Igbo Mass Readings for September 29 2023, Emume Ncheta Maịkel, Gebrel na Rafel (Ndị Archangel)

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 29 2023, Emume Maịkel, Gebrel na Rafel (Ndị Archangel – Ndịisi Ndị Mmụọoma)

Igbo Mass Readings for September 29 2023, Emume Maịkel, Gebrel na Rafel (Ndị Archangel)
Igbo Mass Readings for September 29 2023, Emume Maịkel, Gebrel na Rafel (Ndị Archangel)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:9-10, 13-14

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Onye Amụma Daniel

Ka m na ele anya ahụrụ m ka e doziri ocheeze, onye ahụ dịnụ site na mbụ weere oche ya, uwe ya na-acha ka akụmmiriigwe, ntụtụisi ya na-achakwa ka owu ọcha.

Ocheeze ya bụ ire ọkụ, ụkwụ ya bụkwa ọkụ na-enwu enwu. Nnukwu ire ọkụ si n’ebe ọ nọwee na-apụta, puku kwuru puku ndị mmụọoma nọ ya gburugburu ịmere ya ihe ọbụla ọ chọrọ.

Otu a kwa ka nde kwuru nde mmadụ siri kwụrụ ya n’ihu, na-eche ka o kpee ha ikpe. Ọ dịghị anya e bido ikpe ikpe wee meghee akwụkwọ ikpe.

Ahụkwara m na nrọ ahụ onye dịka nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’urukpu ojii. Ọ bịara n’ebe onye ahụ dị na mbụ nọ, e duga ya n’ihu ya.

E nyere ya ike ọchịchị na otito na alaeze, ka mmadụ niile, mba niile na asụsụ niile wee gbaara ya odibo. Ọchịchị ya enweghị njedebe, ọ gaghị agafe agafe nke a ga-emebi ya emebi.

MA Ọ BỤ

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 12;7-12

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Mkpughe

Mgbe ahụ, agha dara n’eluigwe: Maịkel na ndị mmụọọma ya lusọrọ anụ ndọgbu ahụ ọgụ, ebe anụ ndọgbu ahụ na ndị mmụọozi ya busoro ha agha.

Mana e meriri ha, nke mere na ha enweghịkwa ọnọdụ ọbụla n’eluigwe. A chụdara nnukwu anụ ndọgbu ahụ, agwọ ochie ahụ nke a na-akpọ Ekwensu mọbụ Setan onye nduhie nke ụwa.

A chụdara ya na ndị mmụọozi  ya na ụwa. Anụrụ m oke olu na-ada n’eluigwe sị, “Ugbu a nzọpụta na ike na alaeze nke Chineke anyị na ike ọchịchị nke Kristi ya abịala; n’ihina a chụdala onye nke na-ebo ụmụnna anyị ebubo ehihie na abalị n’ihu Chineke anyị.

Ụmụnna anyị emeriela ya site n’ọbara nke Nwaatụrụ ahụ, na site n’ikwupụta okwukwe ha.

Ha ahụghị ndụ ha n’anya, kama ha jikere inye ndụ ha ọbụla ruo n’ọnwụ. Ñụrịba ọñụ eluigwe na ụnụ ndị niile bị n’ime ya.

Ma ahụhụ ga-adịrị ụwa na oke osimiri, n’ihina Ekwensu ejirila iwe na ọnụma bịakwute ụnụ, maka na ọ ma na oge ya fọrọ nwantakịrị.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 138;1-2, 2-3, 4-5.

Azịza: N’ihu ndị mmụọozi niile aga m ekwere gị ukwe O Dinwenụ.

1. Eji m obi m niile na-ekele gị Onyenweanyị

N’ihina ị nụla ekpere m!

N’ihu ndị mmụọozi niile aga m ekwere gị ukwe;

Aga m akpọ isiala n’ụlọnsọ gị,

Nye gị ekele n’ihi ịhụnaanya na ịkwụdosiike gị. Azịza.

2. Aga m enye gị ekele n’ihi ịhụnanya na ịkwụdosiike gị.

N’ihina aha gị na nkwa gị kacha dị elu.

N’ụbọchị m kpọkuru gị, ị zara m

Mekwaa ka ike m bawanye. Azịza.

3. Onyenweanyị ndị eze niile nọ n’ụwa na-ekele gị,

N’ihina ha anụla banyere nkwa gị niile;

Ha na-ekwupụta aka ọrụ nke Onyenweanyị,

Otito nke Onyenweanyị dị ukwuu. Azịza.

MBEKU

Alleluịa, Alleluịa:

Gọzienụ Onyenweanyị, ndị agha ya niile, ụnụ ndịodibo ya, ndị na-eme uche ya.

Alleluịa.

OZIỌMA – 1:47-51

Ihe ọgụgụ e wetara na oziọma dị asọ nke Jọn dere:

Mgbe Jesu hụrụ Nataniel ka ọ na-abịakwute ya, o kwuru maka ya sị, “Lee ezigbo onye Izrel, onye aghụghọ ọbụla na-adịghị n’ime ya!”

Nataniel jụrụ ya sị, “O lee ebe Ị nọ mara m?” Jesu azaa ya sị, “Tupu Filip akpọọ gị mgbe ị nọ n’okpuru osisi Fiig, ahụrụ m gị.”

Nataniel zara ya sị, “Rabaị (onyenkuzi), Ị bụ nwa Chineke! ị bụkwa eze nke Izrel!” Jesu zara ya sị, “Ọ bụ n’ihina m gwara gị na m hụrụ gị n’okpuru osisi Fiig ka I ji kwere?

Ị ga-ahụ ihe ịtụnanya karịrị ndị a.” Ọ sịrị ya, “N’ezie, n’ezie, agwa m gị, Ị ga-ahụ eluigwe ka o meghere, hụkwa ndị Mmụọọma nke Chineke ka ha na-arigo na-arịdatakwa n’ahụ nwa nke mmadụ.

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for September 29 2023, Emume Maịkel, Gebrel na Rafel (Ndị Archangel)

Last Update: September 29, 2020