Igbo Mass Readings for September 27 2025, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 27 2025, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:5-9, 14-15
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Onye Amụma Zecharịa
Ka m weliri anya m elu, ahụrụ m nwoke ji eriri e ji atụ ihe n’aka ya. Ajụrụ m ya sị, “Kedụ ebe ị na-aga?” Ọ zara m sị: “Ana m aga ịtụ Jerusalem mara ka ogologo ya na uhie ya ha.
Mgbe ahụ ka mmụọọma nke na-agwa m okwu pụbara, mmụọọma ọzọ zutere ya. Ọ sịri ya, “Gbaa ọsọ ka ị gwa nwokorobịa ahụ nke a, agaghị ejikwa mgbidi gbaa Jerusalem gburugburu n’ihi ụba mmadụ na ehi nke nọ n’ime ya.’
N’ihina mụ onwe m bụ Yahweh na-ekwu ‘aga m abụ mgbidi nke ọkụ gbaa ya gburugburu, ebube m ga-adịkwa n’ime ya.” Kwee ukwe ọñụ, nwaada Zayọn, n’ihina ugbu a ana m abịa ibinyere ụnụ.”
Ọ bụ Yahweh na-ekwu. N’ụbọchị ahụ ọtụtụ mba ga-echegharị, bịakwute Yahweh. Ee, ha ga-abụ ndị nke ya.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Jer 31: 10, 11-12, 13
Azịza: Onyenweanyị ga-echekwa anyị dịka onye ncheatụrụ si echekwaba igwe atụrụ ya.
1. Geenụ ntị n’okwu nke Yahweh, ụnụ mba niile
Meenụ ka a nụ ya n’ụwa niile,
Kwuonị sị na onye nke kposara Izrel,
Ga-ekpokọtakwa ya ọnụ ọzọ
ọ ga-echekwa ya
dịka onye ncheatụrụ si echekwaba igwe atụrụ ya.
Azịza: Onyenweanyị ga-echekwa anyị dịka onye ncheatụrụ si echekwaba igwe atụrụ ya.
2. Maka na Yahweh agbapụtala Jekọb,
Mee ka o nwere onwe ya n’aka ndị na-akpagbu ya
Ha ga-abịa bụọ abụ na-adasi ụda ike n’elu Zayọn
Ha ga na-egbuke site n’afọọma na ịmamma Chineke.
Azịza: Onyenweanyị ga-echekwa anyị dịka onye ncheatụrụ si echekwaba igwe atụrụ ya.
3. Mgbe ahụ ụmụagbọghọ ga-agba egwu ọñụ,
ụmụokorobịa na ndị okenye ga-ejupụtakwa n’añụrị
Aga m agbanwe iru uju ha ma ma mee ka ha nwee añụrị,
Aga m atasị ha obi were obi añụrị gbanwee ahụhụ ha.
Azịza: Onyenweanyị ga-echekwa anyị dịka onye ncheatụrụ si echekwaba igwe atụrụ ya.
MBEKU – Eph 1:17-18
Alleluịa, Alleluịa:
Ka Chineke nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi meghee anya nke obi ụnụ ka ụnụ wee mata ihe bụ nchekwube nke ọkpụkpọ ọ kpọrọ ụnụ.
Alleluịa.
OZIỌMA – 9:43-45
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Ma ka ndị na-eso ụzọ ya nọ na-eche gbasara ọrụ ịtụnanya Ọ rụrụ, Jesu gwara ha sị, “Ka okwu ndị a baa ụnụ n’ime ntị: N’ihina a ga-arara Nwa nke mmadụ nye n’aka ndị mmadụ.”
Ma ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị okwu a, e zonarịrị ha ya, ka ha ghara ịghọta ya, egwu jikwa ha ịjụ ya maka okwu a.
Igbo Mass Readings for September 27 2025, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.