Igbo Mass Readings for January 24 2026, Ncheta Francis de Sales Dị Asọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 24 2026, Ncheta Francis de Sales Dị Asọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:1-4, 11-12, 19, 23-27.

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwụ Abụọ nke Samuel

Mgbe ọnwụ Sọl gachara, Devid siri na mmeri o meriri ndị Amalek lọta, wee nọọ ụbọchị abụọ na Ziklag. N’ụbọchị nke atọ, otu nwoke siri n’ogige agha Sọl lọta. Uwe ya niile dọwara adowa; aja dịkwa n’isi ya. O jekwuru Devid, daa n’ala, kpọọrọ ya isiala.

Devid jụrụ ya, sị, “Olee ebe i si bịa?” Ọ zara sị, “Esiri m, n’ogige agha ndị Izrel gbalaga.” Devid sịrị ya “Gịnị mere? Biko, gwa m.” Nwaokorobịa ahụ sị ya, “Ndị Izrel esila n’ihu agha gbaa ọsọ. E gbukwara ọtụtụ ndịagha Izrel; Sọl na Jonatan nwa ya sokwa na ndị e gburu n’agha.”

Devid wee dọwaa uwe ya n’iwe. Ndị ya na ha nọ mekwara otu ahụ. Ha tiri aka n’obi, ruo ụjụ, buo ọnụ ruo n’abalị n’ihi Sọl, na Jonatan nwa ya, na n’ihi ndị nke Chukwu na ezinụụlọ Izrel maka na ọtụtụ n’ime ha nwụrụ n’agha.

O Izrel, n’elu ugwu gị ka e gburu ebube gi, lee ka ndị dike siri daa! Sọl na Jonatan dị ụtọ, hụrịta onwe ha n’anya. Ha enweeghị nkewa ma na ndụ ma n’ọnwụ.

Ha dị garagara karịa ugo, dịkwa ike karịa ọdụm. Ụmụnwaanyị Izrel, beerenụ Sọl akwa! Onye na-eyiwe ụnụ uwe uhie, na akwa dị mma, Onye na-etinye ọlaedo mara mma n’uwe ụnụ. Lee ka ndị dike siri daa n’ọgbọ agha!

O Jonatan, ọnwụ gị emerụọla m ahụ. Obi agbawaala m n’ihi gị, nwanne m Jonatan: ị dị ụtọ nke ukwuu n’ebe m nọ! Ịhụnaanya ị hụrụ m dị ịtụnaanya. Ọ karịrị ịhụnaanya nwaanyị. Lee ka ndị dike siri daa n’agha! Ngwaagha ha, si otu a laa n’iyi.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 80: 2-3, 5-7. 24:3-21

Azịza: Mee ka ihu gị chakwasa anyị, ka anyị wee nweta nzọpụta

1. Gee ntị, onye nche nke Izrel

Gị onye na-edu Josef dịka igwe atụrụ

Gị onye nọ n’ebe kachasị ihe niile elu, chawapụta ihe gị

N’Ifrem, Benjamin na Manase

Were ike gị bịa zọpụta anyị.

Azịza: Mee ka ihu gị chakwasa anyị, ka anyị wee nweta nzọpụta

2. Chineke nke igwe ndịagha, olee mgbe

Iwe gị n’ebe ekpere ndị nke gị dị ga-ebi?

I werela anya mmiri zụọ anyị nri

Meekwa ka anyị ñụọ ya n’uju dịka mmiri

I meela ka ndị agbataobi anyị na-ese okwu n’ihi anyị

ndịiro anyị na-achị anyị ọchị.

Azịza: Mee ka ihu gị chakwasa anyị, ka anyị wee nweta nzọpụta

MBEKU

Alleluia, Alleluia:              

Okwu Chineke dị ndụ, dị ike, ọ dị nkọ karịa mmaagha ihu abụọ. Ọ na-amịba ruo na njikọ mkpụrụobi na mmụọ, nkwonkwo na ụmịọkpụkpụ. Ọ bụkwa ihe nwere ike nyocha echiche na izu niile nke obi.

Alleluia.

OZIỌMA – 3:20-21

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.

Oke igwe mmadụ zukọkwara ọzọ nke mere na Jesu na ndị na-eso ụzọ ya enweghị ohere ọbụla iri ihe. Mgbe ndị enyi ya nụrụ nke a, ha gara ịkpụpụta ya n’etiti igwe ndị mmadụ ahụ n’ihina ụfọdụ mmadụ amalitela ikwu sị, “Anya adịghị ya mma”.

Igbo Mass Readings for January 25 2026, Ụka nke Atọ n’Oge Adanyeghị n’Emume – Afọ nke Mbụ

Igbo Mass Readings for January 24 2026, Ncheta Francis de Sales Dị Asọ.