Igbo Mass Readings for March 1 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for March 1 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 17:1-15

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Sịrak

Yahweh si n’aja kee mmadụ, na ya bụ aja ka Ọ kpọchịghakwara ya. O nyere ndị mmadụ nwankenke oge ha ga-adị ndụ, mana O nyere ha ike n’ebe niile dị n’elu ụwa dị.

O nyere ha ike dịka nke ya, kee ha n’oyiyi nke ya. O mere ka ihe ndịọzọ niile e kere na-atụrụ mmadụ egwu. O mere ka ha na-achị ma anụọhịa ma nnụnụ na-efe efe.

O nyere ha ụzọ nghọta ise, ka o si nye anụ ndịọzọ, bịa nyekwa ha nke isii bụ akọnuuche na nke asaa bụ ililo, nke na-enyere ha aka ịkọwapụta nke ọma ihe ha natara site n’ụzọ nghọta ise ndị a. O nyere ha ire, anya, ntị na uche ha ji eche echiche.

O nyere ha ọmụma na nghọta n’uju gosi ha ihe dị icheiche n’etiti iheọma na ihe ọjọọ. O tinyere ihe nke ya n’ime obi ha ka ha na-ahụ ka ọrụaka ya si buo ibu, maa mma.

Ọ hapụrụ ha ka ha na-ekwupụta otito ya ebeebe, jiri ya na-anya isi ebighịebi. Ha ga na eto aha ya dị nsọ, na-ekwupụtakwa aka ọrụ ya buru ibu. O nyere ha onyinye nke ọmụma were kenye ha oke n’iwu nke ndụ.

Ya na ha gbara ndụ ga-adị ebighjebi, Ọ bịa gosịkwa ha ikpe nkwụmọtọ ya. Anya ha hụrụ ike ya dị ebube, ntị ha nụkwara olu ya dị otito.

Ọ sị ha, “Kpacharanụ anya maka ihe niile ezighị ezi”. O nyere onye ọbụla n’ime ha iwu gbasara ikwu na ibe. Ụzọ ha niile pụtara ihe n’ihu ya, o nweghị nke zoro ezo n’anya ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 103:13-14, 15-16, 17-18

Azịza: Ịhụnaanya nke Onyenweanyị n’ebe ndị na-atụrụ ya egwu, na-adị ọkpụ, ọ na-adị ebeebe.

1. Dịka nna si emere ụmụ ya ebere,

otu ahụ ka Onyenweanyị si emeso ndị na-atụrụ ya egwu.

Ọ mara ihe e ji wee kee anyị,

Ọ na-echeta na anyị bụ ntụ. Azịza

2. Ogologo ndụ mmadụ akarịghị nke ahịhịa,

ọ naghị anọkarị ifuru osisi dị n’ọhịa.

Otu nnukwu ikuku kuo;                         

a gaghị ahụkwa ya ebe a ọzọ. Azịza

3. Ma n’agbanyeghị, ịhụnaanya nke Onyenweanyị

n’ebe ndị na-atụrụ ya egwu nọ, na-adị ọkpụ, ọ na-adị ebeebe

dịka obiọma ya dị n’ebe ụmụụmụ ya nọ,

Ọ na-adịgide oge ọbụla ha na-edobe ọgbụgbandụ ya. Azịza.

MBEKU – Matiu 11:25

Alleluia, Alleluia:

Ana m ekele gị Nna Dinwenụ nke eluigwe na ụwa, n’ihina i kpugheere ụmụntakịrị ihe omimi nke alaeze.

Alleluia.                         

OZIỌMA – 10:13-16

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Ndị mmadụ kpọtaara Jesu ụmụntakịrị ka o metụ ha aka; ma ndị eso ụzọ ya baara ha mba. Ma mgbe Jesu hụrụ ihe ha na-eme, iwe were ya nke ukwuu.

O wee sị ha, “Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m, ụnụ egbochila ha n’ihina Alaeze Chineke bụ nke ndị dị otu a.

N’ezie agwa m ụnụ, onye ọbụla nke na-agaghị anabata Alaeze Chineke dịka nwatakịrị, agaghị aba n’ime ya”. Ma o kuuru ha n’aka ya gọzie ha, bikwasa ha aka n’isi.

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for March 1 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 8, 2022