Igbo Mass Readings for January 23 2027, Satọde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 23 2027, Satọde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 9:2-3, 11-14

Ihe Ọgụgụ Ewetara N’akwụkwọozi E Degaara Ndị Hibru

A rụrụ otu ụlọikwu, ebe mpụta ya bụ ebe a na-edobe ihe ọkụ, na okpokoro na achịcha nke a na-eche n’ihu Chineke. A na-akpọ ya, “Ebe dị nsọ” N’azụ akwa mgbochi nke abụọ e nwere otu ụlọikwu ọzọ nke a na-akpọ “Ebe nke kachasị nsọ”.

Ma mgbe Kristi pụtara ka nnukwu ụkọchukwu nke iheọma niile bịaralanụ, site na nnukwu ụlọikwu zuru oke a na-ejighị aka mee; ya bụ nke na-esiteghị n’okike nke ụwa a.

Kristi banyere n’Ebe Nsọ ahụ naanị otu mgbe. O jighị ọbara ewu na nke ụmụ ehi banye, Kama, o jiri ọbara nke ya nwetara anyị nzọpụta ebeebe.

Ọ bụrụ na ifesa ọbara ewu na nke oke ehi na ntụ nwunye ehi na-eme ka ndị merụrụ onwe ha dị ọcha, ọ bụ na ọbara Kristi onye sitere na mmụọ dị ebeebe were onwe ya chụọrọ Chineke aja n’enweghị ntụpọ agaghị asachapụ omume ruru unyi nke akọnuuche ụnụ, ka ụnụ wee fee Chineke dị ndụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 47:1-2, 5-6,7-8.

Azịza: Chineke ji mkpu ọñụ agbago, Onyenweanyị ji olu opiike arigo, kweerenụ Chineke anyị ukwe otito, kweerenụ ya ukwe.

1. Ndị mmadụ niile kụọnụ aka ụnụ,

were mkpu ọñụ tikuo Chineke.

N’ihina Onyenweanyị onye kacha dị elu ka-anyị ga-atụrụ egwu,

ọ bụ nnukwu eze nke na-achị ụwa niile.

Azịza: Chineke ji mkpu ọñụ agbago, Onyenweanyị ji olu opiike arigo, kweerenụ Chineke anyị ukwe otito, kweerenụ ya ukwe.

2. Chineke ji mkpu ọñụ agbago,

Onyenweanyị ji olu opiike arigo.

Kweerenụ Chineke anyị ukwe otito, kweerenụ ya ukwe,

kweerenụ eze anyị ukwe otito, kweerenụ ya ukwe.

Azịza: Chineke ji mkpu ọñụ agbago, Onyenweanyị ji olu opiike arigo, kweerenụ Chineke anyị ukwe otito, kweerenụ ya ukwe.

3. Chineke bụ eze nke ụwa niile,

werenụ ukwe abụọma kweere ya ukwe otito,

Chineke bụ eze na-achị mba niile,

Ọ nọ n’ocheeze ya dị nsọ.

Azịza: Chineke ji mkpu ọñụ agbago, Onyenweanyị ji olu opiike arigo, kweerenụ Chineke anyị ukwe otito, kweerenụ ya ukwe.

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

Okwu Chineke dị ndụ, dị ike, ọ dị nkọ karịa mmaagha ihu abụọ. Ọ na-amịba ruo na njikọ mkpụrụobi na mmụọ, nkwonkwo na ụmịọkpụkpụ. Ọ bụkwa ihe nwere ike nyocha echiche na izu niile nke obi.

Alleluia.

OZIỌMA – 3:20-21

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.

Oke igwe mmadụ zukọkwara ọzọ nke mere na Jesu na ndị na-eso ụzọ ya enweghị ohere ọbụla iri ihe. Mgbe ndị enyi ya nụrụ nke a, ha gara ịkpụpụta ya n’etiti igwe ndị mmadụ ahụ n’ihina ụfọdụ mmadụ amalitela ikwu sị, “Anya adịghị ya mma”.

Igbo Mass Readings for January 24 2027, Ụka nke Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume – Afọ nke Abụọ

Igbo Mass Readings for January 23 2027, Satọde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.