Igbo Mass Readings for July 15 2023, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 15 2023, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 49:29-33; 50:15-24
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jenesis
Jekọb kpọkọtara ụmụ ya ndị nwoke ma gwa ha okwu ndụmọdụ sị, “Oge ọnwụ m eruola, lienụ m n’akụkụ ebe e liri nna m ha, n’ili nke dị n’ugbo Efrọn, onye Het, n’ọgba nke dị n’ala ugbo dị na Mak-pela, nke chere Mamre ihu, n’obodo Kenaan nke Abraham siri n’aka Efrọn onye Het zụta, ka o bụrụ ebe olili ozu.
N’ebe ahụ ka e liri Abraham na nwunye ya bụ Sera. N’ebe ahụ ka e liri Aịzik na nwunye ya bụ Rebeka, n’ebe ahụ ka m liri Lia. Ugbo na ọgba m na-ekwu bụ nke ahụ a zụtara n’aka ụmụ Het”.
Mgbe Jekọb kwuchara ihe ndị a, ọ chịliri ukwu ya, ghasa ha n’elu akwa ya, wee kubee. Mgbe ụmụnne Josef hụrụ na nna ha anwụọla, ha kwuru sị, “Ikekwe Josef ga-akpọ anyị asị, wee kwụọ anyị ụgwọ ihe ọjọọ niile anyị mere ya”.
Nke a mere ha ji zigaara Josef ozi a sị,”Nna gị nyere anyị iwu nke a tupu ọ nwụọ. ‘Gwanụ Josef sị: “Biko ana m arịọ gị, gbahara ụmụnne gị njọ ha na ihe ọjọọ niile ha mere gị’.
Anyị na-arịọ gị ugbu a, ka ị gbaghara anyị ihe ọjọọ ụmụodibo Chineke nna gị mere”. Josef bere akwa ka ha gwara ya ihe ndị a. Ụmụnne ya bịara daa n’ụkwụ ya, gwa ya sị, “Lee, anyị bụ ndị ohu gị”.
Ma Josef zara ha sị, “Egwu atụla ụnụ, anọ m n’ọkwa Chineke? Ihe ọjọọ ụnụ chọrọ ime m ka Chineke tụgharịrị ọ bụrụ iheọma, ka o wee bụrụ na ọtụtụ ndị mmadụ ga-adị ndụ, dịka ha si dị taa.
Ya bụ, egwu atụla ụnụ; aga m elekọta ụnụ na ụmụ ụnụ anya”. Otu a ka o si gbaa ha ume, tasiekwa ha obi. Josef biri n’Ijipt, ya na ndị ezinụụlọ nna ya niile, otu narị afọ na afọ iri ka Josef nọrọ ndụ.
Josef hụrụ ụmụ Ifrem ruo ndụdụgandụ nke atọ. Ọ hụkwuru ụmụ Makii, nwa Manase, ndị nke a mụrụ n’ihu ya.
Josef gwara ụmụnne ya sị, “Oge ọnwụ m eruola, mana Chineke ga-anọnyere ụnụ, wee dupụta ụnụ n’obodo a, duruo ụnụ n’ala ahụ o kwere Abraham, Aịzik na Jekọb na nkwa”.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 105:1-2, 3-4, 6-7
Azịza: Onyenweanyị na-ege ndị niile nọ na mkpa ntị mgbe niile, ọ naghị echezọ ndị nke ya
1. Alleluia, Nyenụ Chineke ekele, kpọkuonụ aha ya,
kwupụtaranụ mba niile ọrụ ebube ya!
Kweerenụ ya ukwe, kụọrọnụ ya egwu,
kwupụtanụ ọrụ ịtụnaanya ya niile! Azịza
2. Nwebenụ añụrị n’aha nsọ ya
ka obi niile na-achọ Chineke ñụrịa.
Chọbanụ Onyenweanyị na ike ya,
chọbanụ ihu nke Onyenweanyị mgbe niile. Azịza
3. Ụnụ ụmụ Abraham bụ nwodibo ya,
ụmụ Jekọb bụ onye nke ọ họọrọ!
Ọ bụ ya bụ Onyenweanyị na Chineke anyị,
Ike ọchịchị ya gazuru ụwa niile. Azịza.
MBEKU – Ps. 130:5
Alleluia, Alleluia:
Mkpụrụobi m na-eche Onyenweanyị, na nkwa ya ka m nwere nchekwube.
Alleluia.
OZIỌMA – 10:24-33
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, Nwata akwụkwọ anaghị akarị onye nkuzi ya, odibo akarịghịkwa nna ya ukwu. O kwesịrị ekwesị ka nwata akwụkwọ dịka onye nkuzi ya, ka odibo dịka nna ya ukwu.
Ọ bụrụ na ha kpọrọ nna nwe ụlọ Belzebụl, ụdị aha gịnị ka ha ga-enye ndị ezinụụlọ ya? Ụnụ atụla egwu ha, n’ihina ọ dịghị ihe e kpuchiri nke a gaghị ekpughe, mọbụ nke e zoro ezo mmadụ agaghị amata.
Ihe m gwara ụnụ n’ọchịchịrị, kwupụtanụ n’ihe. Ihe m takwụnyeere ụnụ na ntị, kwusaanụ ya n’elu ụlọ. Ụnụ atụla egwu ndị na-egbu anụ ahụ, ma ha apụghị igbu mkpụrụobi.
Kama tụọnụ egwu onye ahụ pụrụ ime ka ahụ na mkpụrụobi laa n’iyi n’ọkụmmụọ. Ọ bụ na anaghị ere nza abụọ otu peni? Mana otu n’ime ha agaghị ada n’ala ma ọ bụrụ na ọ bụghị uche Nna ụnụ.
Otu ọ dị, a gụọlarị ntụtụisi ụnụ ọnụ. Ya bụ, ụnụ atụla egwu n’ihina ụnụ dị oke ọnụ karịa ọtụtụ nza. Onye ọbụla nke kwupụtara m n’ihu ndị mmadụ, aga m ekwupụta ya n’ihu Nna m nke bi n’eluigwe, ma onye ọbụla gọnahụrụ m n’ihu ndị mmadụ, aga m agọnahụ ya n’ihu Nna m nke bi n’eluigwe.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.