Igbo Mass Readings for October 19 2024, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 19 2024, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:15-23
Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl degaara ndị Efesọs.
N’ihi nke a, mgbe m nụrụ banyere okwukwe ụnụ nwere n’ime Dinwenụ anyị Jesu Kristi na ịhụnaanya ụnụ nwere n’ebe ndị nsọ niile nọ, ewepụghị m aka n’ikele Chineke banyere ụnụ.
Ana m echeta ụnụ n’ekpere. Ka Chineke nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi, Nna nke otito, nye ụnụ mmụọ nke amamiihe na nke mkpughe iji mata ya.
Ana m arịọkwa ka Chineke meghee anya nke obi ụnụ, ka ụnụ wee mata ihe bụ nchekwube nke ọkpụkpọ ọ kpọrọ ụnụ, na ihe bụ akụ nke nketa ahụ dị ebube n’etiti ndị nsọ ya; na ihe bụ ịdị ukwu na-enweghị atụ nke ike ya n’ime anyị, bụ ndị kwere ekwe, dịka ọrụ nke ike aka ya siri dị.
Nke a bụ nke o mejupụtara n’ime Kristi mgbe o siri n’ọnwụ kulie ya, mekwaa ka ọ nọrọ n’aka nri ya n’alaeze eluigwe, ka ọ nọdụ n’ebe dị elu karịchaa ọchịchị niile na ike niile na ịbụ isi niile, bịa dịkwa elu karịa aha ọbụla a marala, ọ bụghị naanị n’ọgbọ nke a, kama ma ọgbọ nke ga-abịanụ.
Chineke edobekwala ihe niile n’okpuru ụkwụ ya, mekwaa ya isi ihe niile maka nzukọ ya, nke bụ ahụ ya, na uju nke onye ahụ na-emezu ihe niile jupụtara ihe niile.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 8:1-2, 3-4, 5-6.
Azịza: I mere nwa gị nnaukwu ihe niile e kere eke.
1. Onyenweanyị Chineke anyị,
lee ka aha gị siri dị elu n’ụwa niile,
Ị buligo ebube gị elu karịa eluigwe.
Ụmụaka na ndị e ku n’aka na-ekwe ukwe ebube gị
Ị na-akwụsi ike n’ebe ndịiro gị nọ. Azịza.
2. M lee anya n’eluigwe i ji aka gị mee
ya na ọnwa na kpakpando i kere;
gịnị ka mmadụ bụ i ji eche echiche banyere ya
nwa nke mmadụ na ị na-eleta ya anya? Azịza.
3. N’agbanyeghị i mere ka o jiri obere ihe karịa ndị mmụọọma nta,
I jikwa ugwu na nsọpụrụ chọọ ya mma dịka okpueze
I mere ya nnaukwu ihe niile e kere eke
were ihe niile dobe n’okpuru ya. Azịza.
MBEKU – 1 Jọn 2:5
Alleluịa, Alleluịa:
Onye ọbụla nke na-edobe okwu ya, n’ezi, ịhụnaanya maka Chineke zuru oke n’ime ya.
Alleluịa.
OZIỌMA – 12:8-12
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Agwa m ụnụ, onye ọbụla na-ekwupụta m n’ihu ndị mmadụ ka Nwa nke mmadụ ahụ ga-ekwupụta n’ihu ndị mmụọọma nke Chineke, ma onye ahụ nke na-agọnahụ m n’ihu ndị mmadụ, ka a ga-agọnahụ n’ihu ndị mmụọọma nke Chineke.
Onye ọbụla na-ekwu okwu megide Nwa nke mmadụ ahụ, a ga-agbaghara ya, ma a gaghị agbaghara onye ọbụla nke na-ekwutọ Mmụọ Nsọ.”
Mgbe ha kpụpụtara ụnụ n’ihu ụlọnzukọ ndị ọchịchị na ndịisi, ụnụ echegbula onwe ụnụ otu ụnụ ga-esi, mọbụ ihe ụnụ ga-aza, mọbụ ihe ụnụ ga-ekwu; n’ihina Mmụọ Nsọ ga-akụziri ụnụ n’oge ahụ ihe ụnụ kwesịrị ikwu.”
Igbo Mass Readings for October 19 2024, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.