Igbo Mass Readings for November 2 2024, Ncheta Mkpụrụobi ndị Niile Kwerenụ gara aga.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 2 2024, Ncheta Mkpụrụobi ndị Niile Kwerenụ gara aga.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 25:6-9

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Onyeamụma Aịzaya

N’elu ugwu nke a, Yahweh nke igwe ndịagha ga-akwadoro mba niile oke oriri nke nri kacha mma na mmanya kacha ụtọ. N’elu ugwu a, ọ ga-eyipụ mmadụ niile akwa mkpe ha yi n’ahụ, wepụkwa akwaozu e kpuchigidere mba niile.

Ọ ga-emebi ọnwụ kpam kpam, Osebụrụwa Chineke ga-ehichapụ anya mmiri n’ihu ọbụla, ọ ga-ewepụ ihere ndị nke ya n’ebe ọbụla n’ụwa, n’ihina Chineke ekwuola ya.

A ga-ekwu n’ụbọchị ahụ sị, “Lee nke a bụ Chineke anyị, onye anyị chekwubere ịzọpụta anyị. Ya bụ Osebụrụwa, onye anyị chekwubere na ya, ka anyị ñụrịanụ; ka anyị gorienụ n’ihina ọ zọpụtala anyị.

MỌBỤ

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 19:1, 23-27

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Job

Job zara sị: A sị nnọọ na e deturu okwu m ọ ga-adị m mma! Ma  a sị na e dere ya n’akwụkwọ! Ma a sị na e ji mkpịsị edide igwe, bie ya n’okwute ka ọ nọrọ ebeebe!

N’ihina amaara m na onye mgbapụta m dị ndụ, mana e mesịa ọ ga-eguzoro n’elu ụwa; ma mgbe e sichara otu a mebie akpụkpọahụ m mgbe ahụ aga m eji ọnọdụ ahụ hụ Chineke, Onye m ga-ahụ n’akụkụ m, ọ bụ ya ka anya m ga-ahụ, ọ bụghị onye ọzọ. Obi m na-ada mba n’ime m!

MỌBỤ

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:1-9

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Amamihe

Ma mkpụrụ obi ndị eziomume dị n’aka nke Chineke, o nweghị ahụhụ ọbụla ga-emetụ ha. N’anya ndị nzuzu, ha dịka ndị nwụrụ anwụ, ngafe nke ha dịka ahụhụ n’onwe ya.

Nhapụ ha hapụrụ anyị dịka ịla n’iyi, mana ha nọ n’udo. N’ezie, a bịa n’anya mmadụ, ha tara ahụhụ, ma olileanya ha jupụtara n’uju nke anwụ anwụ. A tara ha obere ahụhụ ma ha ga-anata nnukwu ụgwọ.

Chineke n’onwe ya anwaleela ha, were chọpụta na ha tosịrị ibinyere ya. Ọ ñụchaala ha dịka e si añụcha ọlaedo n’ọkụ, bịa nara ha dịka aja nsureọkụ. Mgbe oge nleta ha bịara, ha ga-achawapụta ka ihe, dịka ikerike ọkụ si adapụta n’ukwu ọkụ.

Ha ga-achị mba niile na mmadụ niile, Yahweh ga-abụ eze ha ebighịebi. Ndị ahụ chekwubere na ya, ga-agọta eziokwu, ndị kwụdosiri ike ga-ebinyere ya n’ịhụnaanya, n’ihina amara na ebere na-eche ndị ahụ ọ họọrọ, ọ na-echekwa ndị nke ya niile.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 27:1, 4, 7-9, 13-14

Azịza: Dinwenụ bụ ihe m na nzọpụta m

1. Dinwenụ bụ ihe na nzọpụta m,

onye ka m ga-atụ egwu?

Dinwenụ bụ ide nke ndụ m,

onye ga-eyi m egwu! Azịza

2. Otu ihe ka m na-arịọ Dinwenụ,

otu ihe ka m na-achọ.

