Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Atọ.

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Atọ.

NKWỤSỊ NKE ATỌ

Jesu Adaa nke Mbụ

Uzo nke Obe - Igbo Stations of the Cross - Nkwusi nke Ato

Onye-ndu: Anyị esekpuoro Gị Jesu na-enye Gị ekele

Gbuọnụ Otu ikpere n’ala za.

Ọha: Maka na obe gị dị asọ ka I ji wee gbapụta ụwa

Kulitenụ

Ndị nke m, kedụ ihe m mere ụnụ? Kedụkwanụ ihe m ji megide ụnụ, Zanụ m! E duru m ụnụ ọgụ afọ abụọ dufee n’ọzara. E ji m achịcha nke eligwe zụọ ụnụ, dubata ụnụ n’ala nke jupụtara na mmiri ara na mmanụ-añụ. Ma ụnụ ejila obe kwụọ onye nzọpụta ụnụ ụgwọ. (Maịka 6:3, Akwa arịrị).

Sekpurunụ Ala

Ma ọ bụ ọrịa anyị ka o bu; bụrụkwa ahụhụ anyị ka ọ na-edi. Ma anyị chere na ọ bụ nwa onye ụwa ọjọọ, nwa-onye Chukwu megburu emegbu. (Aịzaya 53).

Chineke m, nye m amara gị n’uju ka m were obi ọcha na obi añụrị buru obe m ụbọchị niile wee na-eso gị.

(uzo nke obe ato)

Ọha:    Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile;

              E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị.

              Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ;

              Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla;

              Bịa were m mee ihe ọbụla masịrị Gị.

Nna anyị nọ n’eluigwe… Ekele Marịa … Otito dịrị Nna…

Onye-ndu: Jesu a kpọdoro n’obe maka ihi anyị.

Ọha: Mere anyị ebere

Onye-ndu: ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga;

Ọha: Site n’ebere nke Chukwu ka ha zuo ike na ndokwa. Amen.

Kulitenụ:  kwere ukwe a gaa na nkwụsị nke anọ

Ukwe: Ụnụ ndị nke nọ n’ahụhu;

            Ụnụ niile ibu na-anyị;

            Bia ka ụnụ nweta ike. (Matiu 11:28).

Ụzọ nke Obe

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Atọ.

Categorized in:

Igbo Stations of the Cross,

Last Update: May 11, 2020