Igbo Mass Readings for November 11 2023, Satọde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 11 2023, Satọde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 16: 3-9, 16, 22-27

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom

Keleenụ Priska na Akwila, ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ n’ime Jesu Kristi, ndị atụghị egwu ọnwụ maka ihi m. Ana m ekele ha, ma ọ bụghị naanị m, Nzukọ nke ndị mba ọzọ niile na-ekelekwa ha.

Keleekwanụ nzukọ nke dị n’ụlọ ha. Keleerenụ m enyi m bụ Epenetus bụ onye mbụ n’ala Eshịa kwere na Kristi. Keleenụ Meri, bụ onye rụsirila ọrụ ike n’etiti ụnụ.

Keleenụ Andronikus na Juniyas, ndị Juu ibe m, mụ na ha nọkọrọ n’ụlọ mkpọrọ. Ha bụ ndị a maara nke ọma n’etiti ndịozi. Ha bukwara m ụzọ bụrụ ndị nke Kristi. Keleenụ Ampliyatus, onye bụ ezi enyi m n’ime Onyenweanyị.

Keleenụ Ọbanus, onye anyị na ya na arụkọ ọrụ n’ime Kristi, na ezi enyi m bụ Stakis. Werenụ ekele nwanne na nwanne kelerịta ibe ụnụ. Nzukọ Kristi niile na-ekele ụnụ.

Mụ onwe m bụ Tetịọs, onye depụtara akwụkwọozi a, na nwanna ụnụ n’ime Dinwenụ, na-ekele ụnụ. Gayus, onye m nọ n’ụlọ ya na onye na-ele mụ na ndị nzukọ niile ọbịa na-ekele ụnụ.

Erastus, bụ onye ojide ego nke obodo, na nwanne anyị bụ Kwatus na-ekele ụnụ. (Ka ngọzi nke Onyenweanyị Jesu Kristi dịịrị ụnụ. Amen) Ka otito dịrị Chineke, onye pụrụ ime ka okwukwe ụnụ kwụdosie ike dịka oziọma Jesu nke m na-ekwusa si dị, na dịka ihe omimi ahụ e kpugheere anyị si dị, bụ nke e zoro site n’ogologo mgbe ochie gara aga. Ugbu a Chineke ekpugheela ya.

O sitekwara n’ihe ndịamụma dere n’akwụkwọ mee ka mba niile mara ya. Chineke nke dị ebeebe kpughere nke a dịka iwu ya si dị, ka ụmụ mmadụ mụta irubere Chineke isi site n’okwukwe ha nwere na Kristi. Ka otito niile dịrị Chineke ahụ onye naanị ya mazuru ihe niile, site na Jesu Kristi ebeebe ebeebe. Amen.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 145: 2-3, 4-5, 10-11

Azịza: Onyenweanyị, aga m eto aha gị ruo mgbe ebighịebi

1. Ụbọchị niile aga m eto gị

aga m eto aha gị ruo mgbe ebighịebi

Onyenweanyị dị ukwuu kwesịkwa inye otito niile,

ebube ya dị omimi karịkwara nghọta. Azịza

2. Aga m na-eto akaọrụ gị:

site na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ

na-ekwupụtakwa ọrụ ebube gị

aga m ekwupụta otito na ebube gị

aga m atụgharị uche m n’ọrụ ebube gị niile. Azịza

3. Onyenweanyị ihe niile i kere ga-ekele gị

ndị kwere na gị ga-agọzi gị.

Ha ga-ekwupụta ebube nke alaeze gị

ma kwupụtakwa ịdị ike gị. Azịza

MBEKU – Heb. 4:12

Alleluịa, Alleluịa:

Okwu Chineke dị ndụ dị ike; Ọ bụkwa ihe nwere ike inyocha echiche na izu niile nke obi.

Alleluịa.

OZIỌMA – 16:9-15

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Nke a mere, ana m agwa ụnụ, werenụ akụ mmehie ụwa nke a metara onwe ụnụ enyi, ka ọ ga-abụ, mgbe ihe siiri ụnụ ike, ha ga-anabata ụnụ n’ụlọ obibi ha ebeebe.

Onye ọbụla kwesịrị ntụkwasịobi n’ihe dịkarịchara nta ga-ekwesịkwa ntụkwasịobi ba nnukwu ihe. Onye na-ekwesịghị ntụkwasịobi n’ihe dịkarịchara nta agaghịkwa ekwesị ntụkwasịobi na nnukwu ihe.

Ọ bụrụ na ụnụ ekwesịghị ntụkwasịobi n’akụ mmehie nke ụwa, onye ga-ejikwa ntụkwasịobi nye ụnụ nke bụ ezi akụ?

Ọ bụrụkwa na ụnụ ekwesịghị ntụkwasịobi n’ihe onyeọzọ, onye ga-enye ụnụ ihe nke bụ nke ụnụ?

Otu odibo agaghị efeli nnaukwu abụọ n’otu oge, n’ihina o nwere ike ịkpọ otu asị ma hụ nke ọzọ n’anya, mọbụ ọ ga-eji umeala fee otu, ma na-eleli nke ọzọ; ya bụ ụnụ apụghị ife Chineke na akụ.”

Mgbe ndị Farisii ndị hụrụ ego n’anya nụrụ ụkabụilu ndị a, ha chịrị Jesu ọchị. Jesu gwara ha sị, “Ụnụ bụ ndị ahụ ji aka ha akpọ onwe ha ndị ezigbo omume n’ihu ndị mmadụ.

Mana Chineke maara obi ụnụ, n’ihina ihe bụ oke ihe n’ihu ndị mmadụ bụ arụ n’ihu Chineke.”

Igbo Mass Readings for November 12 2023

Last Update: October 16, 2022