Ka m biri n’ụlọ nke Dinwenụ,

ụbọchị niile nke ndụ m.

ka m nweta ịdị ụtọ nke Dinwenụ,

ka m na-ahụ ya n’ụlọnsọ ya. Azịza

3. Onyenweanyị, nụrụ mkpu akwa m,

meere m ebere! zaa m!

Chọba ihu nke Onyenweanyị.

Onyenweanyị, ana m achọ ihu gị,

Ezonarịla m ihu gị. Azịza

4. Ekwere m na m ga-ahụ ịdị mma nke Chineke,

n’ala ndị dị ndụ

Chekwube na Dinwenụ. Obi sie gị ike

tụkwasị ya obi, chekwube na ya. Azịza

MỌBỤ

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 23: 1-3, 3-4, 5, 6.

Azịza: Chineke bụ onye nche m o nweghị ihe m ga-achọ.

1. Chineke bụ onye nche m o nweghị ihe m ga-acho.

Ọ na-eme ka m zuru ike ebe ahịhịa ndụ dị,

Ọ na-eduga m na mmiri

Ebe ahụ ka Ọ na-enye m ike. Azịza

2. Ọ na-edu m n’ụzọ eziomume;

n’ihi aha ya,

Ọ bụrụgodụ na m na-aga na ndagwurugwu nke ọnwụ,

egwu ọbụla agaghị atụ m,

I ji mkpara na ngu gị nọdebe m

Ọ bụ ha na-enye m agbamume. Azịza

3. Ị na-akwadoro m nri, n’ihu ndịiro m.

I teela isi m mmanụ,

iko m ejula n’ọnụ na-agbọfu. Azịza

4. N’ezie, obiọma na ebere ga na-eso m,

ụbọchị ndụ m nule.

Aga m ebi n’ụlọ nke Chineke

ebeebe ebeebe! Azịza

MỌBỤ

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 63: 2-3, 3-4, 5-6, 8-9

Azịza (V. 2): Onyenweanyị Chineke m, akpịrị na-akpọ mkpụrụ obi m nkụ maka gị

1. O Chineke, ị bụ Chineke m, ana m achọ gị

akpịrị na-akpọ mkpụrụ obi m nkụ maka gị,

anụahụ m na-achọ gị

dịka ala kpọrọ nkụ na-enweghị mmiri. Azịza

2. Ọ na-agụ m agụụ ikiri gị n’ebensọ gị

Na ịhụ ike na otito gị

Ịhụnaanya gị ka mma karịa ndụ n’onwe ya

Ọnụ m ga-ekwupụta otito gị. Azịza

3. Aga m eto gị na ndụ m niile

Aga m achili aka m elu, wee kpọkuo aha gị

Mkpụrụobi m ga-enwe afọ ojuju dịka n’oge oriri

Egwu ọñụ ga-adị n’egbugbere ọnụ m, iji too gị. Azịza

4. N’ihi Ị na-enyere m aka oge niile

Ana m ekwe ukwe ọñụ n’okpuru nku gị

Mkpụrụobi m na-atapara na gị

Aka nri gị na-akwado m. Azịza

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 5:5-11

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi Pọl degaara ndị Rom

Nchekwube ahụ adịghịkwa aghọ anyị ahịa. N’ihina Chineke awụnyela ịhụnaanya ya n’ime obi anyị site n’onyinye nke Mmụọ Nsọ. N’ihina mgbe anyị nọ n’enweghị ike imere onwe anyị ihe ọbụla, mgbe oge Chineke kara ruru, Kristi nwụrụ n’ihi ndị amaghị Chineke.

Ọ bụ ihe siri ike otu onye ịnwụ n’ihi otu onye eziomume. Eleghị anya, mmadụ nwere ike ịnwụrụ onye eziomume. Ma Chineke mere ka ịhụnaanya ya n’ebe anyị nọ pụta ihe.

