Igbo Mass Readings for October 1 2024, Nnukwu Emume Nne anyị dị asọ Ezenwaanyị na Nne-Egwu nke Naịjiria.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 1 2024, Nnukwu Emume Nne anyị dị asọ Ezenwaanyị na Nne-Egwu nke Naịjiria.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 11:1-10

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ onye Amụma Aịzaya

Ome ga-esi n’ukwu osisi nke Jesse pụta, alaka ga-etopụta na mgbọrọgwụ ya. Mmụọ nke Osebụrụwa ga-adakwasa ya, mmụọ nke amamihe na nghọta, mmụọ nke ndụmọdụ na ike, mmụọ nke ọmụma na iwu nke Chukwu.

Ịtụ egwu nke Chukwu ga-abụ ihe na-atọ ya ụtọ. Ọ gaghị eji naanị ihe anya na-ahụ kpe ikpe, nke a ga-eji naanị ihe ọ nụrụ na ntị wee kpebie okwu. Kama eziomume ka ọ ga-eji kpere ndị ogbenye ikpe; ọ ga-enye ndị dị umeala n’ụwa ikpe nkwụmọtọ; Okwu ya ga-abụ mkpara igwe ga-akụtu ụwa, ikpe ya ga-ewetara ndị ajọ mmadụ ọnwụ.

Eziomume ga-abụ akwa ọ ma n’ukwu ya, ịkwụdosike ga-abụ ajị o kere n’ukwu ya. Nkịta ọhịa na ụmụ atụrụ ga-ebi otu ebe, agụ na ụmụ ewu ga-edina.

Nwa ehi na ọdụm na nwa ọdụm ga-anọkwa otu ebe; Obere nwa ga na-edu ha, Ehi na edi ga na-edina otu ebe; ọdụm ga na-ata ahịhịa ka ehi. Nwa na-añụ ara ga-egwu egwu n’ọnụ agwọ, nwa na-eto eto ga-amanye aka n’ọnụ agwọ ajụala.

Ha agaghị emebi ma ọ bụ merụọ mmadụ ahụ n’elu ugwu m dị nsọ, n’ihi na ụwa ga-ejupụta n’amamihe nke Yahweh, dịka otu mmiri si jupụta n’osimiri. N’ụbọchị ahụ, mgbọrọgwụ nke Jesse, ga-akwụrụ dịka ihe akara n’ihu mmadụ niile. Mba niile ga-achọba ya, ebe obibi ya ga-adị ebube.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 72: 1. 7-8. 12-13. 17.

Azịza: N’oge ya eziokwu ga-achawapụta, udo ga adịkwa ruo na njedebe ụwa.

1. Nye eze ikpe nkwụmọtọ gị, O Chineke,

nyekwa nwa eze eziomume nke gị,

Ka o were nwee ike ịchị ndị nke gị n’ụzọ ziri ezi,

nyekwa ndị ogbenye ikpe ziri ezi. Azịza

2. N’oge ya eziomume ga-achawapụta,

udo ga-adịkwa ruo na njedebe ụwa,

Alaeze ya ga-esi n’osimiri ruo n’osimiri,

bido na mmiri ruo n’isi ngwụcha nke ụwa. Azịza

3. Ọ ga-atọhapụ onye ogbenye kpọkuru ya,

na ndị niile chọrọ enyemaka ya.

Ọ ga-emere ndị ogbenye na ndị esighị ike ebere,

na-azọpụta ndụ ha. Azịza

4. Ngọzi dịrị aha ya ebeebe,

ka ọ dịgide dịka anyanwụ,

ka agbụrụ niile dị n’ụwa nweta ngọzi na ya,

ka mba niile kpọọ ya onye dị ngọzi. Azịza

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 2:13-22

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi Pọl dị asọ Degaara Ndị Efesọs

Ugbu a n’ime Jesu Kristi, ụnụ bụ ndị nọbu n’ebe dị anya ka e wedeberela nso n’ime ọbara Kristi. Ya bụ udo anyị, onye merela anyị ka anyị bụrụ otu ma kwatuokwa mgbidi nkewa nke na-eweta iro.

O sitere n’ahụ Ya weta n’isi njedebe, iwu na atụmaatụ nke ndị Juu, ka O wee ji mmadụ abụọ ahụ mepụta otu mmadụ ọhụrụ n’ime onwe Ya, si n’ụzọ dị otu a ka udo dị.

