Igbo Mass Readings for June 23 2024, Nnukwu Emume nke Ọmụmụ Jọn Ome Mmirichukwu – Ụka Nche Abalị.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 23 2024, Nnukwu Emume nke Ọmụmụ Jọn Ome Mmirichukwu – Ụka Nche Abalị.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:4-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ onye Amụma Jeremaya
Okwu nke Chineke bịakwutere m na-asị: “Tupu a tụrụ ime gị, amarala m gị, tupu a mụọ gị, edoola m gị nsọ; ahọpụtakwala m gị ka onye amụma nke mba niile.”
Azara m ya sị, “Ah! Osebụrụwa Chineke! Lee amaghị m ka e si ekwu okwu n’ihina m bụ nwata.” Mana Osebụrụwa gwara m sị, “Ekwukwala na Ị bụ nwata; Ị ga-agakwuru ndị niile m ga-ezigara gị, Ị ga-ekwukwa ihe ọbụla m gwara gị.
Atụkwala ha egwu n’ihina m nọnyere gị ịzọpụta gị. Osebụrụwa na-ekwu. Ma Osebụrụwa setịrị aka ya metụ n’ọnụ m, wee gwa m sị, “Lee etinyela m okwu m n’ọnụ gị.
Lee ezipụla m gị taata n’ime mba niile nakwa ọchịchị niile, ka ị tọpụta ma kụtuo, ka I mebie ma weghara ọchịchị niile, ka Ị rụzie ma kụọkwa.”
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 71: 1-2, 3-4, 5-6, 15, 17.
Azịza: Ị bụrịị oke nke m site n’afọ nne m.
1. Na gị, Onyenweanyị ka m gbabara,
ekwela ka ihere mee m.
N’eziomume gị gbapụta m, zọpụta m,
gee m ntị ma zọpụta m! Azịza
2. Bụrụ okwute nke mgbaba m,
mgbidi aja nke ga-azọpụta m!
n’ihina ị bụ okwute m, nchedo m.
Chineke m, zọpụta m n’aka ndị ajọ mmadụ,
n’ọnya nke ndịiro na nke ndị ọchịchị aka ike! Azịza
3. N’ihina sọ gị, Onyenweanyị bụ nchekwube m,
Onyenweanyị echekwubere m na gị
bido na mgbe m dị na okorobịa,
Atụkwasara m gị obi bido na mgbe a mụrụ m,
Ị bụrịị oke nke m site n’afọ nne m. Azịza
4. Ọnụ m ga-ekwupụta eziomume gị
na ike nke nzọpụta gị ụbọchị niile,
O Chineke, Ị kụziri m bido na nwata m,
aga m na-ekwupụta ọrụ ebube gị. Azịza
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1:8-12
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi mbụ Pita dere
Ọ bụ ezie na ụnụ ejibeghị anya ụnụ hụ ya, ma ụnụ hụrụ ya n’anya. Ọ bụkwa ezie na ụnụ anaghị ahụ ya anya ugbu a, ma ụnụ kwere na ya. N’ezie, ọbụladị ugbu a, ụnụ nwere obi nke jupụtara n’ọñụ ahụ nke ọnụ na-apụghị ịkọwa.
Ụgwọ ọrụ ụnụ ga-enweta n’ihi ntụkwasịobi ụnụ n’ime ya, ga-abụ nzọpụta nke mkpụrụobi ụnụ. Ihe banyere nzọpụta a ka ndị amụma chọsiri ike, jụkwaa ajụjụ banyere ya.
Ha bukwara amụma banyere amara ahụ nke Chineke ga-enye ụnụ. Ha gbara mbọ ịchọpụta ihe Mmụọ Kristi ahụ bi n’ime ha na-ekwu, n’ihina o burula ụzọ gbara ha ama banyere ahụhụ niile Kristi ga-ahụ na ebube niile ga-eso ya.
Chineke mere ka ha mata na ọrụ ha rụrụ n’ụwa abụghị maka ọdị mma nke onwe ha, kama maka nke ụnụ. Ha rụụrụ ụnụ ọrụ nke a mgbe ha gwara ụnụ okwu banyere ihe ndị ahụ, nke ndị na-agbasa oziọma na-agwakwa ụnụ ugbu a.
Ha gwara ụnụ ya site na ike nke Mmụọ Nsọ, nke e siri n’eluigwe zita. Ihe ndị ahụ bụkwa ihe ndị mmụọọma n’onwe ha chọkwara ịmata.
MBEKU
ALLELUIA, ALLELUIA:
Ọ bịara ịgba ama, ịgbara ihe ahụ akaebe, bịa kwadobere Chineke ndị nke ya.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 1:5-17
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
N’oge eze Herọd na-achị ala Judịa niile, e nwere otu onye nchụaja aha ya bụ Zekarịa. O so n’otu ndị oje ozi nke Abija. O nwere nwunye aha ya bụ Elizabet, onye si n’agbụrụ Erọn, onye isi nchụaja.
Di na nwunye a bụ ndị eziomume n’ihu Chineke. Ha na-edobe iwu niile na ụkpụrụ niile nke Onyenweanyị, n’enweghị ntụpọ. Ma ha amụtaghị nwa, n’ihina Elizabet bụ nwaanyị aga.
Ya na di ya emekwala agadi. Mgbe Zekarịa nọ na-eje ozi n’ihi Chineke oge ndị otu ya ketara ịga ozi, ka usoro omenala ndị nchụaja si dị, ọ manyeere Zekarịa ịbanye ebe nchụaja dị n’ụlọnsọ nke Chineke kpọọ mgbaisiọma ọkụ.
Ọha ndị Juu niile nọ n’ezi na-ekpe ekpere n’oge aja mgbaisiọma ahụ. N’ebe ahụ ka mmụọọma nke Osebụrụwa bịakwutere ya, guzoro n’akanri nke ekwuaja mgbaisiọma ahụ.
Mgbe Zekarịa hụrụ ya, obi mmapụ na ụjọ jidere ya. Ma mmụọọma ahụ sịrị ya, “Atụla egwu, Zekarịa n’ihina a nụla ekpere gị: Elizabet nwunye gị ga-amụtara gị nwa nwoke.
Ị ga-akpọkwa ya Jọn. Ị ga-enwe ọñụ na obi ụtọ; Ọtụtụ mmadụ ga-enwe añụrị n’ọmụmụ ya; N’ihina ọ ga-abụ onye dị ukwu n’ihi Chineke. Ọ gaghị añụ mmanya ọbụla mọbụ ihe ọñụñụ ọbụla na-egbu egbu.
Ọ ga-ejupụtakwa na Mmụọ Nsọ, ọ bụladị site n’afọ nne ya. Ọ ga-eme ka ọtụtụ ụmụ Izrel lọghachi azụ n’ebe Chukwu ha nọ. Ọ ga-aga ịkwadoro Dinwenụ ụzọ.
N’ụdị mmụọ na ike nke onye amụma Elaija, ka ọ ga-eji tụgharịa obi ndị bụ nna n’ebe ụmụ ha nọ. Meekwa ka ndị isi ike tụgharịa obi, lekwasị anya n’amamihe nke ndị eziomume, bịa kwadobere Chineke ndị nke ya.”
Igbo Mass readings for June 24 2024, Nnukwu Emume nke Ọmụmụ Jọn Ome Mmirichukwu.
Igbo Mass Readings for June 23 2024, Nnukwu Emume nke Ọmụmụ Jọn Ome Mmirichukwu – Ụka Nche Abalị.