Connect with us

Igbo Stations of the Cross

Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) | Nkwụsị Nke Anọ

Published

on

Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Anọ.

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Anọ.

NKWỤSỊ NKE ANỌ

Jesu Ezute Nne ya N’Ụzọ

Uzo nke Obe - Igbo Stations of the Cross - uzo nke obe ano

Onye-ndu: Anyị esekpuoro Gị Jesu na-enye Gị ekele

Gbuọnụ Otu ikpere n’ala za.

Ọha: Maka na obe gị dị asọ ka I ji wee gbapụta ụwa

Kulitenụ

Mgbe Jesu hụrụ ebe nne ya kwụrụ n’ukwu obe, bịakwa hụ nwa-azụ ahụ nke ọ hụrụ na anya n’akụkụ ya. Ọ sị: “Nne, lee nwa gị”, Ya gwa nwa azụ ahụ, “Lee nne gị.” Nwa-azụ ahụ akpọrọ ya mgbe ahụ lawa n’ụlọ ya. (Jọn 19:25-17).

Advertisement

Sekpurunụ Ala

“Lee edebere nwata a maka ọdịda na mbilite ọtụtụ mmadụ n’Izrel. ọ bụ ihe ọmụma-atụ a ga-ekwutọ ewkutọ ka e were kpughee echiche nọ ọtụtụ mmadụ n’obi. Ma mmagha ga-amawa gị obi.

Onyenweanyi, mee ka m were nne gị dị asọ bụ Marịa ka ezigbo nne m, hụ ya n’anya ka isi hụ ya n’anya, na-asọpụrụ ya maka ihi gị. (Luke 2:34).

Ọha:    Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile;

              E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị.

              Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ;

Advertisement

              Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla;

              Bịa were m mee ihe ọbụla masịrị Gị.

Nna anyị nọ n’eluigwe… Ekele Marịa … Otito dịrị Nna…

Onye-ndu: Jesu a kpọdoro n’obe maka ihi anyị.

Ọha: Mere anyị ebere

Advertisement

Onye-ndu: ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga;

Ọha: Site n’ebere nke Chukwu ka ha zuo ike na ndokwa. Amen.

Kulitenụ:  kwere ukwe a gaa na nkwụsị nke ise

Ukwe: Marịa dị asọ yịọbara anyị;

            Ka anyị wee hụ Jesu n’anya

Advertisement

            N’ebe O koro n’obe.

Ụzọ nke Obe

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Anọ.

Continue Reading
Advertisement

Catholic Sunday and Daily Mass Readings for 2024 (Kindle eBook & Paperback)

X

Receive Daily Mass Readings and Reflections via Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.