Igbo Mass Readings for July 26 2024, Ncheta Joachim na Ann dị Asọ – Ndị mụrụ Vegin Marịa dị Ngọzi.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 26 2024, Ncheta Joachim na Ann dị Asọ – Ndị mụrụ Vegin Marịa dị Ngọzi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 44:1, 10-15
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Sịrak
Ugbu a, ka anyị toonụ ndị ahụ aha ha na-ada ụda, ndị nna anyị ha n’agbụrụ ha. Mana ndị a bụ ndị obiebere; ndị eziomume ha enweghị nchefu. Agamnihu ha nwere ga-esi n’aka ha fere n’aka ụmụụmụ ha.
Oke ha ga-esikwa n’ụmụ fere n’ụmụ. Ụmụ ha kwụsiri ike na ọgbụgbandụ ndị ahụ; n’ihina ụmụụmụ ha sokwara otu ụzọ ahụ. Mkpụrụ ha ga-adịrị gaba ebighịebi, otito ha adịghị nhichapụ.
E liela ha n’udo, mana aha ha na-adịrị ndụdụgandụ niile. Ndị mmadụ ga na-akọ maka amamihe ha. Ọgbakọ ha ga na-ekwupụta otito ha.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 132: 11, 13-14, 17-18.
Azịza: Onyenweanyị ga-enye ya alaeze Nna ya Devid.
1. Onyenweanyị ñụọrọ Devid iyi,
ọ ghaghị echegharị na ya,
“Otu n’ime ụmụ gị
ka m ga-akwụba n’ocheze gị. Azịza
2. N’ihina Onyenweanyị ahọrọla Zayọn,
ọ họrọla ya ka ọ bụrụ ebe obibi.
“Ebe a ka m ga-anọ ebeebe,
ebe a bụ ebe obibi m họọrọ. Azịza
3. N’ebe a, aga m akpọlite otu eze n’agbụrụ Devid,
aga m eme ka ọkụ nke onye m tere ude na-achawapụta ebeebe.
Aga m eji ihere kpuchie ndịiro ya ihu,
mana ọchịchị ya ga na-aga n’ihu. Azịza
MBEKU
ALLELUIA, ALLELUIA:
Ọ nọ na-elekwa anya maka nkasịobi nke Izrel, Mmụọ Nsọ nọnyekwaara ya.
ALLEUIA.
OZIỌMA – 13: 16-17.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Ngọzi dịịrị anya ụnụ, n’ihina ha na-ahụ ụzọ, na ntị ụnụ, n’ihina ha na-anụ ihe.
N’ezie agwa m ụnụ, ọtụtụ ndị amụma na ndị eziomume chọsiri ike ịhụ ihe ụnụ na-ahụ ma ha ahụghị ya, ịnụ ihe ụnụ na-anụ ma ha anụghị ya.
Igbo Mass Readings for July 27 2024, Satọde Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume
Igbo Mass Readings for July 26 2024, Ncheta Joachim na Ann dị Asọ – Ndị mụrụ Vegin Marịa dị Ngọzi.