Igbo Mass Readings for February 2 2024, Emume Nkubata Dinwenụ Jesu Krist N’Ụlọ Nsọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 2 2024, Emume Nkubata Dinwenụ Jesu Krist N’Ụlọ Nsọ .
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:1-4
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ onye amụma Malaki
Yahweh Chineke kwuru sị, “Lee, ana m ezipụ onyeozi m ka ọ kwadoro m ụzọ. Ma Yahweh onye nke ụnụ na-atụ anya ya ga-abata n’ụlọnsọ ya na mberede; lee onyeozi nke ọgbụgbandụ ahụ ụnụ na-enwe mmasị na ya na-abịa.
Ọ bụ Yahweh nke igwe ndịagha na-ekwu. Ma onye ga-edi ụbọchị ọbịbịa ya, onye ga-eguzokwa ma ọ pụta? “Nihina ọ ga-adị ka ọkụ ihe nñụcha na ncha e ji asụ akwa; Ọ ga-anọdụ ala dịka onye nñụcha na nsacha nke ọlaọcha.
Ọ ga-asachakwa ụmụ Levaị ma ñụchaa ha dị ka ọlaedo na ọlaọcha ruo mgbe ha ga-ewetara Yahweh ihe onyinye kwesịrị ekwesị. Mgbe ahụ onyinye nke Juda na Jerusalem ga-amasị Yahweh dịka ọdị na mgbe ochie n’afọ ndị ahụ gara aga.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 24: 7, 8, 9, 10.
Azịza: Onye bụ eze nke otito a? Ọ bụ Onyenweanyị.
1. Welitenụ isi ụnụ elu ọnụụzọ ama,
Kulienụ ọnụụzọ ọkpụ ka eze otito bata! Azịza
2. Onye bụ eze otito a?
Ọ bụ Onyenweanyị, Dimkpa na dike,
onye bụ dike n’agha. Azịza
3. Welitenụ isi ụnụ elu ọnụụzọ ama,
kulienụ ọnụụzọ ọkpụ
Ka eze nke otito bata! Azịza
4. Onye bụ eze nke otito a?
Ọ bụ Chineke nke igwe ndịagha;
ọ bụ ya bụ eze nke otito! Azịza
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 2:14-18
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi e degaara ndị Hibru
Ebe ọ bụ na ụmụ ahụ ketere oke n’ụdị ịnwe ahụ na ọbara, ya onwe ya ketekwara oke n’otu ụdị ahụ ahụ, ka o wee site n’ọnwụ mebie ekwensu bụ onye ahụ ji ike nke ọnwụ.
Otu a ka o siri mee ka ndị ahụ niile nwere onwe ha bụ ndị ụjọ ọnwụ mere ka ha bụrụ ndị e kere agbụ na ndụ ha niile. N’eziokwu ndị dị ya mkpa abụghị ndị mmụọọma, kama ọ bụ agbụrụ Abraham.
Nke a mere o ji dị mkpa na ọ ga-eyi ụmụnna ya n’ihe niile ka o wee bụụrụ ha onyeisi nchụaja nwere obi ebere na nke kwesịrị ntụkwasịobi n’ije ozi nke Chineke, ka o wee medaa Chineke obi maka njọ ndị mmadụ.
N’ihina ya onwe ya ataala ahụhụ ma nweekwa ọnwụnwa. Nke a mere ka o nwee ike inyere ndị nọ na ọnwụnwa aka.
MBEKU
ALLEUIA, ALLELUIA:
Ọ bụ ihe nke ga-ekpughe ụzọ nye ndị mba ọzọ, na, otito nke ndị gị bụ Izrel.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 2:22-40
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Mgbe oge bịara maka emume nke ịdịọcha dịka iwu Mosis siri dị, Josef na Marịa kutere Jesu na Jerusalem n’ihu nke Dinwenụ. Dịka e dere n’iwu nke Yahweh sị, “Nwa mbụ ọbụla nke bụ oke ga-abụ ihe dị nsọ n’ihi Yahweh.”
Ha bịara ịchụ aja dịka e nyere n’iwu nke Dinwenụ, “Nduru abụọ mọbụ ụmụ kparakwukwu abụọ.” N’oge a, e nwere otu nwoke bi na Jerusalem, aha ya bụ Simiọn, ọ bụ onye eziomume bụrụkwa onye na-atụ egwu Chineke.
Ọ nọ na-elekwa anya maka nkasiobi nke Izrel, Mmụọ Nsọ nọnyekwaara ya. Mmụọ Nsọ emeelarịị ka ọ mata na ọ gaghị ahụ ọnwụ tupu ọ hụ Kristi nke Onyenweanyị.
Site n’odudu nke Mmụọ Nsọ, nwoke a batara n’ụlọnsọ ma mgbe nne na nna Jesu kubatara ya n’ụlọnsọ ka e meere ya dịka omenaala nke iwu si dị. Simiọn kuuru ya n’aka ya abụọ, kelee Chineke sị: “Ugbu a, onyenwe m, ka nwodibo gị laa n’udo, dịka nkwa gị siri dị.
N’ihina anya m ahụla nzọpụta gị, nke ị kwadobere n’ihu mmadụ niile. Ọ bụ ihe nke ha ekpughe ụzọ nye ndị mba ọzọ, na, otito nke ndị gị bụ Izrel.” Ihe niile Simiọn kwuru gbasara nwatakịrị ahụ bụ Jesu tụrụ nne na nna ya n’anya.
Simiọn wee gọzie ha, gwa Marịa nne Jesu sị; “Lee, e dobere nwatakịrị a maka ọdịda na mbili ọtụtụ mmadụ n’Izrel, na maka ihe ọmụmaatụ a ga-ekwutọ ekwutọ, (ma mmaagha ga-amawa gị obi) ka e were kpughee ihe dị ọtụtụ mmadụ n’obi.”
O nwere otu onye amụma nwaanyị aha ya bụ Ana, nwa Fanel, onye si n’agbụrụ Asha. O meela ezi agadi, onye ya na di ya biri naanị afọ asaa site n’agbọghọ ya tupu di ya anwụọ.
Ọ nọrọ ọnọdụ nwaanyị isimkpe ruo iri afọ asatọ na anọ. Ọ pụghị n’ụlọ nsọ Chineke, ebe o ji ibu ọnụ na ekpere na-efe Chineke, abalị na ehihie. Ọ pụtara n’oge ahụ, kelee Chineke, kwupụtakwa maka onye ahụ n’ihu ndị niile na-atụ anya maka nzọpụta nke Jerusalem.
Mgbe ha mezuru ihe niile dịka iwu nke Dinwenụ si dị, ha laghachiri na Galili, ruo obodo nke ha bụ Nazaret. Nwata ahụ toro, siekwa ike, jupụta n’amamihe, grasịa nke Chineke nọnyekwaara ya.
Igbo Mass Readings for February 3 2024, Satọde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume
Igbo Mass Readings for February 2 2024, Emume Nkubata Dinwenụ Jesu Krist N’Ụlọ Nsọ.