Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Iri na Otu.

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Iri na Otu.

NKWỤSỊ NKE IRI NA OTU

A Kpodo Jesu n’obe

Uzo nke Obe - Igbo Stations of the Cross - Nkwusi nke iri na otu

Onye-ndu: Anyị esekpuoro Gị Jesu na-enye Gị ekele

Gbuọnụ Otu ikpere n’ala za.

Ọha: Maka na obe gị dị asọ ka I ji wee gbapụta ụwa

Kulitenụ

Dịka Mosis si welite agwọ elu n’ime ọzara ka a ga-esi ewelite Nwa nke Mmadụ elu, ka onye ọ bụla kwerela na ya wee nweta ndụ ebighịebi. E si n’ala welite m elu, a ga m adọtara onwe m mmadụ niile. Mgbe Jesu burutere obe ya na Gọlgọta, ha akpọgbuo ya n’etiti ndị ohi abụọ. Ndị mmadụ guzoro ele ya. Ndi ji ike ọchịchị na-akọcha ya, ndị agha ji ya na-akpa ọchị. Ma Jesu sị: “Nna, biko gbaghara ha maka na ha amaghị ihe ha na-eme. (Jọn 3:14-15, 12:32. Luke 23:32-39).

Sekpurunụ Ala

O mezuola ihe e dere n’akwụkwọ nsọ sị: “Ndị mmadụ na-akọcha m, na-eleda ma anya, ha ji m akpa ọchị na-emenyere m ọnụ, na-efere m n’isi. Ndị ajọ mmadụ agbaala m gburu gburu. Ha dupuru aka m na ụkwụ m. E nwere m ike ịgụ ọkpụkpụ m niile ọnụ.

Ọha:    Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile;

              E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị.

              Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ;

              Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla;

              Bịa were m mee ihe ọbụla masịrị Gị.

Nna anyị nọ n’eluigwe… Ekele Marịa … Otito dịrị Nna…

Onye-ndu: Jesu a kpọdoro n’obe maka ihi anyị.

Ọha: Mere anyị ebere

Onye-ndu: ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga;

Ọha: Site n’ebere nke Chukwu ka ha zuo ike na ndokwa. Amen.

Kulitenụ: kwere ukwe a gaa na nkwụsị nke iri na abụọ.

Ukwe: Nke a bụ ọbara nke ọgbụgba ndụ

            ọbara ọgbụgba ndụ ọhụrụ

            Nke a ga-agba maka ụnụ. (Mak 22:14).

Ụzọ nke Obe

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Iri na Otu.

Categorized in:

Igbo Stations of the Cross,

Last Update: May 11, 2020