Igbo Mass Readings for October 2 2024, Ncheta Ndị Mmụọọma Ndị Nche.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 2 2024, Ncheta Ndị Mmụọọma Ndị Nche.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 23:20-23

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ọpụpụ

“Lee ana m ezite Mmụọọma nke ga-edu ụnụ ruo n’ala ahụ m kwadooro ụnụ. Geenụ ya ntị n’olu, ụnụ enupụkwarala ya isi n’ihina ọ gaghịkwa agbaghara mmehie ụnụ ọbụla, aha m nọkwa ya n’ime.

Ma ọbụrụ na ụnụ egee ya ntị n’olu, ma meekwa ihe niile m kwuru, aga m abụ onye iro nke ndịiro ụnụ ma megidekwa ndị niile na-emegide ụnụ.

Mgbe Mmụọọma m ahụ ga-edurute ụnụ n’etiti ndị Amọ, na ndị Hit, ndị Periz, ndị Kenaan, ndị Hiv na ndị Jebus, aga m ekpochapụ obodo ha niile.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 91: 1-2, 3-4, 5-6, 10-11.

Azịza: Ọ ga-enye ndị mmụọọma ya iwu ka ha nọnyere gị, ka ha na-echekwa gị ebe niile Ị na-aga.

1. Onye bi na ndo nke onye kasị elu,

onye nọgidesiri ike na nchedo nke onye ji ike niile,

ga-asị Onyenweanyị, “Ị bụ onye nchedo m na ike m,

Chineke m, onye m tụkwasara obi!” Azịza

2. Ọ ga-azọpụta gị na ọnya niile nke ndịiro,

na ajọ ọrịa niile.

Ọ ga-eji nku ya kpuchie gị,

Ọ bụ na okpuru nku ya ka ị ga-enweta nchodo. Azịza

3. Ị gaghị atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla nke abali

mọbụ akụ ndị na-efe n’ehihie,

mọbụ ajọ ọrịa ndị na-ezo n’ọchịchịrị,

mọbụ ihe mberede na-egbu n’ehihie. Azịza

4. Ma onweghị ajọ ihe ọbụla ga-adakwasị gị,

o nweghịkwa ihe ọjọọ ọbụla ga-abịaru ụlọ gị nso.

N’ihina ọ ga-enye ndị mmụọọma ya iwu ka ha nọnyere gị,

ka ha na-echekwa gị ebe niile Ị na-aga. Azịza

MBEKU

ALLELUIA, ALLELUIA:

Gọzienụ Onyenweanyị, ndị agha ya niile, ụnụ ndị odibo ya, ndị na-eme uche ya.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 18: 1-5, 10.

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

N’oge ahụ ndị na-eso ụzọ Jesu bịakwutere ya jụọ ya sị, “Olee onye kachasị ibe ya ukwuu n’alaeze eluigwe?” O wee kpọrọ otu nwatakịrị kwụba ya ọtọ n’etiti ha sị, “N’ezie agwa m ụnụ, ọ bụrụ na ụnụ agbanweghị dịka ụmụntakịrị, ụnụ agaghị aba n’alaeze eluigwe.

Onye ọbụla nke wedara onwe ya ala dịka nwantakịrị a, ọ bụ ya kachasị ukwu n’alaeze eluigwe. “Onye ọbụla nke ga-anabata nwatakịrị dị otu a nke ọma n’aha m, anabatala m.”

Lezienụ anya ka ụnụ ghara ilelị otu n’ime ụmụaka ndị a. N’ihina ana m agwa ụnụ na ndị mmụọọma ha nọ n’eluigwe na-ahụ ihu Nna m nke bi n’eluigwe oge niile.”

Igbo Mass Readings for October 3 2024, Ncheta Therese nke Oberenwa Jesu dị Asọ

Igbo Mass Readings for October 2 2024, Ncheta Ndị Mmụọọma Ndị Nche

Last Update: December 10, 2022