Igbo Mass Readings for January 6 2025, Mọnde na-eso Ụka Epifani

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka January 6 2025, Mọnde na-eso Ụka Epifani.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:22-24. 4:1-6

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Jọn nke mbụ

Anyị na anata n’aka ya, ihe ọbụla anyị na-arịọ, n’ihi na anyị na-edobe iwu ya na-emekwa ihe na- amasị ya. Nke a bụ iwu ya; na anyị ga-ekwenye n’aha nke Nwa ya bụ Jesu Kristi ma hụrịtakwa onwe anyị n’anya dịka o si nye anyị na iwu.

Ndị niile na-edobe iwu ya na-ebi n’ime ya, ya onwe ya na-ebikwa n’ime ha. N’ụzọ dị otu a, anyị na-ama na o bi n’ime anyị, site na Mmụọ nke o nyere anyị.

Ndị m hụrụ n’anya, ụnụ ekwenyela mmụọ niile, kama nwaleenụ mmụọ niile ka ụnụ chọpụta ma ha bụ mmụọ nke Chukwu. N’ihina ọtụtụ ndị amụma ụgha ejupụtala n’ime ụwa.

Otu a ka ụnụ ga-esi mata nke bụ mmụọ Chineke. Mmụọ ọbụla nke na-ekwupụta na Jesu Kristi bịara n’ụdị mmadụ bụ mmụọ nke Chineke. Nke na-anaghị ekwupụta Jesu Kristi abụghị Mmụọ nke Chineke.

Nke a bụ mmụọ nke onyeiro Kristi, nke ụnụ nụrụla na ọ na-abịa, ugbu a, ọ nọrọlarị n’ụwa. Ụmụntakịrị, ụnụ bụ ndị nke Chineke, ụnụ emerikwaala ha; n’ihina onye nọ n’ime ụnụ karịrị onye ahụ nke nọ n’ụwa.

Ha bụ ndị nke ụwa, ihe ha na-ekwu bụ nke ụwa. Ụwa na-egekwa ha ntị. Anyị bụ ndị nke Chineke. Onye ọbụla maara Chineke na-ege anyị ntị. Onye na-abụghị onye nke Chineke anaghị ege anyị ntị. Site n’ụzọ dị otu a, anyị ga-amata Mmụọ nke eziokwu na Mmụọ nke ụgha.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 2:7-8, 10-11.

Aziza: Aga m enye gi mba niile, ka ha buru nke gi.

1. Onyenweanyị gwara m sị, ‘Ị bụ nwa m,

taata A bụrụla m nna gị.

Rịọ m arịrịọ, aga m enye gị mba niile,

ka ha bụrụ nke gị;

ka akụkụ ụwa niile bụrụ ebe ọchịchị gị. Azịza

2. Ya bụ ugbu a, ụnụ ndị eze, mụtanụ akọ,

ndị ọchịchị nke ụwa, kpacharanụ anya.

Febenụ Yahweh, tụbanụ ya egwu;

maanụ jijiji n’ihu ya, ma susuo ụkwụ ya ọnụ. Azịza

MBEKU

ALLEUIA ALLELUIA:

Ndị bi n’ọchịchịrị ahụla oke ihè. Ihè achakwasịla ndị bi na ndagwurugwu ọnwụ.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 4:12-17, 23-25.

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Mgbe Jesu nụrụ na ejidela Jọn, Ọ laghachiri Galili. Ọ hapụrụ Nazaret, gaa biri na Kapanaum nke dị n’akụkụ osimiri dị n’oke ala Zebulum na nke Naftalị.

Nke a bụ iji mejupụta ihe onye amụma Aịzaya kwuru sị, “Ala Zebulum na ala Naftalị, nke dị n’akụkụ Osimmiri, n’ofe nke Jọdan, Galili nke ndị mba ọzọ. Ndị bi n’ọchịchịrị ahụla oke ihè. Ihè achakwasịla ndị bi na ndagwurugwu ọnwụ.”

Site n’oge ahụ Jesu malitekwara ikwusa oziọma sị, “Chegharịanụ, n’ihi na alaeze eluigwe adịla nso. Jesu na-agagharị na Galili niile na-akụzi ihe n’ụlọ nzukọ ha, na-ekwusakwa oziọma nke ala eze Chineke.

Ọ gwọkwara ndị mmadụ ọrịa na nrịanrịa ha dị iche-iche. Ude Jesu gbasara n’ala Judia niile nke na ndị mmadụ na-akpọtara ya ndị niile ahụ na-adịghị ike, ndị ọrịa na ahụ mgbu dị iche-iche.

Ha kpọtaara ya ndị ajọ mmụọ ji, ndị akwụkwụ na-adọ na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ. Jesu gwọrọ ha niile. Oke igwe mmadụ siri na Galili, Dekapọlis, Jerusalem, Judia na ofe Jọdan soro Jesu.

Igbo Mass readings for January 7 2025, Tuezde na-eso Ụka Epifani

Igbo Mass Readings for January 6 2025, Mọnde na-eso Ụka Epifani

Last Update: June 6, 2021