Connect with us

Igbo Mass Readings

Igbo Mass Readings for September 9 2023, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Nkịtị

Published

on

Igbo Mass Readings for September 9 2023, Satọde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 9 2023, Satọde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:21-23

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Kolosi

Ụnụ ndị e wepụrụ n’ịhụnaanya Chineke na mbụ, na ndị nwere obi ọjọọ, na-eme ihe ọjọọ, ka o jirila ahụ ya ugbu a mee ka ụnụ na ya dịkwa na mma ọzọ site n’ ọnwụ ya.

O mere nke a iji mee ka ụnụ dị nsọ, zukwaa oke n’enweghị ntụpọ n’ihu ya. Ọ bụrụkwa na ụnụ ga-anọgide n’okwukwe, kwụsie ike, n’enweghị nkolopu n’ahapụghị nchekwube nke oziọma ahụ ụnụ nụrụ, nke e kwusaara ihe niile e kere eke n’okpuru anyanwụ nke mụ onwe m bụ Pọl bụụrụ onyeozi ya.

Advertisement

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 54: 3-4, 6, 8

Azịza: Chineke n’onwe ya bụ enyemaka m

1. Chineke, zọpụta m n’ihi aha gị.

Si n’ike Gị hụ na e nyere m ikpe nkwụmọtọ

Chineke nụrụ ekpere m;

Advertisement

gee ntị n’ihe m na-ekwu! Azịza

2. Ma ugbu a Chineke n’onwe ya na-abịa ịzọpụta m

Onyenweanyị bụ Onye na-echekwaba ndụ m

Aga m eji obi añụrị chụọrọ gị aja

Advertisement

tookwa aha gị nke jupụtara n’obiọma. Azịza

MBEKU – Ps. 119:34

Alleluia, Alleluia:         

Nye m nghọta ka m wee mata iwu gị, wee nwee ike iji obi m niile dobe iwu gị.

Alleluia

Advertisement

OZIỌMA – 6:1-5

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

N’otu ụbọchị Sabat, ka Jesu si n’ubi ọka na-agafe, ndị na-eso ụzọ ya ghọọrọ ogbe ọka ụfọdụ, nworo mkpụrụ ha na-ata.

Ma ụfọdụ ndị Farisii jụrụ ha sị, “Gịnị mere ụnụ ji eme ihe megide iwu n’ụbọchị izuike?” Jesu zara ha sị, “Ọ bụ na ụnụ agụbeghị ihe Devid mere oge agụụ gụrụ ya, ya na ndị ya na ha so.

Otu o siri banye n’ụlọ Chineke, were ogbe achịcha a na-eche n’ihu Chineke rie, nyetụkwa ndị ya na ha so, ọ bụ ezie na o zighị ezi n’iwu ka onye ọbụla rie ya ma ọ bụghị onye ụkọchukwu.”

Advertisement

Jesu wee sị ha, “Nwa nke mmadụ bụ onye nwe ụbọchị Sabat.”

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for September 9 2023, Satọde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Catholic Lector is the founder of Catholiclectionary.com. I am a Theologian, a commissioned Lector, and Liturgy Minister. I lead the team that operates Catholiclectionary.com which is a Catholic Church-related website that provides you, on daily basis, with the following: (a) Catholic Daily Mass Readings (b) Reflections on the Daily Mass Readings (c) Daily Prayers (d) Catholic Hymns, and (e) Saints of the Day. I and my team work for the collective growth in spiritual lives of all the faithful.

Advertisement

Get Daily Mass Readings through Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.