Igbo Mass Readings for December 2 2024, Mọnde Izuụka nke Mbụ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka December 2 2024, Mọnde Izuụka nke Mbụ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:1-5
Ihe ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya
Nke a bụ ihe Aịzaya, nwa Amọz, hụrụ gbasara Juda na Jerusalem. Oge na-abịa mgbe ugwu nke ụlọnsọ nke Yahweh ga-adị elu karịchaa ugwu niile, a ga-ewelikwa ya elu karịa ugwu nta niile. Mba niile ga na-asọba na ya dịka mmiri.
Ọtụtụ ndị mmadụ ga-abịakwa na asị, “Bịanụ ka anyị rịgoo n’ugwu nke Yahweh, bụ ụlọnsọ Chineke nke Jekọb; ka ọ kụziere anyị ụzọ ya, ka anyị nwee ike ịga ije n’ụzọ ya.” N’ihi na site na Zayọn ka iwu ahụ ga esi abịa, okwu nke Yahweh ga-esikwa na Jerusalem bịa.
Ọ ga-abụ onye ikpe nke mba niile, ọ ga-edoziri ọtụtụ mmadụ esemokwu n’etiti ha; Ha ga eji mmagha ha kpụọ ọgụ, werekwa ube ha kpụọ nko. Mba ọbụla agaghị ebusokwa mba ọzọ agha, nke ha ga-enwe mmụọ i bu agha. O, ụlọ Jekọb, bịanụ ka anyị na aga n’ihè nke Yahweh.
MA Ọ BỤ
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:2-6
Ihe ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya
N’ụbọchị ahụ, ngalaba nke Yahweh ga-amachasị mma jupụtakwa n’ebube; mkpụrụ nke ala ahụ ga abụkwa ihe nganga na ihe ịchọ mma nye ndị ga-afọdụ n’ala Izrel.
Onye ọbụla ga-afọ na Zayọn na Jerusalem ka a ga-akpọ onye dị nsọ, bụrụkwa ndị a họpụtara ka ha dị ndụ na Jerusalem.
Nke a ga-eme mgbe Yahweh jirila mmụọ nke ikpe nkwụmọtọ na mmụọ nke mmebi sachapụ iru inyi nke ụmụada Zayọn nakwa ọbara nke metọchara Jerusalem.
Mgbe ahụ, Yahweh ga-abịa kpuchie elu ugwu Zayọn na ndị niile gbakọrọ na ya; ọ ga ezite urukpu n’ehihie, zitekwa anwụrụ ọkụ na enwu enwu n’abalị; ebube ya ga-ekpuchi obodo ahụ niile.
N’ehihie, ọ ga-egbochiri ha ekpomọkụ; ọ ga-abụkwara ha ebe mgbaba mgbe oke mmiri na-ezo.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 122, 1-2. 3-4. (4-5.6-7) 8-9
Azịza: Añụrị juru m obi mgbe m nụrụ ha kwuru sị, “Ka anyị gaa n’ụlọ nke Chineke.
1. Añụrịrịm ọñụ mgbe ha kwuru sị
ka anyị gaa n’ ụlọ nke chineke.
Ugbu a, anyị kwụzi
n’ọnụzọ ama gị, O Jerusalem. Azịza
2. A rụrụ Jerusalem dịka obodo
ejikọtara ọnụ nke ọma.
Ọ bụ na ya ka agbụrụ niile na-aga,
agbụrụ nke Israel. Azịza.
3. Inye Onyenweanyị ekele
dịka o siri nye n’iwu,
Ebe ahụ ka e dobere oche ikpe eze,
ocheeze nke ụlọ Devid. Aziza.
4. Kpeenụ ekpere maka udo nke Jerusalem sị:
“Ka ndị niile hụrụ gị n’anya nwee ọganihu,
udo dịrị n’ime gi,
dịrịkwa n’ime obi ndi eze gị.” Azịza.
5. N’ihi ụmụnna m na ndi enyi m,
ana m asị: “Udo dịrị gị,”
N’ihi ụlọ nke Onyenweanyị na Chineke anyị
aga m achọ maka ọdịmma nke gị. Azịza.
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
Bịa zọpụta anyị Onyenweanyị na Chineke anyị; ka anyị hụ ihu gị, ka anyị wee nwe nzọpụta.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 8:5-11
Ihe ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.
Ka Jesu batara Kapanaum, otu onye ọchịagha bịakwutere ya rịọ ya sị, “Onyenwe m, nwodibo m tọgbọrọ n’ụlọ n’oke ahụ mgbu, akụkụ ahụ ya nwụrụ anwụ.”
Jesu asị ya: “Aga m abịa ịgwọ ya.’ Ma onye ọchịagha ahụ zara ya sị, “Onyenwe m, ma kwuo sọ okwu gị, nwodibo m ga-adị mma.
N’ihi na mụ onwe m bụ onye nọ n’okpuru ike ọchịchị, enwekwara m ndị agha nọ n’okpuru m; ana m enye otu onye iwu ‘gaa’, ọ gaa, sị onye nke ọzọ ‘bịa’ ọ bịa, m nyekwa nwodibo m iwu ‘mee otu a’ o mee ya.”
Nke a tụrụ Jesu n’anya mgbe ọ nụrụ ya. O wee sị ndị na eso ya: “N’ezie agwa m ụnụ, ahụbeghị m ụdị okwukwe dị otu a ọbụladị n’Izrael.
Agwa m ụnụ, ọtụtụ ga-esi n’ ọwụwa anyanwụ na n’ọdịda anyanwụ bịa nọnyere Abraham, Aịzik na Jekọb”.
Igbo Mass Readings for December 3 2024, Tuzde Izuụka nke Mbụ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị
Igbo Mass Readings for December 2 2024, Mọnde Izuụka nke Mbụ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị