Igbo Mass Readings for January 7 2024, Nleta nke Ndịeze Atọ si Ọwụwa Anyanwụ – Kristi Egosi Ụwa Onwe Ya.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 7 2024, Nleta nke Ndịeze Atọ si Ọwụwa Anyanwụ – Kristi Egosi Ụwa Onwe Ya.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 60:1-6
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye amụma Aịzaya
Isi Okwu: Ebube nke Onyenweanyị apụtala ihè n’elu gị.
Kulite! chawapụta; maka na ihe gị abịala. Ebube nke Onyenweanyị na-awalitere gị. Ọ bụ ezie na itiri gbachiri ụwa niile, ọchịchịrị ka kpuchikwara ndị mmadụ, ma ebube nke Onyenweanyị na-awalitere gị.
Ugbu a Onyenweanyị awalitela n’elu gị. Ebube Ya apụtala ihè n’elu gị. Mba dị iche iche na-abịa n’ihe gị. Ndịeze na-abịakwa n’ihe gị nke na-amụkesi n’ụzọ ụtụtụ. Welite anya gị legharịa n’ebe niile.
Mmadụ niile na-ezukọta, na-abịakwute gị. Ụmụ gị ndị nwoke si n’ebe dị anya abịa. E jikwa nwayọọ kuru ụmụ ada gị n’aka na-abịa. Mgbe ị hụrụ ihe ndị a, ihu gị ga-abụ sọ ọchị.
Mgbe ahụ, obi gị ga-ejupụta n’añụrị, na-awụlikwa elu n’ọñụ, n’ihi na akụ na ụba ga-esi n’osimiri na-enubatara gị ka mmiri. Akụ na ụba nke ndị mba ọzọ ga na-abịakwutekwa gị.
Ịnyịnya ibu ga na-enubatara gị n’igwe, n’igwe. Ụdị ịnyịnya ibu dị iche iche nke ndị Midia na Ịfa ga-agba gị gburugburu. Onye ọ bụla bi na Sheba ga-ebute ọlaedo na mgba isi ọma, kwere ukwe otito nke Onyenweanyị na-abịa.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 71:1-2, 7-8, 10-13 Az. 11
Azịza: Onyenweanyị, mba niile ga-ada n’ihu Gị, gbuoro Gị ikpere ala.
1. Biko Chineke, were ikpe nkwụmọtọ Gị nye eze.
Nyekwuo nwa eze ezi omume Gị.
Ọ ga-eji ikpe nkwụmọtọ chịkwaba ndị nke Gị;
bịakwa kpeziere ndị a na-emegbu emegbu ikpe. Azịza.
2. N’oge ya, ezi omume ga-epupụta dịka ahịhịa dị ndụ.
Udo ga-adịgide ebe niile ruo mgbe ebighịebi.
Ọ ga-esite n’oke osimiri chịruo ọchịchị n’oke osimiri ọzọ,
bịakwa site n’oke osimiri chịruo ọchịchị n’ebe ụwa kwụsịrị. Azịza.
3. Ndịeze si Tashịsh na ofe osimiri ga-abịa tụọrọ Ya mma mma.
Eze ndị Sheba na Seba ga-ebutere Ya onyinye.
Eze niile dị n’ụwa ga-egbu ikpere ala n’ihu Ya.
Mba niile ga-agbara Ya odibo. Azịza.
4. Ọ ga-agbapụta nwa ogbenye ahụ na-etiku Ya.
Ọ ga-agbapụtakwa onye ahụ a na-emegbu emegbu,
onye na-enweghị onye enyemaka.
Ọ ga-emere ndị nọ na mkpa na ụmụ ogbenye ebere.
Ọ ga azọpụtakwa ndụ ụmụ ogbenye. Azịza
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 3:2-3,5-6
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi nke Pọl dị asọ degaara ndị Efesọs
Isi Okwu: E gosila anyị ugbu a na mmadụ nile, ma ndị Juu, ma ndị mba ọzọ, soro keta otu oke ahụ na nkwa Chineke kwere.
