Igbo Mass Readings for March 31 2024, Ụka Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for March 31 2024, Ụka Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 10:34, 37-43

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndị Ozi

Isi Okwu: Anyị na Ya rikọrọ ñụkọọkwaa mgbe O siri n’ọnwụ kulite.

Pita wee bido okwuchukwu ya sị, “Ugbu a ka m na-aghọta n’eziokwu, na Chineke abụghị Onye na-asọ mmadụ anya. Ụnụ ma maka ihe ukwu ahụ merenụ mgbe Jọn kwusasịrị mmirichukwu ya, nke akụkọ ya gazuru ala ndị Juu niile, bido na Galili.

Ụnụ ma maka Jesu Onye Nazaret, otu Chineke si wukwasị Ya Mmụọ Nsọ na ike. O jegharịrị, na-eme mma, na-agwọ ndị ọrịa na ndị niile ekwensu kere agbụ, n’ihi na Chineke nọnyeere Ya.

Anyị bụ ndị akaebe nke ihe niile a mere n’ala ndị Juu niile n’ime Jerusalem. Ha gburu Ya site n’ịkpọgide Ya n’obe. Ma Chineke mere ka O si n’ọnwụ bilie n’ụbọchị nke atọ, wee mee ka Ọ pụta ihe gosi mmadụ onwe Ya.

Ọ bụghị mmadụ niile ka O gosịrị onwe Ya, kama naanị anyị bụ ndị akaebe, ndị Chineke họpụtara na mbụ. Anyị soro Ya rikọọ nri, sorokwa Ya ñụkọọkwa ihe ọñụñụ, mgbe O bilitechara n’ọnwụ.

O nyekwara anyị iwu ka anyị kwusaara ọha mmadụ oziọma, ka anyị gbasikwaa akaebe ike na Jesu bụ Onye ahụ Chineke họpụtara ka ọ bụrụ onye ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe. Ndị amụma niile bukwara amụma maka Ya, na onye ọ bụla kweere na Ya enwetala mgbaghara njọ site n’aha Ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 117:1-2, 16-17, 22-23. Az. 24

Azịza: Taa bụ ụbọchị ahụ Onyenweanyị mere: ka anyị ñụrịanụ ọñụ, nwekwaa obi añụrị. Ma ọ bụ Aleluya.

1. Aleluya, nyenụ Onyenweanyị ekele n’ihi na Ọ dị mma.

Ịhụnanya Ya enweghị ngwụcha.

Ka ụmụ Izrel kwuo sị: “Ịhụnanya Ya enweghị ngwụcha. Azịza.

2. Ka ụmụ Izrel kwuo sị: Aka nri nke Dinwenụ emerigo;

Aka nri nke Dinwenụ kulitere m.

Agaghị m anwụ, kama aga m adị ndụ,

wee na-eto aka ọrụ Ya. Azịza.

3. Nkume nke ndị ọrụ ụlọ jụrụ ajụ abụrụgo ide ji ụlọ.

Dinwenụ mere nke a!

Ọ bụ ihe ịtụnanya n’ebe anyị nọ. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 3:1-4

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl dị asọ degaara ndị Kolosi

Isi Okwu: Ụnụ ga na-achọ ihe nke eluigwe, ebe Jesu nọ.

Ọ bụrụ na ụnụ so Kristi n’ọnwụ Ya, na-achọnụ ihe dị n’eluigwe, ebe Kristi nọ n’oche eze Ya, n’aka nri nke Chineke. Tụkwasịnụ uche ụnụ n’ihe dị n’eluigwe, ọ bụghị n’ihe dị n’elu ụwa.

N’ihi na ụnụ nwụrụ anwụ n’ebe mmehie dị. Ma e zoola ndụ ụnụ nke ọma n’ebe Kristi nọ, n’ime Chineke. Mgbe ọ bụla Kristi ga-apụta ihe, ụnụ ga-eso Ya chawapụta n’ebube.

Ma ọ bụ

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 5:6-8

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt

Isi Okwu: Wepụnụ ihe-iko-achịcha nke ochie. Bịa ghọọnụ ogbe achịcha ọhụrụ.

