Igbo Mass Readings for March 16 2024, Satọde Izuụka nke Anọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka March 16 2024, Satọde Izuụka nke Anọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 11:18-20
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye amụma Jeremaya
Yahweh mere ka m mara maka ọnya ha na-ekwere m; nke mere na o gosiri m ihe ọjọọ niile ha mere. Adị m ka nwaatụrụ akpụ aga igbu egbu, mana amaghị m na ọ bụ m ka ha na-agbara izu ọjọọ na-asị, “Ka anyị mebie osisi ahụ na mkpụrụ ya; ka anyị gbupụ ya n’ala ndị dị ndụ, ka a hapụ icheta aha ya ọzọ.”
Kama Chineke ji ike niile, onye na-ekpe ikpe ziri ezi, onye na-enyocha uche na obi, mee ka m hụ iwe gị n’ebe ha nọ, maka na ọ bụ na gị ka m tụkwasara obi m.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 7: 2-3, 9-10, 11-12.
Azịza: Onyenweanyị na Chineke m, ana m agbaba na nchedo gị.
1. Onyenweanyị na Chineke m,
ana m agbaba na nchedo gị.
Zọpụta m n’aka ndị na-esogbu m,
I meghị otu a, ha ga-adọgbu m dịka agụ,
dọrichaa m ebe o nweghi onye ga-azọpụta m. Azịza
2. Kpee m ikpe Onyenweanyị,
dịka eziomume m na ùgwù m si dị.
Bibie ajọ echiche ndị ajọ mmadụ niile.
Mee ka onye eziokwu kwụsie ike,
ngị Chineke nke ikpe nkwụmọtọ,
onye na-enyocha ime mmụọ na mkpụrụobi. Azịza
3. Chineke bụ ụta nke na-echedo m,
ọ na-echekwa ndị obi ha kwụ ọtọ.
Chineke bụ onye ikpe nkwụmọtọ;
Ọ naghị ewe iwe ọsọọsọ.
Mana ọ bụ Chineke na-ewesara ndị niile
jụrụ nchegharị iwe mgbe ọbụla. Azịza
MBEKU – Ps. 95:8
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya, ụnụ agbachila obi ụnụ.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
OZIỌMA – 7:40-53.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.
Mgbe ha nụrụ okwu ndị a, ụfọdụ ndị mmadụ kwuru sị, “Onye a bụ onye amụma ahụ n’ezie.” Ndị ọzọ sịrị, “Onye a bụ Kristi ahụ. Ma ụfọdụ jụrụ sị, “Kristi ahụ ọ ga-esi na Galili pụta?
Ọ bụ na Akwụkwọ Nsọ ekwughị na Kristi ga-esi n’agbụrụ Devid pụta; na ọ ga-esi na Betlehem bụ ọnụmara Devid?” Nke a mere nkewa jiri dapụta n’etiti ndị mmadụ banyere ya.
Ụfọdụ chọrọ ijide ya, ma o nweghị onye ọbụla metụrụ ya aka. Ndị nche laghachikwuuru ndịisi nchụaja na ndị Farisii, ndị jụrụ ha sị, “Gịnị mere ụnụ akpụtaghị ya?”
Ndị nche ahụ zara ha sị, “Ọ dịbeghị onye kwuru okwu dị ka nwoke a!” Ndị Farisii ahụ jụrụ ha sị, “Eduhiekwuola ụnụ onwe ụnụ ụzọ? Ọ dịla onye ọbụla n’ime ndịisi ma ọ bụ n’ime ndị Farisii kwere na ya?
Mana igwe mmadụ a bụ ndị amaghị iwu bụ ndị abụrụ ọnụ.” Nịkọdemus, otu onye n’ime ha bụ onye bịakwutere Jesu na mbụ gwara ha sị, “Iwu anyị ọ na-ama mmadụ ikpe n’ebughị ụzọ nụ olu ya wee mata ihe o mere?”
Ha zaghachiri ya sị, “Ị bụkwu onye Galili? Nyochaa Akwụkwọ Nsọ, ị ga-achọpụta na o nweghị onye amụma ga-esi na Galili pụta.” Onye ọbụla n’ime ha labara n’ụlọ ya.
Igbo Mass readings for March 17 2024, Ụka nke Ise N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Abụọ
Igbo Mass Readings for March 16 2024, Satọde Izuụka nke Anọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.