Igbo Mass Readings for September 16 2023, Satọde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 16 2023, Satọde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1: 15-17
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi mbụ Pọl degaara Timoti
Okwu a kwesịrị ntụkwasịobi, kwesịkwa ka a mara ya nke ọma n’ụzọ ọbụla na Jesu Kristi bịara n’ụwa ka ọ zọpụta ndị njọ nke mụ onwe m bụ onyeisi ha.
Ọ bụ n’ihi nke a ka Chineke ji meere m ebere. O mere ka Jesu Kristi site n’ụzọ o si meso m, bụ onyeisi ndị njọ, gosi ogologo ntachi obi, O nwere n’ebe ndị njọ niile nọ.
O mekwara nke a ka ọ bụrụ ihe ịmaatụ nye ndị niile ga-ekwere na ya, bụ ndị na-achọ inweta ndụ ebeebe.
Ka otito na nsọpụrụ dịrị Chineke bụ Eze nke mgbe niile, onye na-adịghị anwụ anwụ, nke a naghị ahụ anya, onye sọ ya bụ Chineke ruo mgbe ebighị ebi! Amen.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 113: 1-2, 3-4, 3-4, 5, 6-7
Azịza: Ngọzi dịrị aha nke Onyenweanyị ruo mgbe ebighịebi. Alleluia
1. Too, ụmụodibo nke Chineke
too aha nke Onyenweanyị
Ngọzi dịrị aha nke Chineke
Bido ugbu a ruo mgbe ebighịebi. Azịza
2. Bido n’ọwụwa anyanwụ ruo n’ọdịda ya,
otito dịrị aha nke Osebụrụwa
Onyenweanyị dị elu karịcha ụwa niile
Otito ya karịchakwara eluigwe niile. Azịza
3. Onye dịka Onyenweanyị bụ Chineke anyị?
Ocheeze ya dị n’elu
Mana ọ na-eledata anya n’eluigwe na ụwa.
Ọ na-esi n’aja ebuli ndị ogbenye,
ọ na-esikwa na ntụ ewelite ndị enweghị ka ọ dị ha. Azịza
MBEKU – 1 Pita 1:25
Alleluia, Alleluia:
Okwu nke Onyenweanyị ga-adịgide ruo mgbe ebighịebi. Okwu a bụkwa oziọma ahụ nke a gbaara ụnụ.
Alleluia
OZIỌMA – 6: 43-49
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Osisi ọma anaghị amị mkpụrụ ọjọọ. Ọzọkwa osisi ọjọọ anaghị amị mkpụrụ ọma. Maka na a na-amata osisi ọbụla site na mkpụrụ ya.
N’ihina a naghịkwa aghọta ụdara n’osisi ogwu; a naghịkwa aghọta ụtụ n’osisi uke. Ezigbo mmadụ na-esite n’iheọma jupụtara ya obi na-eme iheọma, ma ajọ mmadụ, site n’ihe ọjọọ juru ya ahụ na-eme ihe ọjọọ, n’ihina site n’ọnụ ka e ji ekwupụta ihe juru n’obi.
Gịnị mere ụnụ ji akpọ m Dinwenụ m, Dinwenụ m, ma ụnụ anaghị eme ihe m gwara ụnụ? Onye ọbụla nke na-abịakwute m, na-anụ okwu m, ma na-emekwa ha, aga m ezi ụnụ ihe onye ahụ dịka ya.
Ọ dị ka otu nwoke wuru ụlọ, nke gwuru ala gwubaa ya n’ime, tọọ ntọala ya n’elu nkume; ma mgbe idemmiri bịara, mmiri ahụ wụkwasara ụlọ ahụ, ma ọ kwadalịghị ya, n’ihina e wuru ya nke ọma.
Ma onye na anụ okwu m niile na-anaghị eme ha dịka nwoke wuru ụlọ n’elu uzuzu na-atọghị ntọala, e mechaa mmiri iyi asọkwasa ya, ozigbo ụlọ ahụ wee daa, ọdịda ya dị egwu.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.