Igbo Mass Readings for August 12 2023, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 12 2023, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 6:4-13
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Diuterọnọmi
Mosis gwara ọgbakọ ahụ sị, “Geenụ ntị ụmụ Izrel! Yahweh bụ Chineke anyị bụ otu! Ụnụ ga-ewere obi ụnụ niile, mmụọ ụnụ niile na ike ụnụ niile, hụ Yahweh bụ Chineke ụnụ n’anya.
Burunụ iwu ndị a m na-enye ụnụ taa n’obi. Ụnụ ga-akụziri ya ụmụ ụnụ, na-agụgharịkwa ya, ma ụnụ nọ n’ụlọ, ma ụnụ na-aga n’ụzọ, ma mgbe ụnụ na-ezu ike, ma mgbe ụnụ na-arụ ọrụ.
Kegidenụ ha n’aka ụnụ na n’egedege ihu ụnụ, ka ha bụụrụ ụnụ ihe ncheta. Dekwaanụ ha n’ọnụụzọ ụlọ ụnụ na n’ọnụụzọ ama ụnụ niile.
Mgbe Osebụrụwa kpọbatara ụnụ n’ala ahụ O kwere nnanna ụnụ ha bụ Abraham, Aịzik, na Jekọb na nkwa, nke ọtụtụ obodo ukwu mara mma ndịọzọ wuru dị n’ime ya; nke ụlọ dịcha na ya jupụtara n’ezi ihe dị icheiche nke ụnụ na-etinyeghị n’ime ha, nke ọtụtụ ụmị ụnụ na-egwughị, na ubi vaịn na osisi oliv nke ụnụ na-akụghị, jukwara na ya; mgbe Chineke kpọbatara ụnụ na ya, ụnụ nwee ihe niile ụnụ chọrọ iri, lezienụ anya ka ụnụ ghara ichefu Osebụrụwa, onye mere ka ụnụ si n’ala ljipt, ebe ụnụ bụ ndị ohu pụta.
Ya mere tụọnụ egwu Yahweh bụ Chineke ụnụ, fekwaanụ sọọsọ ya. Ọ bụkwa n’aha ya ka ụnụ ga na-añụ iyi.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 18: 2-3, 3-4, 47, 51
Azịza: Ahụrụ m gị n’anya Osebụrụwa, gị bụ ike m
1. Ahụrụ m gị n’anya Osebụrụwa, gị bụ ike m.
Osebụrụwa bụ nkume m na ebe nkwụdosiike m. Azịza
2. Onye nzọpụta m bụ Chineke m
Onye ogbugbo m, na ike nke nzọpụta m
Osebụrụwa kwesịrị inye otito
N’ihina akpọrọ m ya, Ọ zọpụtara m n’aka ndịiro m. Azịza
3. Osebụrụwa dị ndụ! Ngọzi dịrị nkume m
Ibuli elu dịrị Chineke nke nzọpụta m
Ugboro ugboro ka Ọ na-azọpụta eze ya. Azịza
MBEKU – Ps 119:105
Alleluia, Alleluia
Okwu gị bụ mpanaka na edu m, bụrụkwa ihe n’ụzọ m.
Alleluia.
OZIỌMA – 17:14-20
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Mgbe ha rutere ebe igwe mmadụ ahụ nọ, otu nwoke bịakwutere Jesu gbuoro ya ikpereala sị; “Onyenwe m meere nwa m nwoke ebere, n’ihina akwụkwụ na-adọ ya. Ọ na-ata oke ahụhụ.
Mgbe ụfọdụ ọ na-adaba n’ọkụ mọbụ na mmiri. Akpọtaara m ya ndị na-eso ụzọ gị ma ha enweghị ike ịgwọ ya.
Jesu etie sị, “Ewo! Ụnụ ọgbọ hiere ụzọ, na enweghị okwukwe, ruo ole mgbe ka mụ na ụnụ ga-anọ? Aga m edịgide omume ụnụ ruo ole mgbe? Kpọtara m nwata ahụ ebe a.”
Jesu baara mmụọ ọjọọ ahụ mba. O wee si n’ime nwatakịrị ahụ pụọ. Ahụ dịkwara nwatakịrị ahụ mma ozigbo ahụ.
Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ Jesu bịakwutere ya jụọ ya na nzuzo sị, “Gịnị mere anyị onwe anyị enweghị ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ ahụ?”
Jesu zara ha sị, “Ọ bụ maka ihi obere okwukwe ụnụ; N’ezie, agwa m ụnụ: ọ bụrụ na ụnụ nwere okwukwe pere mpe dịka mkpụrụ osisi mọstad, ụnụ ga-asi ugwu a si ebe a gaa n’ofe nke ọzọ.
Ọ ga-emekwa otu ahụ. Ọ dịghịkwa ihe ọbụla ga-anyị ụnụ n’omume.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.