya n’ugbo vaịn ahụ. Jesu ajụọ ha sị, “Gịnị ka onye nwe ugbo vaịn ahụ ga-eme? Ọ ga ebibi ndị nlekọta ubi ahụ, werekwa ugbo ya nyefee n’aka ndị ọzọ.
Ọ bụ na ụnụ agụbeghị ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ: Okwute ahụ nke ndị na-arụ ụlọ jụrụ ajụ abụrụla ide ji ụlọ. Nke a bụ ọrụ nke Dinwenụ ọ dị ịtụnaanya n’anya anyị”.
Ha kaara ijide ya n’ihina ha chọpụtara na ọ kọrọ akụkọ ụkabụilu a megide ha. Ma n’ihina ha na-atụ igwe mmadụ ahụ egwu, ha hapụrụ ya ma pụọ.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.