Igbo Mass Readings for June 16 2023, Emume Obi Dị Asọ nke Jesu – Afọ nke Mbụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 16 2023, Emume Obi Dị Asọ nke Jesu – Afọ nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:6-11

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Diuterọnọmi

Isi Okwu: Onyenweanyị họpụtara ụnụ ka ụnụ bụrụ ndị pụrụ iche.

Mosis gwara ndị mmadụ: ụnụ bụ ndị nsọ, ndị Chineke weere nye onwe ya. Ọ họpụtara ụnụ site n’agbụrụ niile dị n’ụwa a, ka ụnụ bụrụ ndị ya pụrụ iche.

Ọ bụghị n’ihi na ụnụ dị ukwuu n’ọnụ ọgụgụ karịa ndị ọzọ, ka o ji họpụta ụnụ, hụ ụnụ n’anya otu a; ọ bụkwaghị n’ihi na ụnụ dịkarịsịrị nta! Kama ọ bụ naanị n’ihi ịhụnanya Chineke nwere n’ebe ụnụ nọ, na n’ihi imezukwa nkwa o kwere nna nna ụnụ ha.

Ọ bụ nke a mere o ji napụta ụnụ site n’ọnọdụ ịbụ ohu ụnụ n’ala Ijipt, ebe Fero ji aka ike ya na-achị ụnụ. Matanụ nke ọma na Chineke ụnụ bụ Chineke kwesịrị ntụkwasị obi onye na-edebezu nkwa ya mgbe niile; ịhụnanya ya na-adịgidekwa nye ndị niile hụrụ ya n’anya, ma na-edebezukwa ihe niile o nyere n’iwu.

Ma ndị niile kpọrọ ya asị ka ọ ga-ata ahụhụ, laakwa ha n’iyi. Ọ bụ ya ga-akwụ ha ụgwọ ha n’onwe ya. N’ihi ya, hụ na ụnụ debezuru iwu na ụkpụrụ ndị a m na-enye ụnụ taa.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 102: 1-4. 6-8. 10. Az. 17

Azịza: Ịhụnanya Onyenweanyị na-adịgide bido na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ n’etiti ndị na-atụ egwu ya.

1. Mkpụrụ obi m, too Dinwenụ.

Ihe niile dị n’ime m ga-etokwa aha nsọ ya.

Too Dinwenụ mkpụrụ obi m.

Echefukwala ngọzi ya niile. Azịza

2. Ọ bụ ya na-agbaghara gị mmehie gị niile,

na-agwọkwa gị ọrịa gị niile,

Ọ na-azọpụta ndụ gị site n’ili,

na-ewere ịhụnanya ya na obi ebere ya na-ekpube gị dị ka okpu eze. Azịza.

3. Dinwenụ na-eme ka ikpe ziri ezi rute ndị a na-emegbu emegbu aka.

Na-emekwa ka ndị dị otu a nweta ihe ruuru ha.

O mere ka Mosis mata ụzọ ya,

meekwa ka ụmụ Izrel niile hụ ịdị ike nke ịrụ ọrụ ebube ya. Azịza.

4. Dinwenụ bụ onye omiko na onye amara,

ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ.

Obi ebere na ịhụnanya ya babigara ụba oke.

Ọ dịghị ata anyị ahụhụ dị ka anyị si kwesị ịnata ahụhụ.

Ọ dịkwaghị akwụghachị anyị ihe ruuru anyị n’ihi mmehie. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 4:7-16

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ ozi mbuụ nke Jọn dere

Isi Okwu: Ịhụnanya si n’ebe Chineke nọ a bịa.

Ndị enyi m, o kwesịrị ka anyị hụrịtaa onwe anyị n’anya n’ihi na ịhụnanya na-esi n’ebe Chineke nọ abịa. Ndị niile na-ahụ ibe ha n’anya na-egosi na ha bụ ụmụ Chineke.

Ha na-egosikwa na ha na-amata Chineke nke ọma nke ọma. Ọ bụrụ na mmadụ adịghị ahụ ibe ya n’anya ọ na-ezipụta na ọ maghị onye Chineke bụ, n’ihi na Chineke bụ ịhụnanya.