N’ụzọ dị otu a ka Ọ ga-esi kpeziere anyị na Chineke site n’obe Ya, wetakwa n’isi njedebe, iro dị n’etiti ha abụọ. Ọ bịakwara kwusaara ụnụ ndị nọ n’ebe dị anya na ụnụ ndị nọ nso, oziọma nke udo.

Ọ bụ site na ya ka anyị ji nwee ike n’ime otu mmụọ ahụ ịbịakwute Nna. Ya bụ ụnụ esorola ndị nsọ bụrụ ndị a mụrụ n’ala, n’ezinụụlọ Chineke, nke a rụkwasara n’elu ntọala nke ụmụazụ na ndịamụma, nke Jesu Kristi n’onwe ya bụ okwute ntọala ya.

Ọ bụ n’ime ya ka ihe ndị a niile jikọtara ọnụ, too, wee bụrụ ụlọnsọ n’ime Dinwenụ. N’ime Ya ka a rụnyekwara ụnụ dịka ebe obibi nke Chineke n’ime mmụọ.

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

“Ekele! I jupụtara na graasịa, Osebụrụwa nọnyeere gị. Ị dị ngọzi n’etiti ụmụnwaanyị niile.

ALLELUIA

OZIỌMA – 2:13-15, 19-23.

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Mgbe ndị amamihe ahụ labara mmụọọma nke Onyenweanyị bịakwutere Josef na nrọ sị ya, “Bilie, kpọrọ nwata ahụ na nne ya gbaga Ijipt. Nọrọ ebe ahụ, ruo mgbe m ga-agwa gị, n’ihina Herọd bụ n’uche ịchọ nwatakịrị ahụ ka o gbuo ya.”

Josef biliri kpọrọ nwata ahụ na nne ya n’ime abalị gbaga Ijipt. Ọ nọ ebe ahụ ruo mgbe Herọd nwụrụ. Nke a bụ ji mejupụta ihe Dinwenụ kwuru site n’ọnụ onye amụma sị, “Esiri m n’ljipt kpọpụta nwa m.”

Mgbe Herọd nwụrụ, mmụọọma nke Onyenweanyị bịakwutere Josef na nrọ n’ljipt sị ya, “Bilie kpọrọ nwata ahụ na nne ya laghachi n’ala Izrel, n’ihina ndị chọrọ igbu ya anwụọla.”

O biliri, kpọrọ nwata ahụ na nne ya, laghachi n’ala Izrel. Ma mgbe Josef nụrụ na Akeleus anọchiele anya nna ya Herọd dịka eze Judia, egwu tụrụ ya ịga ebe ahụ.

Ebe ọ bụ na a dọọla ya aka na ntị na nrọ, ọ gara biri na Galili, n’obodo a na-akpọ Nazaret. Nke a bụ iji mejupụta ihe ndị amụma kwuru sị, “A ga-akpọ ya onye Nazaret.”

MA Ọ BỤ

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 9:1-6

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ onye Amụma Aịzaya

Na mgbe gara aga, o mere ka e lelia ala Zebulun na ala Naftali, mana n’oge na-abịanụ ọ ga-akwanyere ndị niile bi n’ụzọ nke oke osimiri ugwu, ala nke dị n’ofe Jọdan, Galili nke mba ụwa niile.

Ndị na-aga ije n’ọchịchịrị ahụla nnukwu ihe, Ndị bi na ndo nke ọnwụ, ihe achakwasala ha. I meela ka ndị bi n’obodo ahụ bawanye n’ọnụọgụgụ. I mekwaala ka añụrị ha dị ukwuu, Ha ga-enwe añụrị n’ihu gị dịka ha si enwe ọñụ n’oge owuwe ihe ubi, ya na otu ndị mmadụ si enwe ọñụ mgbe ha na-eke ihe ha lụtara n’agha.

Ị kụjiela ịnyagba na-anyịgbu ya, na mkpara nke a na-akụ ya n’ubu, na mkpara igwe nke ndị na-emesi ya ike, dịka ọ dị n’ụbọchị nke ndị Midian. Akpụkpọ ụkwụ ọbụla ndị agha ji zọpịasịa ihe n’ọgbọ agha ma uwe a tụrụrụ n’ọbara, ha niile ga-abụ ihe agbara ọkụ.

