Igbo Mass Readings for January 12 2026, Mọnde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 12 2026, Mọnde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:1-8

Ihe ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ mbụ nke Samuel

E nwere otu nwoke aha ya bụ Elkana. Nwoke ahụ bụ onye agbụrụ Ifrem. O bi n’obodo Rama nke dị n’obodo Ugwu Ifrem. Nwoke ahụ bụ nwa Jeroham, nwa Elihu, nwa Tohu, nwa Zuf. Elkana lụrụ ụmụnwaanyị abụọ. Aha otu bụ Hana, aha nke ọzọ bụ Penina.

Penina mụtara ụmụ, ma Hana amụtaghị. Kwa afọ, Elkana na esi n’obodo ya bụ Rama jee Shịlo ịchụrụ Yahweh, Chineke nke Igwe ndịagha aja na ife ofufe ndụ.

N’ebe ahụ, ụmụ Elaị abụọ, Hofni na Finehas, bụkwa ndị ụkọchukwu Yahweh. Mgbe ọbụla Elkana chụụrụ Yahweh aja, ọ na ekenye Penina na ụmụ ya niile, onye ọbụla n’ime ha oke.

Ma, ọ bụ ezie na ọ hụrụ Hana n’anya, ọ na-enye ya naanị otu oke, n’ihina Chineke mechiri akpanwa ya. Penina, bụ nwunye di ya, na-akpasu ya iwe mgbe ọbụla, na-akparị ya, n’ihina Yahweh mere ya nwaanyịaga. Otu a ka Elkana na-eme kwa afọ.

Mgbe ọbụla ha jere n’ụlọnsọ Yahweh, Penina ga-akpasurịrị Hana iwe nke ukwu. Nke a mere Hana ji ebe akwa nke ukwuu gharakwa iri ihe. Elkana di ya na-ajụkwa ya sị, “Hana, gịnị mere I ji ebe akwa? Gịnị mere I ji jụ iri ihe? Gịnị mere I ji eru uru? Ọ bụ na m adịghị gị mkpa karịa ụmụ iri”?

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 116: 12-13, 14-17, 18-19

Azịza: O Dinwenụ, ngị ka m ga-achụnyere aja otito.

1. Kedụ ihe m ga-enye Onyenweanyị

Maka iheọma niile o meere m?

Aga m ebuli iko nzọpụta,

Wee kpọkue aha nke Onyenweanyị. Azịza

2. Aga m emejupụta nkwa m kwere Onyenweanyị

N’ihu ndị nke ya niile

Ọnwụ onye eziomume dị oke ọnụ

N’ebe Onyenweanyị nọ.

Onyenweanyị, abụ nwodibo gị

Nwa nwaanyị ezigbo omume

Ị tọpụla m n’agbụ

Aga m achụrụ gị aja ekele

Wee kpọkue aha nke Onyenweanyị. Azịza.

3. Aga m emejupụta nkwa m kwere Onyenweanyị,

N’ihu ndị nke ya niile.

N’ogige ụlọ nke Onyenweanyị,

N’etiti gị Jerusalem. Azịza

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

Site n’oziọma anyị, Ọ kpọrọ ụnụ ka ụnụ wee nweta otito nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi.

Alleluia.

OZIỌMA – 1:14-20

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.

Ka e jidechara Jọn, Jesu bịara na Galili na-ekwusa oziọma nke Chineke. Wee na-asị, “Oge ezuola. Alaeze Chineke abịala nso, Chegharịa ma kwerenụ n’oziọma”. Mgbe ọ na-aga n’ụzọ osimiri Galili, ọ hụrụ ndị ọkụazụ abụọ, Saịmọn, na Andru nwanne ya, ka ha na-awụnye ụgbụ ha na mmiri.

Ma Jesụ sịrị ha, “Sobenụ m, aga m eme ụnụ ndị na-akụta mmadụ.” Ngwangwa, ha hapụrụ ihe niile ha ji egbu azụ sobe ya.

Ka ọ gatụrụ n’ihu ntakịrị, ọ hụrụ ụmụnne abụọ, Jemis na Jọn, ụmụ Zebedi ka ha nọ n’ụgbọ, na-edozi ihe ha ji akụ azụ. Ozigbo ahụ ọ kpọrọ ha; ha hapụrụ nna ha Zebedi na ndị ọrụ ngo ha n’ụgbọ, sobe ya.

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for January 12 2026, Mọnde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 5, 2022