N’ihina mgbe anyị ka bụ ndị njọ, Kristi nwụrụ maka anyị. Ya bụ, ebe a gụrụla anyị na ndị eziomume ugbu a, site n’ọbara ya, o were anya na a ga-azọpụta anyị karịa n’iwe Chineke, site n’aka ya.

Ọ bụrụ na e meziri agbata anyị na Chineke site n’ọnwụ Nwa ya, mgbe anyị ka bụ ndịiro ya, ugbu a anyị na ya dịzi na mma, anyị ga-enweta nzọpụta site na ndụ ya. Ma ọ bụghị naanị nke a: anyị na-añụrịkwa ọñụ n’ime Chineke site n’Onyenweanyị Jesu Kristi, onye mere ka anyị na Chineke dị na mma ugbu a.

MỌBỤ

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 15:51-57

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt

Geenụ ntị, ka m kpugheere ụnụ ihe omimi! Ọ bụghị anyị niile ga-anwụ ọnwụ. Ma a ga-agbanwe anyị niile, n’otu mgbe, n’otu ntabi anya, mgbe a ga-afụ opi ike ikpeazụ.

Mgbe opi dara, Chineke ga-eme ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie n’ereghị ure. A ga-agbanwekwa anyị. N’oge ahụ, ahụ anyị nke pụrụ ire ure ga-eyikwasị ereghị ure, ahụ anyị nke pụrụ ịnwụ anwụ ga-eyikwasịkwa anwụghị anwụ, mgbe ahụ okwu ahụ e dere n’akwụkwọ nsọ ga-emezu sị, “Eloola ọnwụ na mmeri” Ọnwụ! olee ebe mmeri gị dị? Ọnwụ! olee ebe ihe ụfụ gị dị?

Ihe ọgbụgba nke ọnwụ bụ mmehie. Ihe na-enye mmehie ike bụ iwu Ma ekele dịrị Chineke onye na-enye anyị mmeri site n’Onyenweanyị Jesu Kristi.

MỌBỤ

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 6:3-9

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl Degaara Ndị Rom

Ọ bụ na ụnụ amaghị na anyị niile bụ ndị e mere mmirichukwu n’ime Kristi eketala oke n’ọnwụ ya? Mgbe e mere anyị mmirichukwu, e likọtara anyị na ya ka anyị wee sonye n’ọnwụ ya, ka ọ ga-abụ otu ahụ Chineke Nna ji si n’ike ya dị ebube mee ka Kristi si n’ọnwụ bilie, anyị onwe anyị ga-esi otu ahụ malite ibi ndụ ọhụrụ n’ime Kristi.

Ọ bụrụ na anyị na Kristi abụrụla otu site n’ịnwụ ụdị ọnwụ ọ nwụrụ, anyị na ya ga-abụkwa otu site n’ibili n’ọnwụ otu o si bilie. Anyị makwaara na a kpọgidekọtara ndụ ochie anyị na Kristi n’elu obe ka e wee mebie ahụ anyị nke jupụtara na njọ, ka anyị gharakwa ịbụ ohu nke njọ ọzọ.

N’ihina onye nwụrụ anwụ apụghị ime njọ ọzọ. Ọ bụrụ na anyị soro Kristi nwụọ n’ọnwụ ya, anyị nwere okwukwe na anyị na ya ga-adịkọ ndụ ọzọ, ebe Chineke mere ka Kristi si n’ọnwụ bilie, Ọ gaghị anwụkwa ọzọ, ọnwụ enweghịkwa ike ọzọ n’ebe ọ nọ.

MBEKU – Jọn 6:39

Alleluia, Alleluia:

Nke a bụ uche nke onye zitere m, ka m ghara ịtụfu ihe ọbụla n’ime ihe niile o nyere m, kama ka m mee ka ha si n’ọnwụ bilie n’ụbọchị ikpeazụ.

