Igbo Mass Readings for October 12 2024, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 12 2024, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:22-29

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl degaara ndị Galeshịa.

Mana Akwụkwọ Nsọ edobela ihe niile n’okpuru njọ ka e wee nye ndị kwere ekwe nkwa ahụ e kwere ha n’ime Jesu Kristi.

Ugbu a, tupu okwukwe abịa, anyị niile nọ n’okpuru iwu, a machibidoro anyị niile ruo mgbe a ga-ekpughere anyị okwukwe.

Ya bụ na iwu ahụ bụ onye nlekọta anyị ruo mgbe Kristi bịara, ka e wee gụnye anyị na ndị eziomume site n’okwukwe.

Mana ugbu a okwukwe bịara, anyị anọghịkwa n’okpuru onye nlekọta ahụ bụ iwu; n’ihina n’ime Jesu Kristi ụnụ niile bụ ụmụ Chineke site n’okwukwe.

Ka ụnụ niile ha, bụ ndị e mere mmirichukwu n’ime Kristi eyikwasala Kristi dịka uwe.

Nkewa nke na-adịbu n’etiti ndị Juu na ndị Grik, n’etiti ndị ohu na ndị nwe onwe ha, n’etiti ụmụnwoke na ụmụnwaanyị, apụghị ịchịkwa ọzọ n’ihina ụnụ niile bụ otu n’ime Jesu Kristi.

Ọ bụrụ na ụnụ bụ ndị nke Kristi ụnụ bụkwa ụmụ Abraham ndị ga-eketa ihe e kwere na nkwa.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 105: 2-3, 4-5, 6-7

Azịza: Onyenweanyị ga-echeta ọgbụgbandụ ya ebighịebi ebighịebi.

1. Kweerenụ ya ukwe kụọrọnụ ya egwu

Kwupụtanụ ọrụ ịtụnanya ya niile!

Nwebenụ añụrị n’aha nsọ ya

Ka obi niile na-achọ Chineke ñụrịa. Azịza.

2. Chọbanụ Onyenweanyị na ike ya

Chọbanụ ihu nke Onyenweanyị mgbe niile

Chetanụ ọrụ ebube niile ọ rụrụ

ọrụ ịtụnanya ya niile na ikpe niile si n’ọnụ ya pụta. Azịza.

3. Ụnụ ụmụ Abraham bụ nwodibo ya

ụmụ Jekọb bụ onye nke ọ họọrọ!

Ọ bụ ya bụ Onyenweanyị na Chineke anyị

Ike ọchịchị ya gazuru ụwa niile. Azịza.

MBEKU – Luk 8:15

Alleluịa, Alleluịa:

Ha nwere isi ọma bụ ndị nụrụ okwu Chineke, were ikwesi ntụkwasịobi na obi dị mma jidesie ya ike, werekwa ndidi mịpụta mkpụrụ.

Alleluịa.

OZIỌMA – 11:27-28

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Mgbe Jesu na-ekwu okwu ndị a, otu nwaanyị si n’etiti igwe mmadụ ahụ welie olu sị, “Ngọzi na-adịrị afọ nke mụrụ gị na ara Ị ñụrụ!”

Ma Jesu zara sị, “Ngọzi na-adịrị ha karịa, bụ ndị nụrụ okwu Chineke dobekwa ya!”

Igbo Mass Readings for October 13 2024, Ụka nke Iri Abụọ na Asatọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ

Igbo Mass Readings for October 12 2024, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: October 22, 2020