Igbo Mass Readings for March 28 2024, Ncheta Oriri Ikpeazụ (Tọọzde)

Nke a bụ Igbo Mass Readings for March 28 2024, Ncheta Oriri Ikpeazụ (Tọọzde).

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 12:1-8. 11-14

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ọpụpụ

Isi Okwu: lhe a ga-eme n’Oriri Ngabiga.

Chineke gwara Mosis na Erọn n’ala Ijipt sị ha: “Ọnwa nke a ga-abụrụ ụnụ ọnwa kachasị ibe ya, ọnwa mbụ n’afọ ụnụ. Gwanụ ọgbakọ ndị Izrel niile sị ha: ‘N’ụbọchị nke iri n’ọnwa nke a, onye ọ bụla ga-esi n’igwe atụrụ ya họpụta otu anụ maka otu ezi na ụlọ.

Ọ bụrụ na ndị bi n’otu ezi na ụlọ dị nta nke na ha agaghị ericha otu anụ, ha ga-esonyere ezi na ụlọ ndị agbata obi kara dị ha nso, dịka ọnụ ọgụgụ mmadụ siri dị. Ụnụ ga-amata nke ọma ihe onye ọ bụla pụrụ iri, ka e were mara otu ọnụ ọgụgụ ga-aha.

Ọ ga-abụ anụ na-ebughị ọrụ, bụrkwa oke anụ, dị otu afọ. O nwere ike ịbụ atụrụ ma ọ bụ ewu. Ụnụ ga-ahapụ ya ruo n’ụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa a, oge ọgbakọ ndị Izrel ga-egbu ya tupu uhuruchi.

A ga-ewere ọbara ya tee na akụkụ ibo ọnụ ụzọ abụọ na n’elu ọnụ ụzọ nke ụlọ a ga-anọ rie oriri ahụ. N’anyasị ahụ ka a ga-eji ahịhịa na-elu ilu na achịcha na-ekoghị eko rie anụ ahụ a hụrụ n’ọkụ.

Otu a ka ụnụ ga-esi eri ya: ụnụ ga-eke eriri n’ukwu, gbara akpụkpọ ụkwụ n’ụkwụ, jide mkpara n’aka. Ụnụ ga-eri ya ọsọ ọsọ: N’ihi na ọ bụ Ngabiga nke Onyenweanyị.

Aga M agafe n’ala ljipt n’abalị ahụ, were na-egbusị diọkpara niile, ma nke mmadụ ma nke anụmanụ. Aga M ata arụsị niile nke ndị ljipt ahụhụ. Abụ M Dinwenụ! Ọbara e tere n’ụlọ ụnụ bụ na ya ga-abụ ihe ịrịba ama ebe ụnụ nọ!

Ọ bụrụ na M hụrụ ọbara ahụ, aga M agafe ụnụ. Otu a ụnụ ga-agbalaha nnukwu mbibi ahụ dị egwu ga-adakwasị obodo ljipt. Ụbọchị taa ga-abụrụ ụnụ ụbọchị ncheta, nke ụnụ ga-eji nnukwu mmemme a, were mee iji sọpụrụ Onyenweanyị na ndụdụgandụ ụnụ niile.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 115:12-13, 15-18 Az. 1 Kọr. 10:16

Azịza: Iko dị nsọ anyị na-agọzi bụ oriri ọbara Kristi.

1. Kedụ ihe m ga-emere Onyenweanyị,

maka ihe ọma niile O meere m?

Aga m eburu iko nzọpụta,

were kpọkuo aha Onyenweanyị. Azịza

2. Ọnwụ ndị kwere na Ya,

dị oke ọnụ n’ebe Onyenweanyị nọ.

Nwa odibo Gị, Onyenweanyị!

Nwodibo Gị ka m bụ; Ị tọhapụla m n’agbụ. Azịza.

3. Onyenweanyị aga m ehunyere Gị onyinye ekele,

bịakwa kpọkuo aha Gị.

Aga m emezu nkwa m kwere Onyenweanyị,

n’ihu ndị nke Ya niile. Azịza

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 11:23-26

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Mbụ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt

Isi Okwu: Oge ọ bụla ụnụ riri achịcha a, ñụọ iko a, ụnụ na-ekwupụta ọnwụ nke Onyenweanyị.