Ụnụ kwesịrị ịmata na, naanị ihe-iko-achịcha ntakịrị na-eko nnukwu akpa ntụ-ọka a gwọrọ agwọ. N’ihi ya, wụsienụ ihe-iko-achịcha nke ochie. Meenụ onwe ụnụ ogbe achịcha ọhụrụ, nke na-ekoghị eko.

Ọ bụ ihe ụnụ kwesịrị ịbụ. Kristi, Onye bụ Ngabiga anyị, aghọọla ihe e jiri chụọ aja. N’ihi ya, ka anyị meenụ mmemme a n’ejighị ihe-iko-achịcha nke ochie, nke bụ ime arụ na inwe obi ọjọọ. Kama ka anyị werenụ ogbe achịcha na-ekoghị eko, nke inwe obi dị ọcha na eziokwu mee emume nke a.

UKWE ỌMA

Ndị otu Kristi, toonụ Onye ahụ e ji chụ aja Ngabiga.

Toonụ Nwatụrụ gbapụtara igwe atụrụ Ya.

Kristi bụ Onye aka Ya dị ọcha, Onye doziri ihe dị n’agbata Chukwu Nna na ndị njọ.

Ọnwụ na ndụ gbara mgba, lụọ ọgụ dị egwu.

E gburu Eze nke ndụ; O wee bụrụ Eze na-achị anwụ anwụ.

Marịa, gwa anyị, gịnị ka ị hụrụ n’ụzọ?

Ahụrụ m ebube mbilite n’ọnwụ Kristi na okpokoro ili Ya.

Ndị Mmụọọma na-agba akaebe ya.

Akwa ozu na Ụlarị so agba akaebe.

Na nchekwube m bụ Kristi ebilitela n’ọnwụ.

O burula ụnụ ụzọ gawa Galili.

Eze meriri n’agha, meere anyị ebere.

MBEKU – 1 Kọr. 5:7-8

Aleluya, aleluya:

Kristi, Onye bụ Ngafere anyị aghọọla ihe e jiri chụ aja. Ka anyị meenụ mmemme a n’ime Onyenweanyị.

Aleluya.

OZIỌMA – 20:1-9

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị nsọ nke Jọn dere

Isi Okwu: Ọ ga-ebiliterịrị n’ọnwụ.

Ọ bụ n’isi ụtụtụ ụbọchị Ụka, mgbe chi na-abọbeghị, ka Meri onye Magdala bịarutere n’ili. Ọ hụrụ na e bupụla nkume ahụ e ji kpuchie ọnụ ili. Ọ gbaara ọsọ jekwuru Saịmọn Pita na Nwaazụ nke ọzọ ahụ Jesu hụrụ n’anya, wee sị ha: “Ha ebupụla Onyenweanyị n’ili.

Anyị amaghịkwa ebe ha tọgbọrọ Ya.” N’ihi ya, Pita na Nwaazụ nke ọzọ ahụ wee pụọ, gawa n’ili. Ha abụọ jiri ọsọ ga. Ma Nwaazụ nke ọzọ ahụ gbalahara Pita n’ọsọ, wee buru ya ụzọ, ruo n’ili.

O wee hulata, nyoo anya, hụ akwa ụlarị ahụ, ebe ọ ghasara n’ala, mana ọ banyeghị abanye. Saịmọn Pita, onye so ya n’azụ, wee bịaruo, banye n’ime ili ahụ; hụ akwa ụlarị ahụ ghasara n’ala.

Ọ hụkwara ịchafu nke e keburu n’isi Jesu. Ịchafu ahụ na akwa ụlarị ahụ aghasaghị n’otu ebe. Kama, a pịara ya apịa, debe ya iche n’ebe ọzọ. Nwaazụ nke ọzọ ahụ buru ụzọ bịaruo, wee banyekwuo n’ili ahụ.

Ọ hụrụ, bịakwa kwere. Mgbe a na-ekwu ihe a, ha aghọtabeghị ihe a kuziri n’Akwụkwọ Nsọ, na Jesu ga-esi n’ọnwụ bilite.

Igbo Mass Readings for April 1 2024, Mọnde n’ime Izuukwu nke Iista

Igbo Mass Readings for March 31 2024, Ụka Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi.

Last Update: April 5, 2023