Igbo Mass Readings for August 14 2024, Ncheta Maximilian Kolbe dị Asọ – Poopu na Onye egburu maka Okwukwe.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 14 2024, Ncheta Maximilian Kolbe dị Asọ – Poopu na Onye egburu maka Okwukwe.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 18:1-10, 13, 30-32
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ onye Amụma Izikel
Okwu nke Yahweh wee bịakwute m ọzọ sị, Gịnị kpatara i ji na-atụ ilu a ugboro ugboro n’ala Izrel sị, Ndị Nna ataala mkpụrụ osisi na-achaghị acha, mọbụ ụmụ ha ka eze na-ejiji?”
Ka m na-adị ndụ, Ọ bụ Yahweh Chineke na-ekwu, agaghị atụkwa ilu a ọzọ n’ala Izrel. Lee mkpụrụobi niile bụ nke m, ma nke nna ma nke nwa, mkpụrụobi ọbụla mehierenụ ga-anwụ.
Onye ọbụla bụ onye eziomume, na-emekwa ihe ziri ezi na ihe dị mma. Ọ bụrụkwa na ọ naghị eri ihe n’elu ugwu mọbụ welite anya ya n’ebe arụsị niile nke Izrel dị, o merụghị nwunye onye agbata obi ya mọbụ gbakwuru nwaanyị mgbe ọ nọ n’oge ya;
ọ naghị emegbu onye ọbụla, kama ọ na-enyeghachi onye o ji ụgwọ ihe ya, ọ naghị apụnarị mmadụ ihe ya n’ike, ma ọ na-enye onye agụụ na-agụ nri ya, na-eyiwekwa onye gba ọtọ akwa,
ọ naghị agbazinye ego na ọmụrụnwa, mọbụ nara ụma, ọ na-ewepụ aka ya na mpụ, ọ na-ekpe ikpe ziri ezi n’etiti mmadụ na ibe ya, ọ na-aga ije n’ụkpụrụ m niile, ma kpachapụ anya na-idebe ihe niile m nyere n’iwu, onye dị otu a bụ onye eziomume, ọ ghaghị ịdị ndụ, Ọ bụ Yahweh Chineke na-ekwu.
Ma ọ bụrụ na ọ mụ tara nwa nke bụ onye ohi, onye na-akwafu ọbara, ọ na-agbazinye ego na ọmụrụnwa, na-anarakwa ụma, onye dị otu a, ọ ga-adị ndụ?
O meela ihe arụ niile ndị a; ọ ga-anwụrịrị, ọbara ya ga-adịkwa ya n’isi. Ya mere, aga m ekpe ụnụ ikpe, ụlọ Izrel, onye ọbụla dịka ụzọ ya si dị. Ọ bụ Yahweh Chineke na-ekwu.
Chegharịanụ, ma sinụ na mmehie ụnụ pụta, ka ajọomume ghara ịbụ ihe mbibi ụnụ. Tụfuonụ mmehie ụnụ niile nke ụnụ mere megide m: nwetaranụ onwe ụnụ obi ọhụrụ na mmụọ ọhụrụ.
Gịnị kpatara ụnụ ji chọọ ịnwụ, o ụlọ Izrel? N’ihina enweghị m mmasị n’ọnwụ onye ọbụla, Ọ bụ Yahweh Chineke na-ekwu; ya bụ, tụgharịanụ ka ụnụ dị ndụ.”
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 50: 12-13, 14-15, 18-19.
Azịza: Ka inye ekele gị bụrụ aja nke ị na-achụnyere Chineke
1. Ọ bụrụ na agụụ agụọ m,
agaghị m akọrọ ụnụ
n’ihina ụwa na ihe niile dị n’ime ya bụ nke m.
Ana m eri anụ oke ehi ka ana m añụ ọbara ewu? Azịza
2. Mba, ka inye ekele gị bụrụ aja nke ị na-achụnyere Chineke,
mejupụta iyi ị ñụụrụ onye kacha elu.
Mgbe ahụ ọ bụrụ na ị kpọọ m n’oge nsogbu, aga m azọpụta gị,
ma, ị ga-asọpụrụ m.” Azịza
3. Ụnụ na-emeta ndị ohi enyi,
na-anabatakwa ndị na-akwaiko.
Okwu ụnụ oge niile na-abụ okwu ọjọọ,
okwu na-esikwa ụnụ n’ọnụ apụta bụ okwu ụgha. Azịza
MBEKU
ALLELUIA, ALLELUIA:
Ọ na-akụpịacha ha isi, mee ka ụwa niile jupụta n’ozu, Ọ na-añụ mmiri si n’iyi ka ọ na-aga, nke mere na o nwere ike iwelite isi elu na mmeri.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 19:13-15.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Mgbe ahụ, ndị mmadụ kuteere Jesu ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka wee kpeere ha ekpere.
Ma ndị na-eso ụzọ ya baara ha mba. Jesu sịrị ha, “Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m, ụnụ egbochila ha, n’ihina alaeze eluigwe bụ nke ndị dị otu a.”
O bikwasara ha aka wee si n’ebe ahụ pụọ.
Igbo Mass Readings for August 15 2024, Emume Mbugoro N’Eluigwe nke Marịa dị Ngọzi
Igbo Mass Readings for August 14 2024, Ncheta Maximilian Kolbe dị Asọ – Poopu na Onye egburu maka Okwukwe.