Igbo Mass Readings for October 7 2024, Ncheta Nne anyị dị Asọ, Ezenwaanyị nke Rosarị.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 7 2024, Ncheta Nne anyị dị Asọ, Ezenwaanyị nke Rosarị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:12-14

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndịozi

Mgbe ahụ ndịozi iri na otu ahụ siri n’ugwu a na-akpọ Olivet dị Jerusalem nso laghachi Jerusalem ihe dịka njem otu ụbọchị izuike. Mgbe ha batara Jerusalem, ha rịgooro n’ime ụlọ ahụ dị n’ụlọ elu, ebe ha nọbu.

Ndị ozi ndị a bụ Pita, Jọn, Jemis, Andru, Filip, Tọmọs, Batolomi na Matiu, Jemis nwa Alfeus, Saịmọn nke Zilọt na Judas nwa Jemis. Ndị a niile ji otu obi nọgidesie ike n’ekpere, ha na ụmụnwaanyị ụfọdụ na Meri nne Jesu na ụmụnne ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Lk:1:46-47, 48,49-50, 51-52, 53-54, 55-56.

Azịza: Onye dị ike emeerela m nnukwu ihe, aha ya dị nsọ.

1. Mkpụrụ obi m na-eto Dinwenụ m

Mmụọ m na-añụrị na Chukwu onye nzọpụta m. Azịza

2. Maka na o leele anya n’umeala odibo nwaanyị ya,

site taata ndụdụgandụ nile ga na-akpọ m onye dị ngọzi.

Maka na onye dị ike emeerela m nnukwu ihe,

aha ya dị nsọ. Azịza

3. Obi ebere ya si na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ

maka ndị na-atụrụ ya egwu.               

O gosila ike aka ya,

ọ chụsachaala ndị nganga dị n’obi. Azịza

4. O sila n’ocheeze budaa ndị ukwu,

bulie ndị umeala.

O nyejuola ndị agụụ na-agụ afọ

hapụ ndị ọgaranya ka ha gbara aka laa. Azịza

5. O nyerela Izrel nodibo ya aka,

na ncheta ebere ya.

Dịka o si gwa nna anyị Abraham

na mkpụrụ ya ebeebe. Azịza

MBEKU

ALLELUIA, ALLELUIA:

Jesu sịrị ya, “Mụ onwe m bụ ụzọ, eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye ọbụla ga-abịakwute Nna ma ọ bụghị site na m.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 1:26-38.

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

N’ọnwa nke isii, Chineke zigara Mmụọọma Gebrel ka ọ gaa n’obodo Galili a na-akpọ Nazaret; ka ọ gakwuru otu nwaagbọghọ na amaghị nwoke, onye ikwunibe ya kwekọrịtara na otu nwoke aha ya bụ Josef, nke si n’agbụrụ Devid ga-alụ.

Aha nwaagbọgbọ ahụ bụ Marịa. Mmụọọma ahụ bịakwute Marịa sị ya, “Ekele, I jupụtara na grasịa, Osebụrụwa nọnyere gị!” Obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu n’ụdị ekele a, nke mere na ọ malitere ịtụle n’uche ya ihe ụdị ekele a pụtara.

Mmụọọma ahụ sịrị ya, “Atụla egwu, Marịa, n’ihina Ị natala ngọzi n’aka Chineke. Lee Ị ga-adị ime, mụta nwa nwoke; aha Ị ga-akpọ ya bụ Jesu. Ọ ga-adị ukwuu, a ga-akpọkwa ya nwa onye kacha elu.

Dinwenụ Chineke ga-enye ya ocheeze nna ya Devid. Ọ ga-achị ezinụụlọ Jekọb ebeebe; alaeze ya agaghị enwe ọgwụgwụ.” Marịa jụrụ Mmụọọma ahụ sị, “Olee otu nke a ga-esi mee ebe ọ bụ amaghị m nwoke.”

Ma Mmụọọma ahụ zara ya sị, “Mmụọ Nsọ ga-abịakwasa gị; ike nke onye kacha elu ga-ekpuchi gị. N’ihi nke a, a ga-akpọ nwa ahụ Ị ga-amụ, Onye nsọ, nwa Chineke.

Lee, Elizabet onye ikwu gị, onye ndị mmadụ na-akpọ nwaanyị aga, atụrụla ime n’agadị ya; ugbu a ọ dị ime ọnwa isii. N’ihina ebe Chineke nọ, o nweghị ihe nyịrị omume.”

Marịa kwuru sị, “Lee, abụ m odibo nwaanyị nke Osebụrụwa, ka o reere m ka i siri kwu.” Mmụọọma ahụ wee si n’ebe ọ nọ pụọ.

Igbo Mass Readings for October 8 2024, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings for October 7 2024, Ncheta Nne anyị dị Asọ, Ezenwaanyị nke Rosarị.

Last Update: December 10, 2022