Igbo Mass Readings for August 29 2023, Ncheta Ogbugbu Egburu Jọn Ome Mmmirichukwu.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 29 2023, Ncheta Ogbugbu Egburu Jọn Ome Mmmirichukwu.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:17-19
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Jeremaya
Ngwa kee ajị gị na ume; bilie gwa ha ihe niile m gwara gị kwuo. Atụla ha ụjọ ka m gharakwa itinye ụjọ n’ime gị n’ihu ha.
Ma lee, emeela m gị n’ụbọchị taa ka ị bụrụ obodo ukwu bụ akwaa akwụrụ, ide igwe na mgbidi ọlaọkụ imegide ala niile, megidekwa ndị eze niile nke Juda, megidekwa ndịisi ya niile, ndị nchụaja ya niile, nakwa mmadụ niile nke ala ahụ.
Ha ga-ebusokwa gị agha; ma ha apụghị imeri gị; anọnyeere m gị, iji zọpụta gị. Yahweh kwuru nke a.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 71: 1-2, 3-4, 5-6, 15, 17.
Azịza: Aga m ekwupụta nzọpụta gị.
1. Na gị, Onyenweanyị ka m gbabara,
ekwela ka ihere mee m.
N’eziomume gị gbapụta m, zọpụta m
gee m ntị ma zọpụta m! Azịza
2. Bụrụ okwute nke mgbaba m,
mgbidi aja nke ga-azọpụta m!
n’ihina ị bụ okwute m, nchedo m.
Chineke m, zọpụta m n’aka ndị ajọ mmadụ,
n’ọnya nke ndịiro na nke ndị ọchịchị aka ike! Azịza
3. N’ihina sọ gị, Onyenweanyị bụ nchekwube m,
Onyenweanyị, echekwubere m na gị bido na mgbe m dị n’okorobịa,
atụkwasara m gị obi bido na mgbe a mụrụ m,
Ị bụrịị oke nke m site n’afọ nne m,
ọ bụ gị ka m na-eto mgbe niile. Azịza
4. Ọnụ m ga-ekwupụta eziomume gị
na ike nke nzọpụta gị ụbọchị niile,
O Chineke, Ị kuziri m bido na nwata m,
aga m na-ekwupụta ọrụ ebube gị. Azịza
MBEKU
ALLELUIA, ALLELUIA:
Ngọzi na-adịrị ndị niile a na-emegbu n’ihi eziomume, n’ihina alaeze eluigwe bụ nke ha.
ALLELUIA
OZIỌMA – 6: 17-29.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Ọ bụ Herọd nyere iwu ka ejide Jọn tinye ya n’ụlọmkpọrọ maka ihi Herọdịas nwunye nwanne ya nwoke Filip, onye ọ kpọọrọ dịka nwunye. Jọn gwara Herọd sị, “O zighị ezi n’iwu na Ị ga-alụ nwunye nwanne gị.”
Nke a mere Herọdịas ji buuru Jọn iwe n’obi na-achọ ụzọ ọ ga-esi gbuo ya. Ma o nweghị ike, n’ihina Herọd na-atụ Jọn egwu. Ọ maara na Jọn bụ ezigbo mmadụ na onye dị nsọ.
N’ihi nke a o chekwabara ndụ ya. Ọ bụ ezie na obi adịghị eru Herọd ala mgbe ọbụla ya na Jọn kparịtara ụka, ma ọ na-atọkwa Herọd ụtọ ige ntị n’ihe Jọn na-ekwu.
E mechaa ohere adapụtara Herọdịas. N’ụbọchị ncheta ọmụmụ Herọd, ọ kpọrọ oriri. Ọ kpọrọ ndị a maara aha ha n’obi eze, na ndị ọchịagha ya, na ndị mmadụ a ma ama na Galili ka ha bịa n’oriri ahụ.
N’oge ahụ, ada Herọdịas gbara egwu, mere ka obi tọọ Herọd na ndị ọ kpọrọ oriri ụtọ. Nke a mere ka eze Herọd gwa nwaagbọghọ ahụ sị, “Rịọ m ihe ọbụla ị chọrọ, aga m enye gị ya.”
Ọñụkwara iyi maka nke a sị, “Ihe ọbụla ị rịọrọ m, aga m enye gị ya, ọ bụladị ọkara alaeze m.” Nwaagbọghọ ahụ gara jụọ nne ya, sị, “Gịnị ka m ga-arịọ?”
Nne ya sịrị ya, “Rịọ ka e nye gị isi Jọn onye na-eme mmirichukwu.” O wee gbaa ọsọ ngwangwa, bịakwute eze Herọd rịọ ya, sị, “Achọrọ m ka i nye m n’efere ugbu a ugbu a, isi Jọn onye na-eme mmirichukwu.”
Nke a wutere eze Herọd nke ukwuu, ma n’ihi iyi ọ ñụrụ n’ihu ndị ọbịa ya, ọ chọghị imebi okwu ya. Ngwangwa eze Herọd zipụrụ otu onye agha nọ na nche, nyekwa ya ike ka o gbute isi Jọn onye na-eme mmirichukwu.
Onyeagha ahụ gara n’ụlọ mkpọrọ, bepụ Jọn isi, bute ya n’efere, bunye ya nwagbọgbọ ahụ. Nwagbọghọ ahụ bunyere ya nne ya. Mgbe ndị na-eso ụzọ Jọn nụrụ maka ọnwụ ya, ha bịara buru ozu ya lie ya n’ili.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.