Igbo Mass Readings for November 28 2026, Satọde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 28 2026, Satọde Izuụka nke Iri Atọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 22:1-7

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mkpughe.

Mmụọọma ahụ gosịkwara m osimiri mke ndụ, nke na-acha ka enyo e ji ahụ ụzọ nke ọma, ka o si n’ocheeze Chineke na nke Nwaatụrụ ahụ na-asọdata. Osimiri ahụ na-asọkwa n’etiti okporoụzọ nke obodo ahụ.

Ọzọkwa, n’akụkụ osimiri ahụ bụ osisi nke ndụ ya na ụdị mkpụrụ iri na abụọ ya. Ọ na-amịpụta mkpụrụ n’ọnwa n’ọnwa, akwụkwọ ndụ nke osisi ahụ bụkwa ọgwụ maka ọgwụgwọ nke mba niile.

A gaghị ahụ ihe ọbụla Chineke bụrụ ọnụ n’ime obodo ahụ. Ocheeze Chineke na nke Nwaatụrụ ahụ ga-adịgide n’ime ya.

Ụmụodibo ya ga-efekwa ya. Ha ga-ahụ ya, a ga-edekwa aha ya n’egedege ihu ha. Abalị agaghị adịkwa ọzọ.

Ihe nke mpanaka mọbụ nke anyanwụ agaghị adịkwa ha mkpa, n’ihina Onyenweanyị Chineke ga-abụ ihe ha.

Ha ga-achị eze ebighị ebi ebighị ebi. Mmụọọma ahụ wee sị m, “Okwu ndị a kwesịrị ntụkwasịobi, bụrụkwa eziokwu.

Onyenweanyị Chineke onye na-enye ndịamụma mmụọ ha ji ebu amụma ezitela mmụọọma ya igosi ụmụodibo ya ihe ga-emezu mgbe na-adịghị anya.

Lee ana m abịa ngwa ngwa. Ngọzi ga-adịrị onye ọbụla nke ga-edobe okwu amụma niile nke dị n’ime akwụkwọ a.”

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps.95:1-2, 3-5, 6-7.

Azịza: Marana tha! Bịa Onyenweanyị Jesu.

1.Bịanụ, ka anyị kweere Onyenweanyị ukwe ọñụ

Ka anyị tisie mkpu ike tijere nkume nke nzọpụta anyị

Ka anyị bịa n’ihu ya nye ya ekele

Were egwu na ukwe tobe ya.

Azịza: Marana tha! Bịa Onyenweanyị Jesu.

2. Maka na Onyenweanyị bụ Chineke dị elu,

eze kachasị chi niile

Ihe niile dị ya n’aka bido n’okpuru ụwa

Ruo n’eluugwu ukwu niile

Oke osimiri bụ nke ya, ya mere ya

Ala akọrọ bụkwa ọrụ aka ya.

Azịza: Marana tha! Bịa Onyenweanyị Jesu.

3. Bịanụ, ka anyị fee Onyenweanyị kpọọrọ ya isi ala

ka anyị sekpue n’ihu Onyenweanyị onye kere anyị

N’ihina ọ bụ Chineke anyị,

anyịnwa bụkwa ndị nke ya, igwe atụrụ ọ na-azụ.

Azịza: Marana tha! Bịa Onyenweanyị Jesu.

MBEKU – Luk 21:36.

Alleluịa, Alleluịa:

Nọdụnụ na nche; na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile ka ụnụ nwee ike iguzo n’ihu nwa nke mmadụ ahụ.

Alleluịa.

OZIỌMA – 21:34-36.

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ma kpachaaranụ onwe ụnụ anya, ụnụ ekwela ka obi ụnụ daa mba site n’ịla akụ n’iyi na oke añụmañụ na nchegbu nke ndụ a, ụbọchị ahụ ewee bịakwasa ụnụ mgbe ụnụ na-atụghị anya.

N’ihina ụbọchị ahụhụ ahụ ga-abịakwasa mmadụ niile bi n’elu ụwa. Ma nọdụnụ na nche; na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile ka ụnụ nwee ike ịgbalahụ ihe ndị a niile gaje imezu, nwekwaa ike iguzo n’ihu nwa nke mmadụ ahụ.’

Igbo Mass Readings for November 29 2026, Ụka nke Mbụ N’oge Olileanya Onye Nzọpụta – Afọ nke Abụọ

Igbo Mass Readings for November 28 2026, Satọde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.