Connect with us

Fourth Week in Ordinary Time - Igbo

Igbo Mass Readings for February 3 2024, Satọde Izuụka nke Anọ N’Oge Nkịtị

Published

on

Igbo Mass Readings for February 3 2024, Satọde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 3 2024, Satọde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:4-13

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ Ndịeze nke mbụ

N’otu ụbọchị, Solomọn gara n’ugwu Gibiọn ịchụ aja, n’ihina ọ bụ ebe nchụaja nke kacha elu. Ọ chụọlarịị aja nsureọkụ ruru otu puku ebe ahụ n’oge gara aga.

N’abalị ahụ n’ugwu Gibiọn, Yahweh bịakwuteree ya na nrọ jụọ ya sị “Ole ihe ị chọrọ ka m meere gị” Solomọn zara ya siị, “i gosịrị nna m Devid ịhụnaanya dị ukwu, onye nke bụ nwodibo gị, onye mere iheọma, onye nwere nrubeisi nakwa onye eziokwu.

Advertisement

Ị nọkwa na-egosi ịhụnaanya gị n’ebe ọ nọ site n’inye ya nwa nke nọchiri ya dịka eze. Yahweh, Chineke m, i meela ka m nọchie anya nna m dịka eze, mana aka m bụ nwantakịrị amaghị ka e si achị ọchịchị.

Lee nwodibo gị nọ n’etiti ndị ị họọrọ ka ha bụrụ ndị nke gị, ndị nke apụghị ịgụta ọnụ. Biko nye m amamihe zuru oke nke m ga-eji kpee ikpe nkwụmọtọ, chịa ndị nke gị, ka m wee marakwa ihe dị iche n’etiti iheọma na ihe ọjọọ.

Ọ bụrụ na ọ bụghị otu a, onye nwere ike ịchịkọta ndị nke gị a dị ukwuu? Obi tọrọ Yahweh ụtọ n’ihina Solomọn rịọrọ nke a. O wee sị ya, “Maka na ị rịọrịọ amamihe nke ikpe nkwụmọtọ, karịa ndụ ogologo mọbụ ụba, mọbụ ọnwụ nke ndịiro gị, aga m enyekwa gị ihe ndị ahụ ị rịọrịọ m.

Aga m enye gị amamihe na nghọta karịa nke onye ọbụla ma ugbu a mọbụ n’ọdịniihu. Aga m enyekwa gị ihe ndị nke ị rịọghị m: na ndụ gị niile ịga-enwe akụnụụba, na nsọpụrụ karịa nke eze ọbụla nwere.

Advertisement

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 119:9,10, 11, 12, 13, 14

Azịza: Onyenweanyị, kụziere m iwu gị

1. Kedụ ka nwa okorobịa ga-esi bie ndụ dị ọcha?

Ọ bụ site n’idebe okwu gị. Azịza

2. Eji m obi m niile achọ gị,

Advertisement

Ekwela aka m jehie ụzọ n’iwu gị. Azịza

3. Ejisiri m okwu gị ike n’ime obi m

Ka m wee ghara ime njọ megide gị. Azịza

4. Ngọzi dịrị gị O Onyenweanyị

Advertisement

kụziere m iso ụzọ gị. Azịza

5. Eji m egbugbere ọnụ m,

wee kwupụta iwu niile siri n’ọnụ gị pụta. Azịza

6. Ana m enwe añụrị n’iso iwu gị.

Advertisement

Kama akụnụụba niile nke ụwa a. Azịza

MBEKU

Alleluia, Alleluia:                     

Atụrụ m ga-ege m ntị, Dinwenụ na-ekwu, a mara m ha, ha na eso m.

Alleluia.

Advertisement

OZIỌMA – 6:30-34

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.

Ndị ụmụazụ Jesu lọghachikwutere ya kọọrọ ya ihe niile ha mere na ihe ha kuziri. Ọ sịrị ha, “Bịanụ ka anyị gaa ebe sọ anyị ga-anọ zuru ike nwa oge”.

O kwuru nke a n’ihina ọtụtụ mmadụ na-abịa, na-alakwa, nke mere na ha enweghị ohere ọbụla iri ihe. Ha bara n’ụgbọmmiri, gaa ebe naanị ha ga-anọ. Ọtụtụ mmadụ hụrụ ha ka ha na-apụ matakwa ha.

Ha jiri ọsọ si n’obodo dị icheiche, buru Jesu na ndị ụmụazụ ya ụzọ garuo ebe ha na-aga. Ka Jesu rịdatara n’ụgbọ, ọ hụrụ ọtụtụ igwe mmadụ ka ha gbakọrọ.

Advertisement

O nwere obi ebere n’ebe ha nọ, n’ihina ha dịka atụrụ na-enweghị onye nche. O wee malite ikuziri ha ọtụtụ ihe.

Igbo Mass Readings for February 4 2024, Ụka nke Ise n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ

Igbo Mass Readings for February 3 2024, Satọde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Advertisement

Catholic Lector is the founder of Catholiclectionary.com. I am a Theologian, a commissioned Lector, and Liturgy Minister. I lead the team that operates Catholiclectionary.com which is a Catholic Church-related website that provides you, on daily basis, with the following: (a) Catholic Daily Mass Readings (b) Reflections on the Daily Mass Readings (c) Daily Prayers (d) Catholic Hymns, and (e) Saints of the Day. I and my team work for the collective growth in spiritual lives of all the faithful.

Advertisement

Get Daily Mass Readings through Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.