Igbo Mass Readings for August 2 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 2 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 25:1, 8-17
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Levitikọs
Yahweh gwara Mosis okwu n’ugwu Sinaị sị: Ụnụ ga-agụpụta afọ asaa a bawanyere ugboro asaa nke pụtara iri afọ anọ na itoolu. Mgbe ahụ, n’abalị iri nke ọnwa asaa, gbusienụ opiike: n’ụbọchị mmeda obi maka njọ gbuonụ opi gazuo obodo ụnụ niile.
Doonụ afọ nke iri ise nsọ, kwupụtanụ na onye ọbụla bụzi onye nweere onwe ya n’ala a. Ọ ga-abụrụ ụnụ afọ nnukwu añụrị mgbe onye ọbụla ga-alaghachi n’agbụrụ nna ya onye ọbụla n’ọnụmara ya.
Afọ nke iri ise a ga-abụrụ ụnụ nnukwu afọ añụrị. Ụnụ agaghị akọ ihe ubi mọbụ ghọrọ ọka pupụtaara onwe ya mọbụ ghọrọ mkpụrụ osisi si na vaịn akwachaghị akwacha.
Afọ añụrị ahụ ga-abụrụkwa ụnụ afọ dị nsọ. Ihe ụnụ ga-eri n’afọ ahụ bụ ihe ala ubi jiri aka ya mepụta. N’afọ añụrị ahụ onye ọbụla ga-alaghachi n’ala nna ya.
Mgbe ụnụ na ndị agbataobi ụnụ na-azụrịta ahịa ụnụ emegbula onwe ụnụ. Ụnụ ga-ebu n’uche afọ ole gaferela kamgbe afọ ncheta ahụ oge ọbụla ụnụ na-azụrụ onye agbataobi ụnụ ihe; a ga-etinye ọnụahịa ya dịka afọ ndị mepụtara ihe siri dị.
Afọ ya dịrị ụba ọnụahịa ya ga-adị ukwuu, afọ ya dịrị ntakịrị ọnụahịa ya agaghị ebu ibu n’ihina ihe ọ na-eresị gị bụ ụfọdụ ihe o siri n’ubi wepụta.
Ka onye ọbụla ghara imejọ onye agbataobi ya. Ụnụ ga na-atụrụ Chineke ụnụ egwu n’ihina abụ m Yahweh onye bụ Chineke ụnụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 67:1-2, 4, 6-7
Azịza: Ka mba niile too gị O Chineke
1. Ka Chineke gosi anyị obiọma ya ma gọzie anyị,
Ka o mee ka ihu ya chakwasị anyị
n’ihi n’oge ahụ ka ụwa ga-ekwupụta ụzọ gị niile,
Mba niile ga-amatakwa ike nke nzọpụta gị.
Azịza: Ka mba niile too gị O Chineke
2. Ka mba niile tie mkpu ọñụ ma kweekwa ukwe añụrị,
n’ihina ị na-ekpe ụwa ikpe ziri ezi
i ji ikpe nkwụmọtọ na-ekpe ndị mmadụ ikpe.
Azịza: Ka mba niile too gị O Chineke
3. Ala amịtala mkpụrụ ya,
Osebụrụwa Chineke anyị agọziela anyị
ka chineke gọzie anyị,
ka a tụọrọ ya egwu ruo na ngwụcha ụwa niile.
Azịza: Ka mba niile too gị O Chineke
MBEKU – Ps. 119:35, 29
Alleluia, Alleluia
Kuziere m ụzọ gị, Onyenweanyị, Kuziere m iwu gị.
Alleluia.
OZIỌMA – 14:1-12
Ihe Ọgụgụ nke a si n’oziọma dị asọ nke Matiu dere
N’oge ahụ eze Herọd nụrụ akụkọ maka ude Jesu. O wee sị ụmụodibo ya, Onye a bụ Jọn onye na-eme baptiizim. E meela ka o si n’ọnwụ bilie nke a mere o ji nwee ike ịrụ ọrụ ebube ndị a.
Herọd nyere ikikere ka e jide Jọn tụba ya n’ụlọ mkpọrọ n’ihi Herọdịas nwunye nwanne ya nwoke bụ Filip. Maka na Jọn gwara ya sị Ọ bụghị ihe ziri ezi ịkpọrọ nwunye nwanne gị.
Herọd chọrọ igbu ya ma ọ tụrụ egwu ndị mmadụ n’ihina ha weere Jọn dịka onye amụma. Ma mgbe emume nke ncheta ọmụmụ Herọd bịara, Ada Herọdịas gbara egwu pụrụ iche n’ihu ndị nnọkọ oriri ahụ.
Nke a tọrọ Herọd ụtọ nke ukwu, nke mere Herọd ji ñụọ iyi kwe nkwa inye ya ihe ọbụla ọ ga-arịọ ya. Site na mkpalite nke nne ya, ọ rịọrọ eze Herọd sị, Nye m isi Jọn onye na-eme mmirichukwu n’efere ugbu a!
lhe a wutere eze Herọd; mana n’ihi iyi ọ ñụrụ n’ihu ndị ọbịa ya o nyere iwu ka e mee nke ahụ. O zipụrụ ozi ka e gbute isi Jọn n’ụlọ mkpọrọ.
Ha butere isi Jọn n’efere bunye nwaagbọghọ ahụ o wee bugara nne ya. Ndị na-eso ụzọ Jọn bịara buru ahụ ya ga lie, ha gara kọọrọ Jesu ihe merenụ.
Igbo Mass Readings for August 3 2025, Ụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume – Afọ nke Atọ
Igbo Mass Readings for August 2 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.