Alleluia

MỌBỤ

MBEKU

ALLELUIA, ALLELUIA:

Bịanụ ụnụ ndị dị ngọzi nke Nna m, bịanụ ka ụnụ were alaeze nke a kwadobere ụnụ site na mbido nke ụwa.

ALLELUIA.

MỌBỤ

MBEKU – Matiu 11:25

Alleluịa Alleluịa:

Ana m ekele gị Nna Dinwenụ nke eluigwe na ụwa, n’ihina I kpugheere ụmụntakịrị ihe ndị a I zonahụrụ ndị amamihe na ndị okemmụta.

Alleluịa

OZIỌMA – 7:11-17

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Ka nwa oge gachara, Jesu gara n’otu obodo a na-akpọ Nain, ndị na-eso ụzọ ya, igwe mmadụ sokwa ya. Ma ka ọ na-abịaru n’ọnụụzọ ama nke obodo ahụ, e nwere otu nwoke nwụrụlarịị nke a na-ebupụ, otu nwa nke nne ya mụrụ; nne ya ahụ bụ nwaanyị ajadu, oke igwe mmadụ si n’obodo ahụ sonyekwara nwaanyị ahụ.

Mgbe Onyenweanyị hụrụ ya, O meere ya ebere wee sị ya, Ebela akwa. Ya bịaruo nso, metụ igbe ozu ahụ aka, ndị bu ozu ahụ wee guzo, Jesu wee sị, Nwaokorobịa!

Ana m asị gị, Bilie!” Nwaokorobịa ahụ nwụrụ anwụ nọlitere, ma bidokwa ikwu okwu; Jesu kpọọrọ ya nye nne ya. Ụjọ jidere ha niile; nke mere ha ji too Chineke na-asị, Nnukwu onye amụma ebilitela n’etiti anyị!”

Ọzọ, “Chineke abịala ileta ndị nke ya!” Akụkọ a gbasara Jesu gazuru n’ala Judia na obodo niile gbara ya gburugburu.

MỌBỤ

OZIỌMA – 6: 37-40

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

Jesu gwara igwe mmadụ ahụ sị, “Onye ọbụla Nna m na-enye m, ga-abịakwute m. Agaghị m achụpụkwa onye ọbụla nke na-abịakwute m. N’ihina esighị m n’eluigwe bịa ime uche m, kama ọ bụ ime uche onye zitere m.

Nke a bụ uche nke onye zitere m, ka m ghara ịtụfu ihe ọbụla n’ime ihe niile o nyere m, kama ka m mee ka ha si n’ọnwụ bilie n’ụbọchị ikpeazụ. Nke a bụ uche nke Nna m: ka onye ọbụla hụrụ Nwa ahụ ma kwerekwa na ya, nwee ndụ ebeebe. Aga m akpọlitekwa ya n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.”

MỌBỤ

OZIỌMA – 6:37-40

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

Jesu gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị, “Onye ọbụla Nna m na-enye m, ga-abịakwute m. Agaghị m achụpụkwa onye ọbụla nke na-abịakwute m. N’ihina esighị m n’eluigwe bịa ime uche m, kama ọ bụ ime uche onye zitere m.

Nke a bụ uche nke onye zitere m, ka m ghara ịtụfu ihe ọbụla n’ime ihe niile o nyere m, kama ka m mee ka ha si n’ọnwụ bilie n’ụbọchị ikpeazụ. Nke a bụ uche nke Nna m: ka onye ọbụla hụrụ Nwa ahụ ma kwerekwa na ya, nwee ndụ ebeebe. Aga m akpọlitekwa ya n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.”

Igbo Mass readings for November 3 2024, Ụka nke Iri Atọ na otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ

Igbo Mass Readings for November 2 2024, Ncheta Mkpụrụobi ndị Niile Kwerenụ gara aga.

Last Update: December 10, 2022