Igbo Mass Readings for July 13 2024, Satọde Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 13 2024, Satọde Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 6:1-8
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Isaiah
N’afọ nke eze Uziya nwụrụ, ahụrụ m Yahweh ka ọ nọkwasara n’elu ocheeze nke dị elu, ebube ya jupụtakwara ụlọnsọ ahụ.
Ndị mmụọọma guzoro n’elu ya; mmụọọma ọbụla nwere nku isii; abụọ n’ime nku isii ndị a ka ha ji kpuchie ihu ha, werekwa abụọ ọzọ kpuchie ụkwụ ha, ebe abụọ ọzọ ka ha ji efe efe.
Ha na-eti, “Nsọ, Nsọ Nsọ ka Yahweh nke igwe ndịagha dị; Ebube ya jupụtara n’elu ụwa niile.” Ụda olu ha mere ntọala niile nke ụlọ nsọ ahụ maa jijiji; anwụrụọkụ jupụtakwara n’ụlọnsọ ahụ.
M wee sị, “Efuola m; leenụ ụdị ọnọdụ ọjọọ m nọ n’ime ya! Maka na abụ m onye egbugbereọnụ ya rụrụ arụ ma nọrọkwa n’etiti ndị egbugbereọnụ ha rụkwara arụ.
Anya m ahụla eze, Yahweh nke igwe ndịagha.” Mgbe ahụ otu n’ime ndị mmụọọma ahụ fekwutere m, o jikwa n’aka ya otu icheku ọkụ nke o ji ihe gụta n’ebe nchụaja.
O wee metụ m icheku ọkụ ahụ n’ọnụ sị: “Lee, nke a emetụla egbugbereọnụ gị; ya bụ na e kpochapụla ikpe ọmụma gị niile; a gbagharala gị njọ gị niile.”
M wee nụ olu nke Yahweh ka ọ na-asị, “Ọ bụ onye ka m ga-eziga; onye ga-ejere anyị ya bụ ozi?” Ozigbo m zaa sị, “Anọ m ebe a, ziga m.”
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 93:1, 1-2, 5
Azịza: Onyenweanyị bụ eze, O yi ebube dịka uwe.
1. Onyenweanyị bụ eze, O yi ebube dịka uwe;
kere ike n’ukwu ka ajị. Azịza
2. mere ka ụwa kwụrụ chịm;
nke a na-enweghị ike ịkwagharị ya.
Ocheeze gị dị bido na mgbe ochie;
Ị dịrịị tupu e kee ụwa. Azịza
3. Iwu gị niile kwụsiri ike
ebe obibi gị dị nsọ, O Onyenweanyị,
Ruo mgbe ebighịebi. Azịza
MBEKU – Ps. 130:5
Alleluia, Alleluia:
Mkpụrụobi m na-eche Onyenweanyị, na nkwa ya ka m nwere nchekwube.
Alleluia.
OZIỌMA – 10:24-33
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, Nwata akwụkwọ anaghị akarị onye nkuzi ya, odibo akarịghịkwa nna ya ukwu. O kwesịrị ekwesị ka nwata akwụkwọ dịka onye nkuzi ya, ka odibo dịka nna ya ukwu.
Ọ bụrụ na ha kpọrọ nna nwe ụlọ Belzebụl, ụdị aha gịnị ka ha ga-enye ndị ezinụụlọ ya? Ụnụ atụla egwu ha, n’ihina ọ dịghị ihe e kpuchiri nke a gaghị ekpughe, mọbụ nke e zoro ezo mmadụ agaghị amata.
Ihe m gwara ụnụ n’ọchịchịrị, kwupụtanụ n’ihe. Ihe m takwụnyeere ụnụ na ntị, kwusaanụ ya n’elu ụlọ. Ụnụ atụla egwu ndị na-egbu anụ ahụ, ma ha apụghị igbu mkpụrụobi.
Kama tụọnụ egwu onye ahụ pụrụ ime ka ahụ na mkpụrụobi laa n’iyi n’ọkụmmụọ. Ọ bụ na anaghị ere nza abụọ otu peni? Mana otu n’ime ha agaghị ada n’ala ma ọ bụrụ na ọ bụghị uche Nna ụnụ.
Otu ọ dị, a gụọlarị ntụtụisi ụnụ ọnụ. Ya bụ, ụnụ atụla egwu n’ihina ụnụ dị oke ọnụ karịa ọtụtụ nza. Onye ọbụla nke kwupụtara m n’ihu ndị mmadụ, aga m ekwupụta ya n’ihu Nna m nke bi n’eluigwe, ma onye ọbụla gọnahụrụ m n’ihu ndị mmadụ, aga m agọnahụ ya n’ihu Nna m nke bi n’eluigwe.
Igbo Mass Readings for July 14 2024, Ụka nke Iri na Ise n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ
Igbo Mass Readings for July 13 2024, Satọde Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.