Igbo Mass Readings for September 15 2023, Ncheta Ezenwaanyị jiri Okwukwe nara Ahụhụ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 15 2023, Ncheta Ezenwaanyị jiri Okwukwe nara Ahụhụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:7-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi e degaara ndị Hibru
Mgbe Jesu ka dị ndụ na anụ ahụ, o ji ibe akwa na anyammiri chee ekpere na arịrịọ ya n’ihu onye ahụ nke nwere ike ịzọpụta ya n’ọnwụ. A nụrụ olu ya n’ihi ịtụ egwu nke Chineke ya.
Ọ bụ ezie na ọ bụ nwa Chineke, ma o sitere n’oke ahụhụ mụta irubeisi; mgbe e mechara ya ka o zuo oke, ọ ghọọrọ ndị niile na-erubere ya isi, isi iyi nke nzọpụta ebeebe.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 31: 1-2, 3-4, 5-6, 15-16, 20.
Azịza: Were ịhụnaanya Gị zọpụta m
1. Na gị, ka m gbabara, O Osebụrụwa;
ekwekwala ka ihere mee m;
site n’eziomume gị zọpụta m,
Gee m ntị, bịa ọsọọsọ ka ị zọpụta m. Azịza
2. Bụrụ nkume nke mgbaba m,
ide nke ga-azọpụta m
N’ihina ị bụ nkume m, na ide m;
n’ihi aha gị dube m, ma chekwaba m. Azịza
3. Ekwekwala ka m daba n’ọnya ha kweere m,
n’ihina gị bụ ebe mgbaba m.
N’aka gị ka m tinyere mmụọ m,
Ị gbapụtala m Osebụrụwa. Azịza
4. Na gị ka m tụkwasịrị m obi, O Osebụrụwa.
Ana m ekwu sị, “Gịnwa bụ Chineke m.”
Ụbọchị m niile dị gị n’aka;
Zọpụta m n’aka ndịiro m na ndị na-emekpa m ahụ. Azịza
5. Lee ka ịdịmma gị siri dị ukwuu, O Osebụrụwa
nke I dobeere ndị niile na-atụrụ gị egwu
na nke I na-enye ndị niile gbabara na gị
ka ụwa niile wee jiri aka ha hụ. Azịza
MBEKU
ALLELUIA, ALLELUIA:
Ma mmaagha ga-amawa gị obi ka e were kpughe ihe dị ọtụtụ mmadụ n’obi.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 19:25-27.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Marịa nne Jesu na nwanne ya nwaanyị na nwunye Klopas nakwa Meri nke Magdala kwụ n’akụkụ obe.
Mgbe Jesu hụrụ nne ya na nwaazụ nke ahụ Ọ hụrụ n’anya, ọ sịrị nne ya, “Nwaanyị, lee nwa gị!”
Ọ sịkwara onye ahụ na-eso ụzọ ya, “Lee nne gị!” Site n’oge ahụ, onye ahụ na-eso ụzọ ya kpọọrọ nne Jesu laa, ka o biri n’ụlọ ya.
MA Ọ BỤ
OZIỌMA – 2:33-35
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Ihe niile Simịọn kwuru gbasara nwatakịrị ahụ bụ Jesu tụrụ nne na nna ya n’anya.
Simịọn wee gọzie ha, gwa Marịa nne Jesu sị: “Lee e dobere nwatakịrị a maka ọdịda na mbili ọtụtụ mmadụ n’Izrel, na maka ihe ọmụmaatụ a ga-ekwutọ ekwutọ, (ma mmaagha ga-amawa gị obi) ka e were kpughee ihe dị ọtụtụ mmadụ n’obi.”
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.