N’ihina a mụpụtaara anyị otu nwa, e nyekwara anyị otu nwa nwoke, Ọchịchị ga-abụkwa nke ya, aha a ga-akpọkwa ya bụ, “Onye ndụmọdụ dị ebeebe, Chineke nke bụ dike, Nna dị Ebeebe, Eze nke Udo.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 112: 1-2, 3-4, 5-6, 7-8.

Azịza: Agbụrụ onye eziomume ga-enweta ngọzi.

1. Alleluia! Añụrị na-adịrị onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu,

onye ji ọñụ na-edebe iwu ya!

Ụmụ ndị dị otu a ga-abụ ndị nwere ike n’ụwa,

agbụrụ onye eziomume ga-enweta ngọzi. Azịza

2. Ezinụụlọ ya ga-enweta akụnụba,

eziomume ya agaghị enwe mgbanwe

N’ihina onye ezigbo omume ga-achawapụta dịka ihe n’etiti ọchịchịrị,

ọ dị ebere, ịhụnaanya, na-akwụba aka ọtọ. Azịza

3. Ya bụ ezigbo mmadụ anaghị ana ọmụrụnwa ma o binye ego,

ọ bụ onye eziokwu n’ihe niile ọ na-eme.

Ebe eziomume chedoro ya ọ na-enwe ịkwụdosiike,

ọ na-ahapa ncheta ga-adị ebeebe n’azụ ya. Azịza

4. Ebe obi ya na nchekwube ya dị na Onyenweanyị,

ọ gaghị atụ egwu ịnata azi ọjọọ.

O ji ntachi obi emeri egwu ya,

n’ikpeazụ ọ na-emeri ndịiro ya. Azịza

MBEKU

ALLELUIA, ALLELUIA:

Mmụọọma ahụ bịakwutere Marịa sị ya, “Ekele, I jupụtara na grasịa, Osebụrụwa nọnyere gị.”

ALLELUIA

OZIỌMA – 1:26-38

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

N’ọnwa nke isii, Chineke zigara Mmụọọma Gebrel ka ọ gaa n’obodo Galili a na-akpọ Nazaret; ka ọ gakwuru otu nwaagbọghọ na amaghị nwoke, onye ikwunibe ya kwekọrịtara na otu nwoke aha ya bụ Josef, nke si n’agbụrụ Devid ga-alụ.

Aha nwaagbọgbọ ahụ bụ Marịa. Mmụọọma ahụ bịakwute Marịa sị ya, “Ekele, I jupụtara na grasịa, Osebụrụwa nọnyere gị!” Obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu n’ụdị ekele a, nke mere na ọ malitere ịtụle n’uche ya ihe ụdị ekele a pụtara.

Mmụọọma ahụ sịrị ya, “Atụla egwu, Marịa, n’ihina Ị natala ngọzi n’aka Chineke. Lee Ị ga-adị ime, mụta nwa nwoke; aha Ị ga-akpọ ya bụ Jesu. Ọ ga-adị ukwuu, a ga-akpọkwa ya nwa onye kacha elu.

Dinwenụ Chineke ga-enye ya ocheeze nna ya Devid. Ọ ga-achị ezinụụlọ Jekọb ebeebe; alaeze ya agaghị enwe ọgwụgwụ.” Marịa jụrụ Mmụọọma ahụ sị, “Olee otu nke a ga-esi mee ebe ọ bụ amaghị m nwoke.”

Ma Mmụọọma ahụ zara ya sị, “Mmụọ Nsọ ga-abịakwasa gị; ike nke onye kacha elu ga-ekpuchi gị. N’ihi nke a, a ga-akpọ nwa ahụ Ị ga-amụ, Onye nsọ, nwa Chineke.

Lee, Elizabet onye ikwu gị, onye ndị mmadụ na-akpọ nwaanyị aga, atụrụla ime n’agadị ya; ugbu a ọ dị ime ọnwa isii. N’ihina ebe Chineke nọ, o nweghị ihe nyịrị omume.”

Marịa kwuru sị, “Lee, abụ m odibo nwaanyị nke Osebụrụwa, ka o reere m ka i siri kwu.” Mmụọọma ahụ wee si n’ebe ọ nọ pụọ.

Igbo Mass Readings for October 2 2024, Ncheta Ndị Mmụọọma Ndị Nche

Igbo Mass Readings for October 1 2024, Nnukwu Emume Nne anyị dị asọ Ezenwaanyị na Nne-Egwu nke Naịjiria.

Last Update: December 10, 2022