Igbo Mass Readings for June 8 2024, Ncheta Obi Marịa na-ebughị Atụtụ Njọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 8 2024, Ncheta Obi Marịa na-ebughị Atụtụ Njọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 61:9-11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ onye Amụma Aịzaya
A ga-amara agbụrụ ha na mba niile, mara ndị niile si n’etiti ha pụta n’ọgbọ mmadụ niile. Onye ọbụla hụrụ ha ga-ekwupụta na ha bụ ndị nke Chineke a gọziri agọzi.
Aga m enwe nnukwu ọñụ n’ime Osebụrụwa, mkpụrụobi m ga-añụrị na Chineke m, n’ihina o yiwela m uwe nke nzọpụta, were uwe eziomume kpuchie m ahụ, dịka otu nwaokorobịa na-alụ nwaanyị siri eji ihe olu dị mma ejikwa onwe ya, nakwa otu nwaagbọghọ a na-alụ alụ siri ejiri ọla e ji achọ mma ejikwa onwe ya.
Dịka otu ala siri epupụta ahịhịa, dịka otu ala ubi siri eme ihe a kọrọ na ya ka o pupụta, otu ahụ ka Osebụrụwa Chineke ga-esi eme ka ikpe nkwụmọtọ na otito pụta ihe n’ihu mba niile.
ABỤỌMA NA AZỊZA – 1 Sam 2: 1, 4-5, 6-7, 8.
Azịza: Mkpụrụobi m na-eto Dinwenụ m, Mmụọ m na-añụrị na Chukwu onye nzọpụta m.
1. Obi m na-añụrị ọñụ nke ukwuu n’Osebụrụwa.
N’ihina o meela ka ike m dị elu!
Ugbu a ka m nwere ọnụ ịgwa ndịiro m okwu,
n’ihina ana m añụrị na nzọpụta ya. Azịza
2. A nyajiela ụta ndị bụ dike,
Ma e yiwela ndị adịghị ike ike, dịka ajị,
Ndị na-eriju afọ na mbụ, na-ejezi ọrụ ngo maka ihe oriri.
Ma ndị agụụ na-agụ na-eriju afọ ugbu a
Nwaanyị aga amụtala ụmụ asaa
ebe nwaanyị ahụ mụjuru ụlọ gbazi aka nwa. Azịza
3. Yahweh na-eweta ọnwụ, na-eweta ndụ,
Ọ na-ezida ndị mmadụ n’ala mmụọ, na-akpọlitekwa ha.
Yahweh na-eme ka ụfọdụ daa ogbenye,
na-emekwa ka ụfọdụ bụrụ ọgaranya.
Ụfọdụ ka ọ na-ebuda ala,
ụfọdụ ka ọ na-ebulikwa elu. Azịza
4. Ọ na esi na ntụ ekulite ndị ogbenye
Ọ na-esi na ebe a na-ekpofu ahịhịa welite ndị nọ na mkpa.
Nye ha ọnọdụ n’etiti ụmụ ndịeze,
iji nye ha ugwu na nsọpụrụ
N’ihina ntọala ụwa niile bụ nke Yahweh,
N’elu ha ka ọ kwụwara ụwa. Azịza
MBEKU
ALLELUIA, ALLELUIA:
O soro ha laghachị na Nazaret, na-erubekwara ha isi, nne ya dobere okwu ndị a niile n’obi ya.
ALLEUIA.
OZIỌMA – 2:41-51.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Kwa afọ nne na nna Jesu na-aga Jerusalem n’oge emume ngabiga. Mgbe Jesu gbara afọ iri na abụọ, ya na nne ya na nna ya soro gaa dịka omenala siri dị; oge e mechara emume ahụ, ka ha na-alaghachi, nwata ahụ bụ Jesu nọdụrụ na Jerusalem.
Nne na nna ya amataghị, Ha chere na ọ sonyere n’etiti ndị mmadụ. Ha gara ije otu ụbọchị tupu ha bido chọba ya na etiti ndị ikwu na ibe ha na ndị ha maara.
Mgbe ha na achọtaghị ya, ha laghachiri azụ na Jerusalem na-achọgharị ya. Mgbe ụbọchị atọ gachara, ha hụrụ ya n’ime ụlọnsọ Chineke, ka ọ nọ n’etiti ndị nkuzi na-ege ha ntị na-ajụkwa ha ajụjụ.
Nghọta na ọgụgụ isi o ji aza ajụjụ tụrụ ndị niile nụrụ okwu ya n’anya. Mgbe nne na nna ya hụrụ ya, ọ tụrụ ha n’anya. Nne ya wee sị ya, “Nwa m, gịnị mere I ji mee mụ na nna gị otu a?
Lee, mụ na nna gị na-achọgharị gị kamgbe.” Ma ọ zara ha sị, “Gịnị ka ụnụ na-achọgharịrị m, ọ bụ na ụnụ amaghị na aga m anọrịrị n’ụlọ nna m.” Ha aghọtaghị okwu ọ gwara ha. O soro ha laghachi na Nazaret, na-erubekwara ha isi, nne ya dobere okwu ndị a niile n’obi ya.
Igbo Mass Readings for June 9 2024, Ụka nke Iri n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ
Igbo Mass Readings for June 8 2024, Ncheta Obi Marịa na-ebughị Atụtụ Njọ.