Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Iri na Anọ.

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Iri na Anọ.

NKWỤSỊ NKE IRI NA ANỌ

A donye Jesu n’ili

Uzo nke Obe - Igbo Stations of the Cross - Uzo nke Obe iriano

Onye-ndu: Anyị esekpuoro Gị Jesu na-enye Gị ekele

Gbuọnụ Otu ikpere n’ala za.

Ọha: Maka na obe gị dị asọ ka I ji wee gbapụta ụwa

Kulitenụ

Na mgbede ka otu ọgaranya onye Arịmatịa, aha ya bụ Josef onye na-esokwa Jesu ji bịa rịọ Paịlet ka o bunye ya ahụ Jesu. Paịlet enye iwu ka e bunye ya. Josef e were akwa ụlarị ọcha fụọ ahụ Jesu dọnye ya n’ili ọhụrụ o gwurula onwe ya n’okwute, bịa kwara nnukwu okwute kwachie ọnụ ili lawa. (Matiu 27:57-60).

Sekpurunụ Ala

Nke a bịa mezuo amụma e buru sị: “E mekọtara ili ya na nke ndị njọ, ya na ọgaranya nọkwa n’ọnwụ ya.” Ya adọnye ahụ ahụ n’ili omezirila onwe ya. (Aịzaya 53:9. 1 Ndi Eze 13:30).

Chineke m, mee ka ndị nọ n’ọchịchị nwee obi mmadụ were obi Chineke na-achị. Mee ka ndị ọgaranya anyị were anya a na-asọrọ ha n’obodo na-arụpụta ọrụ nke nzọpụta.

ỌHA:    Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile;

              E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị.

              Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ;

              Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla;

              Bịa were m mee ihe ọbụla masịrị Gị.

Nna anyị nọ n’eluigwe… Ekele Marịa … Otito dịrị Nna…

Onye-ndu: Jesu a kpọdoro n’obe maka ihi anyị.

Ọha: Mere anyị ebere

Onye-ndu: ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga;

Ọha: Site n’ebere nke Chukwu ka ha zuo ike na ndokwa. Amen.

Kulitenụ: kwere ukwe a gaa n’ihu altar.

Ukwe: Ị gaghị ahapụ m n’ala mmụọ

           Ị gaghị ekwe ka m ree ure

           Añụrị ejula m obi. (Abuoma 16:10-11).

Ụzọ nke Obe

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Iri na Anọ.

Categorized in:

Igbo Stations of the Cross,

Last Update: May 11, 2020