N’ihi na Chineke gosiri anyị ịdị ukwuu nke ịhụnanya ya site n’izite Ọkpara ya ka o wetara anyị ndụ ebighị ebi site n’ọnwụ ọ nwụrụ. Site n’ihe a Chineke meere anyị, anyị na-ahụ ihe a na-akpọ ịhụ mmadụ n’anya n’ezie.

Ọ bụghị na anyị buru ụzọ hụ Chineke n’anya kama ọ bụ na Chineke n’onwe ya hụrụ anyị n’anya zite Ọkpara ya ka ọ bụrụ ihe ịjụrụ ya obi n’ihi mmehie anyị.

Ndị enyi m, ebe ọ bụ na Chineke si otu a hụ anyị n’anya. Ọ bụ ezie na o nwebeghị mgbe ọ bụla anyị ji anya anyị hụ Chineke anya, ma ọ bụrụ na anyị ahụ ibe anyị n’anya, Chineke na-ebi n’ime anyị.

Ịhụnanya ya kwa na-eto eto n’ime anyị igosi anyị na o bi n’ime anyị. O tinyekwala Mmụọ Nsọ ya n’ime anyị igosi anyị na o bi n’ime anyị, na anyị bikwa n’ime ya.

Karisia, anyị ejirila anya anyị hụ Ọkpara ahụ Chineke zitere. Ugbu a anyị na-akọrọ ụwa niile na Chineke zitere Ọkpara ya ka ọ bụrụ Onye nzọpụta ụwa. Chineke bi n’ime onye ọ bụla kweere, na n’ime onye ọ bụla meghere ọnụ ya kwupụta na Jesu bụ Ọkpara Chineke.

Onye dị otu a bikwa n’ime Chineke. Anyị maara na Chineke hụrụ anyị n’anya n’ihi mmetụta ịhụnanya ya metụtara anyị, na n’ihi na anyị kweere na ya mgbe ọ gwara anyị na ọ hụrụ anyị n’anya.

Chineke bụ ịhụnanya. Onye ọ bụla kwa na-ebi ndụ ịhụnanya na-anọgide n’ime Chineke. Chineke n’onwe ya na-ebiyekwara onye dị otu a.

MBEKU – Matiu 11:29

Aleluya, aleluya!

Soronụ ụzọ m, mụtakwanụ ihe site n’aka m. N’ihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala n’obi.

Aleluya!

OZIỌMA – 11:25-30

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: A dị m nwayọọ na umeala n’obi.

Jesu kpere ekpere sị: Nna, Onyenwe igwe na ala, ekelee m gị, n’ihi na i zonarịrị ndị ọkachamara eziokwu ahụ, ma kpughee ya nye ụmụntakịrị. Ee, Nna, ọ tọrọ gị ụtọ ime ya n’ụzọ dị otu a.

“Nna m enyefeela m ihe niile n’aka. Ọ dịghị onye maara Ọkpara ahụ ma ọ bụghị Nna ya. Ọ dịkwaghị onye maara Nna karịa Ọkpara ahụ na ndị Ọkpara ahụ kwadoro igosi Nna ya.

Bịakwutenụ m ụnụ niile ndị ike gwụrụ ibu ibu arọ e bokwasịrị ụnụ. Aga m enyekwa ụnụ izuike. Soronụ ụzọ m, mụtakwanụ ihe site n’aka m. N’ihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala n’obi. Ụnụ ga-achọtakwara obi ụnụ izuike. N’ihi na ụzọ m dị mfe, ibu m ga-ebokwasịkwa ụnụ adịghị arọ.”

Igbo Mass Readings for June 17 2023, Ncheta Obi Marịa na-ebughị Atụtụ Njọ / Igbo Mass Readings for June 17 2023, Satọde Izuụka nke Iri N’Oge Nkịtị

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for June 16 2023, Emume Obi Dị Asọ nke Jesu – Afọ nke Mbụ.

Last Update: April 7, 2023