Connect with us

Igbo Mass Readings

Igbo Mass Readings for December 2 2023, Satọde Izuụka nke Iri Atọ na Anọ N’Oge Nkịtị

Published

on

Igbo Mass Readings for December 2 2023, Satọde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for December 2 2023, Satọde Izuụka nke Iri Atọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:15-27

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Daniel

Maka ọhụ nke a m hụrụ, mụ bụ Daniel anọghịzi otu ebe, ụjọ na-atụkwa m. Ejekwuru m otu onye n’ime ndị kwụ ebe ahụ wee jụọ ya ihe ndị a pụtara.

Ọ kọwaara m ha sị, “Anụọhịa anọ ndị a ị hụrụ nọchiri anya ndịeze anọ ga-achị ụwa n’oge dị n’ihu. Ma n’oge ikpeazụ ọ bụ ndị nsọ nke onye kachasị elu ga-achị ụwa niile ruo mgbe ebighịebi.”

Advertisement

Mgbe ahụ ọ masịrị m ịmata ihe gbasaara anụọhịa nke anọ ahụ, nke pụrụ iche n’ebe ndịọzọ nọ, na-eyi egwu, nweekwa eze igwe na mbọ yiri nke e ji ọlaọkụ kpụọ, nke ahụ na-adọgbu, na-eri ma na azọpịachakwa ndị fọdụrụ afọdụ.

Agwakwara m ya ka ọ kọwaara m ihe mpi iri ahụ dị ya n’isi pụtara, na ihe mere otu obere mpi ahụ jiri pụta nyakapụ mpi atọ n’ime ndị dịbu mbụ, na ihe mere o jiri nwee anya na ọnụ jupụtara na nganga ma dịkwa ka ọ dị ike karịa ndịọzọ.

Ka m na-ele anya, mpi a lụsoro ndị nsọ ọgụ, meriekwa ha, ruo mgbe onye ahụ dị site na mbụ jiri ikpe nkwụmọtọ bịa zọpụta ndị nsọ nke onye kachasị elu, wee nyefee ha alaeze n’aka.

Onye ahụ zara m sị, “Gbasaara anụọhịa nke anọ ahụ, a ga-enwe alaeze nke anọ n’ụwa. Ọ ga-adị iche na alaeze ndịọzọ. Ọ ga alụso ihe niile dị n’ụwa agha, si otu ahụ mebie ihe ọbụla o jiri anya ya hụ.

Advertisement

Mpi iri ahụ nọchiri anya ndịeze iri ga-esi n’alaeze ahụ wee pụta. Mgbe ndịeze iri ahụ ga na-achị, eze ọzọ nke ga-adị iche n’etiti ndịọzọ ga-apụta, ọ ga-akwatukwa eze atọ wee pụta.

Ọ ga-ekwu okwu ọjọọ kwugide Onyekachasielu. Ọ ga-emekpa ndị nsọ nke Onyekachasielu ahụ. Ọ ga-achọ ịgbanwe iwu niile na omenala niile. Ọ ga-eji ndị nke Chineke niile mee ihe ọbụla ọ chọrọ afọ atọ na ọkara.

Ma n’ikpeazụ a ga-ekpe ya ikpe, napụ ya ọchịchị ya, weta ya na njedebe ma laakwa ya n’iyi ebeebe. Mgbe ahụ, a ga-enyefe ọchịchị niile, na ịdị ike niile nke alaeze niile dị n’okpuru eluigwe n’aka ndị nsọ nke Onyeka-chasielu.

Alaeze ha agaghị enwe njedebe. Ọchịchị niile ga-agbara ha odibo rubekwara ha isi.

Advertisement

ABỤỌMA NA AZỊZA – Dan 3: 82, 83, 84, 85, 86, 87

Azịza: Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.

1. Ụmụ mmadụ niile gọzienụ Yahweh,

Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe. Aziza

2. Izrel gọzie Yahweh

Advertisement

Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe. Azịza

3. Ndị ụkọchukwu gọzienụ Yahweh

Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe. Azịza

4. Ụmụodibo niile nke Yahweh gọzienụ Yahweh

Advertisement

Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe. Azịza

5. Mmụọ na mkpụrụobi ndị eziomume niile gọzienụ Yahweh.

Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe. Azịza

6. Ndị niile dị umeala dịkwa ọcha n’obi gọzienụ Yahweh.

Advertisement

Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe. Azịza

MBEKU – Luk 21:36.

Alleluịa, Alleluịa:

Nọdụnụ na nche; na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile ka ụnụ nwee ike iguzo n’ihu nwa nke mmadụ ahụ.

Alleluịa.

Advertisement

OZIỌMA – 21:34-36.

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ma kpachaaranụ onwe ụnụ anya, ụnụ ekwela ka obi ụnụ daa mba site n’ịla akụ n’iyi na oke añụmañụ na nchegbu nke ndụ a, ụbọchị ahụ ewee bịakwasa ụnụ mgbe ụnụ na-atụghị anya.

N’ihina ụbọchị ahụhụ ahụ ga-abịakwasa mmadụ niile bi n’elu ụwa. Ma nọdụnụ na nche; na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile ka ụnụ nwee ike ịgbalahụ ihe ndị a niile gaje imezu, nwekwaa ike iguzo n’ihu nwa nke mmadụ ahụ.’

Igbo Mass Readings for December 3 2023

Advertisement

Catholic Lector is the founder of Catholiclectionary.com. I am a Theologian, a commissioned Lector, and Liturgy Minister. I lead the team that operates Catholiclectionary.com which is a Catholic Church-related website that provides you, on daily basis, with the following: (a) Catholic Daily Mass Readings (b) Reflections on the Daily Mass Readings (c) Daily Prayers (d) Catholic Hymns, and (e) Saints of the Day. I and my team work for the collective growth in spiritual lives of all the faithful.

Advertisement

Get Daily Mass Readings through Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.