Igbo Mass Readings for April 13 2024, Satọde Izuụka nke Abụọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings for April 13 2024, Satọde Izuụka nke Abụọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 6:1-7
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi
N’oge a, ka ọnụọgụgụ ndị na-eso ụzọ Jesu na-abawanye, esemokwu dapụtara: ndị Juu ndị a mụrụ na mba, ndị na-asụ asụsụ Grik, tamuru ntamu megide ndị Juu ndị a mụrụ n’ụlọ ndị na-asụ asụsụ Hibru.
Iwe ha bụ na a na-eleghara ụmụnwaanyị ha, ndị di ha nwụrụ anwụ anya n’ihe ndị a na-eke kwa ụbọchị. Ndịozi iri na abụọ ndị ahụ kpọrọ ọgbakọ nke ndị na-eso ụzọ Jesu, gwa ha sị, o zighị ezi na anyị ga-ahapụ ịgbasa oziọma Chineke na-ahụ maka ihe oriri.
Ya bụ ụmụnna n’ime Kristi, họpụtanụ n’etiti ụnụ ụmụnwoke asaa ndị ụnụ tụkwasara obi, jupụtakwara na Mmụọ Nsọ na amamihe, ndị anyị ga-etinye ọrụ a n’aka.
Anyị onwe anyị ga-anọgidesi ike na-ikpe ekpere na n’ikwusa oziọma. Atụmaatụ a masịrị mmadụ niile. Ha họpụtara Stivin, bụ nwoke jupụtara n’okwukwe na Mmụọ Nsọ, na Filip, Prokọrọs, Nikanọ, Timọn, Pamenas, na Nịkọlas onye Antiọk a kpọbatara n’okpukpe ndị Juu.
Ọgbakọ ahụ chere mmadụ asaa ndị a n’ihu ụmụazụ, ụmụazụ kpeere ha ekpere, bikwasa ha aka n’isi. Okwu Chineke wee na-aga n’ihu. Ọnụọgụgụ ndị na-eso ụzọ Jesu na-abawanyekwa nke ukwuu na Jerusalem. Ọtụtụ ndị ụkọchukwu nabatakwara okwukwe nke ndị otu Kristi.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 33:1-2,4-5,18-19.
Azịza: Ka ịhụnaanya gị dị n’ebe anyị nọ, O Chineke ebe nchekwube anyị dị na gị.
1. Tierenụ Chineke mkpu ọñụ ndị eziomume,
n’ihi na otito kwesịrị ndị obi ha kwụ ọtọ.
werenụ ụbọ akwara too Chineke;
werenụ une kụọrọ ya egwu. Azịza
2. N’ihi na okwu nke Onyenweanyị bụ eziokwu.
Ọ na-akwụdosiike n’ọrụ ya niile.
Ọ hụrụ eziomume na ikpe nkwụmọtọ n’anya,
ịhụnaanya ya jupụtara n’ụwa. Azịza
3. Ma lee ka Onyenweanyị si eleta ndị niile na-atụrụ ya egwu anya,
ndị niile tụkwasịrị obi ha n’ịhụnaanya ya,
ka O wee zọpụta mkpụrụobi ha na ụnwụ. Azịza
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
Ebe Chineke mere ka Kristi si n’ọnwụ bilie, Ọ gaghị anwụkwa ọzọ, ọnwụ enweghịkwa ike ọzọ n’ebe ọ nọ.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 6:16-21.
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.
N’oge uhuruchi ndị na-eso ụzọ Jesu gbadatara n’oke osimiri. Ha banyere ụgbọ ịgafe osimiri ije Kapanaum. Mgbe ahụ ọchịchịrị agbaala, ma Jesu abịakwutebeghị ha.
Ebili mmiri tibere n’ihina oke ifufe na-efe. Ha akwọọla ụgbọ ihe dịka maịl atọ ma ọ bụ anọ mgbe ha hụrụ Jesu ka ọ na-aga ije n’elu osimiri, na-abịaru ụgbọ ha nso.
Egwu tụrụ ha. Ma Jesu sịrị ha, “Ọ bụ m, egwu atụla ụnụ Ha nwere obi añụrị ịkpọbata ya n’ime ụgbọ, ma ozigbo ahụ, ụgbọ ha ruru n’ala ebe ha na-aga.
Igbo Mass readings for April 14 2024, Ụka Nke Atọ N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Abụọ
Igbo Mass Readings for April 13 2024, Satọde Izuụka nke Abụọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.