Igbo Mass Readings for September 20 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 20 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 6:13-16

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi mbụ Pọl degaara Timoti

N’ihu Chineke onye na-enye ihe niile ndụ na n’ihu Jesu Kristi, onye gbara akaebe banyere ezi nkwupụta ahụ n’ihu Pọntus Paịlet.

Ana m enye gị iwu ka I dobe ihe ahụ e nyere n’iwu! Ekwela ka ọ gbaa mpe! Enwekwala ntụpọ ọbụla ruo ụbọchị Onyenweanyị Jesu Kristi ga-apụta ihe.

Nke a ga-emezu mgbe oge zuru site n’ike Chineke, Onye naanị ya dị ngọzi, Onye naanị ya na-achị ụwa niile, Eze nke ndịeze, Dinwenụ nke ndị nwe mmadụ, Onye naanị ya bụ anwụanwụ, Onye bi n’ime ihe nke mmadụ na-apụghị ịbịaru nso, Onye anya mmadụ ahụbeghị, mọbụ nwee ike ịhụ. Ka nsọpụrụ na ọchịchị ebighịebi dịrị ya, Amen!

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 100: 2, 3, 4, 5

Azịza: Werenụ iti mkpu ọñụ bịa n’ihu nke Onyenweanyị

1. Ụwa niile tijerenụ Onyenweanyị mkpu ọñụ

Werenụ iti mkpu ọnụ bịa n’ihu ya.

Azịza: Werenụ iti mkpu ọñụ bịa n’ihu nke Onyenweanyị

2. Maranụ na Ọnyenweanyị bụ Chineke,

Ya kere anyị, ọ bụkwa ya nwe anyị,

Anyị bụ ndị nke ya; anyị bụkwa igwe atụrụ ya.

Azịza: Werenụ iti mkpu ọñụ bịa n’ihu nke Onyenweanyị

3. Werenụ ekele baa n’ọnụụzọ ama ya niile,

Werenụ otito baa n’ogige ya niile;

Kelenụ ya, gọziekwanụ aha ya.

Azịza: Werenụ iti mkpu ọñụ bịa n’ihu nke Onyenweanyị

4. N’ihina Onyenweanyị dị mma,

Ịhụnaanya ya na-adị ebeebe,

Ntụkwasịobi ya na-adịgide

bido na-ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ.

Azịza: Werenụ iti mkpu ọñụ bịa n’ihu nke Onyenweanyị

MBEKU – 1 Jọn 2:5

Alleluia, Alleluia:

Onye ọbụla nke na-edobe okwu nke Jesu Kristi, n’ezie ịhụnaanya maka Chineke zuru oke n’ime ya.

Alleluia                                   

OZIỌMA – 8:4-15

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Mgbe igwe mmadụ siri n’obodo dị icheiche bịakwute Jesu O jiri ụkabụilu gwa ha okwu sị, “Ọgha mkpụrụ pụrụ ka ọ ghaa mkpụrụ n’ubi ya, mgbe ọ na-agha ụfọdụ dara n’okporo ụzọ, ndị mmadụ wee zọọ ha ụkwụ, ụmụnnụnụ atụtụrịa ha.

Ụfọdụ dara n’ala okwute, ma mgbe ha na-eto ha kpọnwụrụ, n’ihina ha enwetaghị mmiri. Ụfọdụ dara n’etiti ogwu, ogwu esoro ha pụọ, kpagbuo ha.

Ma ụfọdụ dara n’ala dị mma, topụta, mịa mkpụrụ narị mmaji.” Ka o kwuchara nke a, ọ sịrị, “onye nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”

Mgbe ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ihe ụkabụilu a pụtara, Ọ zara ha sị, “Ọ bụ ụnụ ka e nyere amara ihe omimi nke alaeze Chineke ma a na-agwa ndị ọzọ okwu site n’ụkabụilu, ka o wee bụrụ na ha ga-ahụ ghara ịghọta, na ha ga-anụ ghara ịghọta.”

Ugbu a ihe ụkabụilu ahụ pụtara bụ nke a: mkpụrụ ahụ a ghara bụ okwu Chineke. Mkpụrụ ndị dara n’okporo ụzọ bụ ndị nụrụ okwu ahụ.

Ka e mechara ekwensu bịara wepụ ya n’obi ha, ka ha ghara ikwere ma nwetakwa nzọpụta. Mkpụrụ ndị dara n’ala okwute bụ ndị nụrụ okwu ahụ, were ọñụ nara ya, ma n’ihina okwu ahụ agbaghị mgbọrọgwụ n’ime ha, ha kwenyere nwa oge, ma mgbe ọnwụnwa bịara, ha adapụ.

Mkpụrụ ndị dara n’etiti ogwu, bụ ndị nụrụ okwu Chineke, ma mgbe ha na-aga n’ụzọ, nchegbu na akụ na ihe ụtọ nke ndụ a kpagburu ha; ha amịtaghị mkpụrụ.

Ma maka mkpụrụ dara n’ala dị mma, ha bụ ndị nụrụ okwu Chineke, were ikwesị ntụkwasịobi na obi dị mma jidesie ya ike, werekwa ndidi mịpụta mkpụrụ.

Igbo Mass Readings for September 21 2025, Ụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume – Afọ nke Atọ

Igbo Mass Readings for September 20 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.