Connect with us

Igbo Stations of the Cross

Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) | Nkwụsị Nke Mbụ

Published

on

Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Mbụ.

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Mbụ.

NKWỤSỊ NKE MBỤ

A ma Jesu ikpe ọnwụ

Uzo nke Obe Mbu  - Igbo Stations of the Cross - Nkwusi nke mbu

Onye-ndu: Anyị esekpuoro Gị Jesu na-enye Gị ekele

Gbuọnụ Otu ikpere n’ala za.

Ọha: Maka na obe gị dị asọ ka I ji wee gbapụta ụwa

Kulitenụ

KAỊFAS asị Jesu: “Eji m aha Chukwu dị ndụ asị gị ñụọrọ anyị iyi ma Ị bụ Kristi, Nwa nke Chukwu, “Jesu azaa ya: “Ikwuola ya, mana ana m agwa gị na e mechaa, ị ga-ahụ Nwa nke mmadụ ka Ọ nọ n’aka nri nke Ike, si nurukpu nke Igwe na-abịa. Kaịfas adọwaa uwe nruala ya tie mkpu sị: “Okwuola arụ! Ndị mmadụ ekwuhachi sị: Kpọgbuo ya! Kpọgbuo ya” Ha bido bụwa ya asụ n’ihu; kụwa ya ihe.

Advertisement

Sekpurunụ Ala

Ndị iro m na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla siri oke ike. Ndị kpọrọ m asị na nkịtị akarịala; ndị iro m ji ihe ọjọọ akwụ m ụgwọ iheọma, maka na ana m eso ụzọ eziomume. (Abụọma 38:19-20).

Onyenwe m, nye m ndidi ka m ghara ikwughie ọnụ mgbe ihe na-esiri m ike. E kwela ka ikwu na ibe kọ m. Nye m obi siri ike, nke m ga-eji emeri ọnwụnwa niile ga-abịakwute m na ndụ m.

Ọha:    Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile;

              E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị.

              Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ;

Advertisement

              Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla;

              Bịa were m mee ihe ọbụla masịrị Gị.

Nna anyị nọ n’eluigwe Ekele Marịa Otito dịrị Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ

Onye-ndu: Jesu a kpọdoro n’obe maka ihi anyị.

Ọha: Mere anyị ebere

Advertisement

Onye-ndu: ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga;

Ọha: Site n’ebere nke Chukwu ka ha zuo ike na ndokwa. Amen.

Kulitenụ: kwere ukwe a gaa na nkwụsị nke abụọ

Ukwe: Nsogbu nọrọ m n’ebe niile;

            Anụrụ ndị na-agba izu

Advertisement

            Ka anyị kwutọọ aha ya. (Jeremaya 20:10).

Ụzọ nke Obe

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Mbụ.

Continue Reading
Advertisement

Catholic Sunday and Daily Mass Readings for 2024 (Kindle eBook & Paperback)

X

Receive Daily Mass Readings and Reflections via Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.