Igbo Readings December 12 2020, Satọdee Izuụka Abụọ n’Oge Adventi

Igbo Readings December 12 2020, Satọdee Izuụka nke Abụọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Igbo Mass Readings December 12 2020, Satọdee Izuụka nke Abụọ n'Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.
Igbo Mass Readings December 12 2020, Satọdee Izuụka nke Abụọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

EKPERE MMEGHE

Dinwenụ, mee ka otito Gị chawapụta iji chụsaa ọchịchịrị nke ndụ anyị. Mgbe Nwa Gị ga-abịa, mee ka amata anyị dịka ụmụ nke ìhè. Site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi.

Ihe Ọgụgụ Nke Mb     48:1-4, 9-11.

Ihe Ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ Sịrak

Oge ahụ ka onye amụma Elaịja ji bilite ka ọkụ na-enwu enwu. Okwu ya na-achawapụta ka ire ọkụ.

O weteere ha ụganị. N’obiịnụọkụ ya, o belatara ọnụọgụgụ ha. Site n’okwu nke Chineke, o mechiri eluigwe mmiri kwụsị izo.

Ugboro atọkwa ka o si n’elu kpọdata ọkụ. Elaịja, Ị dị ebube n’ọrụ ịtụnaanya gị, onye tosịrị ịnya isi dịka ị pụrụ ime?

Gị bụkwa onye ike ikuku nke ọkụ bugoro n’elu; gị onye dị nkwadebe n’oge a kara, dịka akwụkwọ nsọ siri kwuo, ime ka iwe Chineke dajụọ tupu oke amụma ebido;

Hụgharịa obi ndị bụ nna n’ebe ụmụ ha nọ, ma dozie ebo Jekọb niile dịka ha dị na mbụ.

Ngọzi na-adịrị ndị ahụ ga-ahụ gị, ya na ndị nke ahụ ji ịhụnaanya daa n’ụra nke ọnwụ, maka na anyị onwe anyị ga-enwekwa ndụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA: Ps: 80:1-3

Azịza: Chineke nke igwe ndịagha, kpọchigha anyị azụ, mee ka ihu gị chakwasị anyị, ka anyị wee nweta nzọpụta.

1.Gee ntị, onye nche nke Izrel,

Gị onye nọ n’ebe kachasị ihe niile elu,

chawapụta ìhè gị,

were ike gị bịa zọpụta anyị. Azịza.

2. O Chineke nke igwe ndịagha!

Si n’eluigwe ledata anya, ka Ị hụ osisi vaịn a.

Bịa chekwaba mkpụrụ vaịn a

I ji aka gị kụọ. Azịza.

3. Ka aka gị chekwaba nwoke ahụ Ị họọrọ,

onye ahụ Ị nyere ike.

Mgbe ahụ anyị agaghị agbakụta gị azụ ọzọ;

Nye anyị ndụ ka anyị were na-akpọku aha gị. Azịza.

MBEKU

ALLELUỊA ALLELUỊA:

Dozienụ ụzọ nke Onyenweanyị, Meenụ ka ụzọ ya kwụrụ ọtọ.

ALLELUỊA.

Oziọma maka December 12 2020 – Matiu 17:10-13

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.

Ka ha si n’elu ugwu nnwogha ahụ na-arịdata, ndị na-eso ụzọ Jesu jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị odeakwụkwọ ji kwuo na Elaịja eburịrị ụzọ bịa?”

Jesu zara ha sị, ‘N’ezie Elaịja na-abịa imezi ihe niile. Ma ana m agwa ụnụ na Elaịja abịalarịị, ma ha amataghị ya.

Kama ha jiri ya mere ihe masịrị ha. Otu ahụkwa ka ha ga-esi taa Nwa nke mmadụ ahụhụ.

Oge ahụ ka ndị na-eso ụzọ ya ji ghọta na ọ na-ekwu maka Jọn onye na-eme mmirichukwu.

EKPERE NHUNYE

Dinwenụ, mee ka Onyinye nke a anyị ji okwukwe na ịhụnaanya na-ehunyere Gị ghọọrọ anyị aja na-enweghị ngwụcha iji nye Gị otito. Meekwanụ ka ha bụrụ n’ezie Eucharịstịa anyị na nzọpụta anyị. Mezuoro anyị ihe ndị a site na Kristi Dinwenụ, Amen.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ

Chineke Onye ebere, mee ka Eucharịstịa nke a wetara anyị enyemaka Gị, zọpụta anyị na njọ anyị ma kwadokwa anyị maka ọmụmụ nke Onye nzọpụta anyị bụ Dinwenụ ebighị ebi, ebighị ebi.

IHE ỌGỤGỤ ỤNYAHỤ: Igbo Mass Readings December 11 2020, Fraịde Izuụka nke Abụọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

IHE ỌGỤGỤ ECHI:  Igbo Mass Readings December 13 2020, Izu Ụka nke Atọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Igbo Readings December 12 2020, Satọdee Izuụka nke Abụọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings 

error: Content is protected !!
Open chat
1
Catholic Lectionary
Hello 👋
How can I help you?