Igbo Mass Readings for March 9 2024, Satọde Izuụka nke Atọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka March 9 2024, Satọde Izuụka nke Atọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 6:1-6

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Hoseya

N’ime ahụhụ ha, ha ga-achọsi M ike sị: “Bịanụ ka anyị laghachikwuru Yahweh. Ọ dọriela anyị ma ọ ga-agwọkwa anyị. O tirụọla anyị ahụ ma ọ ga-ekechikọkwa ọnya anyị.

Ọ ga-eme ka anyị dịkwa ndụ mgbe ụbọchị abụọ gachara; n’ụbọchị nke atọ, ọ ga-eme ka anyị bilie ka anyị wee dịkwa ndụ n’ihu ya. Ka anyị gbalịanụ ịmata Yahweh, n’ihina ọbịbịa ya doro anya dịka chi ọbụbọ,

Ọ ga-abịakwute anyị dịka mmiri ozuzo, dịka mmiri na-ezosa ala n’oge udu mmiri. Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Ifrem? Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Juda?

Ịhụnaanya ụnụ dịka igirigi ụtụtụ, igirigi nke anaghị ewe oge; ọ gbasasịa. Nke a mere m ji si n’ọnụ ndị amụma gburie ha n’ibe n’ibe, ejirila m okwu si m n’ọnụ gbuo ha, amamikpe m achawapụta ka ihè.

Makana ịhụnaanya kwụsiri ike bụ ihe na-amasị m, ọ bụghị aja; ịma Chineke, ọ bụghị aja onyinye nsureọkụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 51:3-4, 18-19, 20-21.

Azịza: Ọ bụ ịkwụdosiike, Ọ bụghị aja ka Onyenweanyị na-achọ.

1. Meere m ebere O Chineke site n’ịhụnaanya gị,

site na nnukwu obi ebere gị hichapụ njọ m niile;

Sachapụ mmehie m niile,

wụchapụ m na njọ. Azịza

2. Ị naghị enwe mmasị ọbụla n’aja,

Aja nsureọkụ anaghị atọ gị ụtọ,

Aja a na-achụrụ Chineke bụ obi gbawara agbawa,

Ị naghị ajụ obi gbawara agbawa na nke loghara elogha. Azịza

3. Site n’obiọma gị meere Zayọn ebere,

rụzie mgbidi Jerusalem.

Mgbe ahụ ị ga-anabata aja a chụrụ n’obi ọcha,

Aja nsureọkụ na ihe nchụ aja niile. Azịza

MBEKU – Ps. 51:12,14.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

Chineke, kenye obi dị ọcha n’ime m, nyeghachikwa m añụrị nke nzọpụta gị.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

OZIỌMA – 18:9-14

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu kọwaara ụfọdụ, bụ ndị na-ewe onwe ha ka ndị eziomume ma hụ ndịọzọ ka ndị ajọomume ụkabụilu a. Ndị nwoke abụọ gara n’ụlọnsọ ikpe ekpere.

Otu n’ime ha bụ onye Farisii, nke ọzọ bụ onye ọnaụtụ, Onye Farisii ahụ guzoro kpesara onwe ya ekpere nke a sị, “Chineke, ekelee m gị na adịghị m ka ndị mmadụ ọzọ, ndị na-azọrọ ihe mmadụ ibe ha n’aka ike, ndị omempụ, ndị ọkwaiko, ma ọ bụkwanụ nke m na-adị ka onye ọnaụtụ a.

Ana m ebu ọnụ ugboro abụọ n’izuụka. Ana m enyekwa otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe niile m kpatara. Onye ọnaụtụ ahụ, nke kwụ n’ebe dị anya, ekweghị ewelite ihu lelie anya n’eluigwe.

Kama ọ na-eti aka n’obi na-asị, “Chineke, meere mụ bụ onye njọ ebere.” Agwa m ụnụ, nwoke a lara n’ụlọ ya bụrụ onye a gụrụ n’onye eziomume karịa onye nke ọzọ. Onye ọbụla buliri onwe ya elu a ga-ebuda ya, ma onye ọbụla budara onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu.

Igbo Mass readings for March 10 2024,

Igbo Mass Readings for March 9 2024, Satọde Izuụka nke Atọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.

Last Update: October 17, 2021