Igbo Mass Readings for November 18 2023, Satọde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 18 2023, Satọde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 18:14-16; 19:6-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Amamihe
Mgbe ihe niile dajụrụ n’etiti abalị, okwu gị jupụtara n’ike si n’ocheeze gị dị n’eluigwe gbadata n’ala ahụ a bụrụ ọnụ. Ọ bịara ka onye agha dị njikere ịmalite ọgụ.
Onye ji iwu gị kwụ ọtọ ka mma gha dị nkọ. O jiri ụkwụ abụọ kwụrụ n’ala, isi ya na-emetụ urukpu, o mere ka ozu mmadụ jupụta ụwa. Iji chekwaba ndị nke gị n’ebe ihe nsogbu niile dị, ihe niile i kere gbanworo site n’iwu i nyere.
Urukpu kpuchigidere ogige ebe ha bi, ala akọrọ pụtara n’ebe mmiri juburu; osimiri uhie e wee nwee okporo ụzọ n’etiti ya. Osimiri ahụ na-ejupụta n’oke ebili mmiri a bụrụzie ala puru ahịhịa.
Site na nchedo nke aka gị, ha gafere dịka otu obodo, oge ha hụchara ọrụ ebube ahụ. Ha na-enwerị añụrị ka ịnyịnya ndị na-akpa nri, na-awụli elu ka ụmụ atụrụ, ha na-eto gị O Yahweh, Onye zọpụtara ha.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 105: 2-3, 36-37, 42-43
Azịza: Chetanụ ọrụ ebube niile Chineke rụrụ.
1. Kweerenụ ya ukwe, kụọrọnụ ya egwu,
Kwupụtanụ ọrụ ịtụnaanya ya niile,
Nwebenụ añụrị n’aha nsọ ya
ka obi niile na-achọ Chineke ñụrịa. Azịza
2. O gburu dịọkpara niile nọ n’ala ha
Mkpụrụ mbụ niile ike ha wetara
Mgbe ahụ o jiri ọlaọcha na ọlaedo wee dupu Izrel,
O nweghịdị otu onye nke ọ hapụrụ n’azụ. Azịza
3. N’ihina o chetara nkwa ya dị nsọ,
nke o nyere nwodibo ya bụ Abraham,
O ji ọñụ duru ndị nke ya aga,
O ji ukwe edu ndị ọhọọrọ. Azịza
MBEKU – Ps. 25: 4, 5.
Alleluịa, Alleluịa:
Kụziere m ụzọ gị, Onyenweanyị, dube m n’ụzọ eziokwu gị.
Alleluịa.
OZIỌMA – 18:1-8
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu gwara ha ụkabụilu iji kuziere ha na ọ dị mkpa ka ha nọgide n’ekpere mgbe niile, ghara ịda mba.
Ọ gwara ha sị: “N’otu obodo, e nwere otu onye ọkaikpe nke na-anaghị atụrụ Chineke egwu, nke ọ na-asọpụrụ mmadụ ibe ya.
E nwekwara otu nwaanyị isimkpe bikwa n’obodo ahụ, onye na-abịakwute ọkaikpe a kwa mgbe kwa mgbe, na-arịọ ya sị, ‘kpepụta m n’aka onye iro m.’
Na mbụ onye ọkaikpe a achọghị ịnụ arịrịọ nwaanyị a. Ma o mesịrị tụgharịa obi sị, ‘Ọ bụ eziokwu na adịghị m atụ egwu Chineke, adịghị m asọpụrụ mmadụ, ma n’ihi nsogbu nwaanyị isimkpe a na-enye m, aga m ekpepụta ya.
Ọ bụrụ na m emeghị otu a, ọ ga-abịagide na-esogbu m, agaghị m ezuru ya ike.’” Onyenweanyị kwukwara sị, “Nụrụnụ ihe onye ọkaikpe a, nke na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi kwuru.
Ọ bụ na Chineke agaghị ekpepụta onye nke ya, onye na-akpọku ya ehihie na abalị? Ọ ga-egbu oge tupu ọ zọpụta ha?
Agwa m ụnụ, Ọ ga-ekpepụta ha ọsọọsọ. Ka o sila dị, mgbe nwa nke mmadụ ga-abịa Ọ ga-enwetekwa ndị nwere okwukwe n’elu ụwa?”