N’ihi na ihe ahụ m natara n’aka Onyenweanyị bụkwa ihe m nyefere ụnụ n’aka, nke bụ: N’abalị ahụ a raara ya nye, Onyenweanyị Jesu weere achịcha, nye Chineke ekele maka ya, nyawaa ya sị: “Nke a bụ ahụ M nke a na-enye maka ụnụ.

Na-emenụ nke a na ncheta nke M”. Otu ahụ kwa ka O si mee, mgbe ha richara nri anyasị, O buuru iko ahụ wee sị: “Iko a bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ n’ime ọbara M; mgbe ọ bụla ụnụ na-añụ ya, na-emenụ nke a na ncheta nke M”.

N’ihi ya, mgbe ọ bụla ụnụ riri achịcha nke a, ñụọ iko nke a, ụnụ na-ekwupụta ọnwụ Ya, ruo mgbe Ọ ga-abịa ọzọ!”

MBEKU – Jọn. 13:34

Onyenweanyị kwuru sị: Iwu ọhụrụ ka M na-enye ụnụ: Hụrịtaanụ onwe ụnụ n’anya otu M si hụ ụnụ n’anya.

OZIỌMA – 13:1-15

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

Isi Okwu: Ugbu a ka O gosiri otu ịhụnanya Ya siri zuo oke.

Ọ bụ tupu mmemme Ngabiga. Jesu matara na oge eruola mgbe Ọ ga-esi n’ụwa nke a gafere, lakwuru Nna. Ọ hụrụ ndị nke Ya nọ n’ụwa n’anya mgbe niile.

Ma ugbu a ka O gosiri na Ọ hụrụ ha n’anya ruo na ọgwụgwụ. Mgbe ha nọ na nri anyasị, ekwensu etinyela ya rịị n’obi Judas Iskarịọt, nwa Saịmọn, ka o ree Jesu.

Ma Jesu maara na Nna weere ihe niile hanye Ya n’aka; na ya siri na Chineke bịa; na Ya na-alaghachikwuru Chineke. O wee si n’oche-nri kulite; yipụ uwe O yi n’elu; chịrị akwa mmiri kee n’ukwu.

Ọ bịa wụnye mmiri n’ime efere, bido ịsa ụkwụ Ụmụazụ Ya, bịakwa were akwa mmiri ahụ O kere n’ukwu na-ehicha ha ụkwụ. Ọ bịakwutere Saịmọn Pita, onye sịrị Ya: “Onyenwe m!

Ọ bụ Gị ga-asa m ụkwụ?” Jesu zara ya: Ugbu a, ị ghọtaghị ihe M na-eme, ma ị ga-aghọta ya ma e mesịa”. Pita zara Ya: “A naghị eme ya eme! I nweghị ike ịsa m ụkwụ!” Jesu azaa ya: “Ọ bụrụ na M asaghị gị, o nweghịkwa ihe ọzọ jikọrọ Mụ na gị”.

Saịmọn Pita wee sị: “Onyenwe m! Ọ bụghị naanị ụkwụ m ka ị ga-asacha, kama sachaakwa aka m na isi m.” Jesu wee sị ya: “Ọ dịghị mkpa ịsagharị ahụ onye a sara ahụ; maka na ahụ niile adịla ọcha.

Kama ọ bụghị onye ọ bụla nọ n’ebe a dị ọcha. Jesu maara onye ahụ ga-ere Ya. Ọ bụ ihe kpatara O ji sị: “Ọ bụghị ụnụ niile dị ọcha.” Mgbe Ọ sachara ha ụkwụ, O yiiri uwe Ya, nọdụkwa n’oche-nri.

O wee jụọ ha: “Ụnụ ghọtara ihe M mere ụnụ? Ụnụ na-akpọ M ‘Nna anyị ukwu’ na ‘Onyenweanyị’. Ụnụ mere nke ọma. N’ezie, a bụ m Nna ụnụ ukwu na Onyenwe ụnụ.

Ma ọ bụrụ na Mụ onwe m bụ ‘Nna ụnụ ukwu’ na ‘Onyenwe ụnụ’ sara ụnụ ụkwụ; ọ pụtara na ụnụ ga na-asarịta ụkwụ ibe ụnụ. Atọọrọla M ụnụ ụkpụrụ, ka ụnụ wee na-eme ihe a mụ meere ụnụ.

Igbo Mass readings for March 29 2024, Ezi Fraịdee

Igbo Mass Readings for March 28 2024, Ncheta Oriri Ikpeazụ (Tọọzde).

Last Update: March 30, 2023