O were m anya, na ụnụ anụla na Chineke, site n’amara Ya, enyela m ọrụ ilekọta ezi na ụlọ Ya maka ọdịmma ụnụ. Eleghị anya, ụnụ anụkwala na Chineke kpugheere m ihe omimi na-izu-nzuzo Ya, mee ka m mata ha, dịka m dere nwantịntị na mbido akwụkwọ-ozi nke a.
Ihe ahụ a na-ekweghị ka ndị mmadụ mara n’oge gara aga, bụ ihe Mmụọ Nsọ kpugheere ndị Ụmụazụ na ndị amụma Ya dị nsọ n’oge nke anyị. Ihe omimi ahụ bụ nke a:
N’ime Jesu Kristi, ndị mba ọzọ na ndị Juu so nwere oke dị n’ụlọ Chineke; na ha soro ndị Juu bụrụ akụkụ otu ahụ Jesu Kristi ahụ; na ha sokwa keta oke na nkwa ahụ e kwere site n’ikwusa Oziọma.
ALELUYA – Matiu 2:2
Aleluya, aleluya!
Anyị hụrụ kpakpando Ya mgbe ọ walitere. Anyị wee bịa, isekpuru Onyenweanyị.
Aleluya!
OZIỌMA – 2:1-12
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Isi Okwu: Anyị hụrụ kpakpando Ya. Anyị wee bịa isekpuru eze.
Mgbe a mụrụ Jesu na Betlehem nke Judia, mgbe eze Herọd na-achị, ndị amamihe na-akọwa kpakpando siri n’ọwụwa anyanwụ bịaruo Jerusalem. Ha wee jụọ sị: “Olee ebe Ọ nọ, bụ Nwa ahụ a mụrụ ọhụrụ, ka Ọ bụrụ eze ndị Juu?
Anyị hụrụ kpakpando Ya n’ọwụwa anyanyụ wee bịa ịkpọrọ Ya isiala. Ma mgbe eze Herọd nụrụ ihe a, obi lọrọ ya na ndị bi na Jerusalem mmiri. Herọd wee kpọkọta ndịisi nchụaja na ndị nkụzi iwu Mosis niile, wee jụwa ha ebe a ga-amụ Kristi.
Ha wee sị ya: “Na Betlehem nke Judia,” n’ihi na otu a ka onye amụma si dee ya: “Gị bụ Betlehem, dị n’ala nke Juda, ị bụghị nwa nke ntakịrị na ndị na-achị achị na Juda.
N’ihi na onye ndu ga-esi na gị pụta. Onye ga-azụ ndị nke M bụ Izrel dịka atụrụ.” E mesịa, Herọd kpọọrọ ndị ọkasịmara ahụ na nzuzo wee jụta ha nke ọma banyere oge kpakpando ahụ pụtara ihé, O wee ziga ha Betlehem, gwakwa ha, sị: “Jeenụ, chọpụtanụ Ya, ziterenụ m ozi ka m bịakwuo, sekpuruo Ya.”
Mgbe ha nụsịrị ihe eze kwuru, ha bilie gawa. Ka ha na-eje, ha hụkwara kpakpando ahụ ha hụrụ n’ọwụwa anyanwụ. Ọ pụtakwara ọzọ, na-aga n’ihu ha.
O wee gagide ruo oge ọ bịara kwụrụ n’elu ebe Nwata ahụ nọ. Mgbe ndị amamihe ahụ hụrụ kpakpando ahụ, ha ñụrịrị oke ọñụ. Ha wee banye n’ime ụlọ, hụ Nwata ahụ na nne Ya bụ Marịa.
Ha dara n’ala, gbuoro Ya isiala na ikpere ala. Ha meghere akpa ha, nye Ya onyinye: nke bụ ọlaedo, na mgba oke isi ọma, (a na-akpọ frankincense) na ude nnukwu isi ọma (a na-akpọ myrrh).
Ha mesịa si ụzọ ọzọ laa ala ha, n’ihi na ozi ha natara na nrọ dọrọ ha aka na ntị, ka ha ghara ịlaghachi na be Herọd.
Igbo Mass readings for January 8 2024, Mmirichukwu nke Onyenweanyị – Afọ nke Abụọ.
Igbo Mass Readings for January 7 2024, Nleta nke Ndịeze Atọ si Ọwụwa Anyanwụ – Kristi Egosi Ụwa Onwe Ya.