Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Isii.

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Isii.

NKWỤSỊ NKE ISII

Veronika Ehichaa Jesu Ihu

Uzo nke Obe - Igbo Stations of the Cross - Uzo nke Obe isii

Onye-ndu: Anyị esekpuoro Gị Jesu na-enye Gị ekele

Gbuọnụ Otu ikpere n’ala za.

Ọha: Maka na obe gị dị asọ ka I ji wee gbapụta ụwa

Kulitenụ

Mgbe nwa nke mmadu ga-abia n’ebube ya n’ọgbara ndị mmụọọma niile, ọ ga-agwa ndị eziomume; “Mgbe agụụ na-agụ m, ụnụ nyere m nri m rie; Mmiri na-agụ m, ụnụ nyere m mmiri m ñụọ; mgbe m bụ onye ọbịa, ụnụ nabatara m. Agba m ọtọ, ụnụ eyiwe m akwa, mgbe m na-arịa ọrịa na mgbe m nọ n’ụlọ mkpọrọ, ụnụ bịara leta m. (Matiu 25:31,35-38).

Sekpurunụ Ala

Onye kwupụtara m n’ihu ndị mmadụ, aga m ekwupụta ya n’ihu Nna m nọ n’eligwe; ma onye ọbụla gọlaghara m n’ihu ndị mmadụ, aga m agọlagha ya n’ihu nna m nọ n’eligwe.

Chineke m, nyenụ m ndị ezigbo ikwu na ibe na ndị enyi ga-anọnyere m, ma na nsogbu ma n’añụrị. Mee ka m wepụta obi m gbaara gị akaebe n’ụwa a, ka i wee kwupụta aha m n’ihu Nna gị.

ỌHA:    Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile;

              E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị.

              Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ;

              Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla;

              Bịa were m mee ihe ọbụla masịrị Gị.

Nna anyị nọ n’eluigwe… Ekele Marịa … Otito dịrị Nna…

Onye-ndu: Jesu a kpọdoro n’obe maka ihi anyị.

Ọha: Mere anyị ebere

Onye-ndu: ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga;

Ọha: Site n’ebere nke Chukwu ka ha zuo ike na ndokwa. Amen.

Kulitenụ: kwere ukwe a gaa na nkwụsị nke asaa

Ukwe: Iwu kacha iwu niile;

            Iwu ọhụrụ ka m na-enye ụnụ;

            Hụnụ ibe ụnụ n’anya.

Ụzọ nke Obe

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Isii.

Categorized in:

Igbo Stations of the Cross,

Last Update: May 11, 2020