Igbo Mass Readings for June 1 2024, Satọde Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 1 2024, Satọde Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:17, 20-25

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọozi Jude

Ndị m hụrụ n’anya chetanụ ihe niile ụmụazụ Onyenweanyị Jesu Kristi kwuru na ọ ga-emezu. Ma ndị m hụrụ n’anya jisienụ ike wulie onwe ụnụ elu dịka ụlọ n’ime okwukwe ahụ kacha nsọ ụnụ nwere.

Na ekpekwanụ ekpere n’ike Mmụọ Nsọ. Nọdụnụ n’ịhụnaanya nke Chineke. Na-echenụ ụbọchị Onyenweanyị Jesu Kristi ga-enye anyị ndụ ebighịebi site n’ebere ya.

Meenụ ka ndị ka nwere obi abụọ ghọtazie nke a ọfụma. Zọpụtanụ ụfọdụ site n’igbochi ha ịdanye n’ọkụ. Ụfọdụ ndịọzọ bụ ndị ụnụ ga-eji egwu gosi ebere ma kpọọnụ ihe ọjọọ asị ọ bụladị uwe mmadụ yi n’ahụ nke ihe ọjọọ merụrụ.

Ka otito dịrị onye ahụ pụrụ igbochiri ụnụ ọdịda na onye ahụ nwekwara ike iji añụrị chee ụnụ n’enweghị ntụpọ ọbụla n’ihu ebube ya dị nsọ. Ka otito dịrị Chineke onye nzọpụta anyị.

Ka ịbụ eze niile na ọchịchị niile na ike niile dịrị ya otu ọ dị n’izizi na kịtaa na oge niile na ụwa ebeebe site na Jesu Kristi Onyenweanyị. Amen.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 63:1,2-3,4-5

Azịza: Akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ maka gị, Dinwenụ Chineke m

1. Chineke, ị bụ Chineke m a na m achọ gị,

akpịrị na-akpọ mkpụrụ obi m nkụ maka gị,

anụahụ m na-achọ gị,

dịka ala kpọrọ nkụ, na-enweghị mmiri, Azịza

2. Ọ na-agụ m agụụ ikiri gị n’ebensọ gị

na ịhụ ike na otito gị.

Ịhụnaanya gị ka mma karịa ndụ n’onwe ya,

ọnụ m ga-ekwupụta otito gị. Azịza

3. Aga m eto gị na ndụ m niile

n’aha gị aga m achili aka m elu;

Mkpụrụobi m ga-enwe nnukwu oriri,

Egwu ọñụ ga-adị n’egbugbere ọnụ m,

otito ga-adị n’ọnụ m. Azịza

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

Ka obi m nọgide n’iwu gị, kụziere m ụzọ gị, O Onyenweanyị.

Alleluia.

OZIỌMA – 11:27-33

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Jesu na ndị na-eso ụzọ ya laghachiri azụ na Jerusalem, ka Jesu na agagharị n’ime ụlọnsọ, ndị isi nchụaja, ndị odeakwụkwọ, na ndị okenye bịakwutere ya, sị ya, “Kedụ ụdị ike i ji eme ihe ndị a, ọ bụ onye nyere gị ike ime ha?”

Jesu sịrị ha, “Aga m ajụ ụnụ otu ajụjụ, ọ bụrụ na ụnụ zaa m ya, aga m agwa ụnụ ike m ji eme ihe ndị a. Ike Jọn nwere ime Mmirichukwu, o si n’eluigwe ka o sitere n’aka mmadụ?

Zaanụ m ya! Ha bidoro na-agbagha n’etiti onwe ha sị, “Ọ bụrụ na anyị sị na o sitere n’eluigwe ọ ga-ajụ anyị sị: “Gịnịkwanụ mere ụnụ ejighị kwenye n’ozi ya?

Ma ọ bụrụ na anyị asị na o si n’aka mmadụ…” Ha na-atụ egwu ndị mmadụ n’ihina mmadụ niile kwetara na Jọn bụ onye amụma n’eziokwu.

Ya mere ha zara Jesu sị, “Anyị amaghị”. Jesu wee gwa ha sị, “Mụ onwe m agaghịkwa agwa ụnụ ụdị ike m ji arụ ihe ndị a.

Igbo Mass Readings for June 2 2024, Ụka Ahụ na Ọbara Kristi – Afọ nke Abụọ

Igbo Mass Readings for June 1 2024, Satọde Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 9, 2022