Igbo Mass Readings for July 5 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 5 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 27:1-5, 15-29
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jenesis
Mgbe Aịzik merela agadi, ọ naghị ahụzi ụzọ nke na ọ kpọrọ ọkpara ya bụ Ịsọ, sị ya, “Nwa m”. Ịsọ zara ya, “Anọ m ebe a”. Mgbe ahụ ọ sịrị, “Lee emeela m agadi, amaghị m mgbe m ga-anwụ.
Ugbu a were ngwa ọgụ gị, akpa na ụta gị, gaa n’ime ọhịa gbatara m ọnụ. Siere m ụdị nri ụtọ na-adị m mma, butere m ya ka m rie nye gị ngọzi m tupu mụ anwụọ”.
Ribeka nọ na-ege ntị mgbe Aịzik na-agwa nwa ya Ịsọ okwu. Ya mere mgbe Ịsọ gara n’ime ọhịa ịgbatara nna ya anụ.
Ribeka were uwe nwa ya Ịsọ nke kacha mma, bụ nke o nwere n’ụlọ, ma yiwe ya nwa ya Jekọb, o jiri akpụkpọ ụmụatụrụ ahụ kpuchie aka ya na olu ya dị mụrụmụrụ.
O bunyere Jekọb nri ụtọ na achịcha ahụ o siri. Ọ gakwuru nna ya kpọọ ya, “Nna m!” Nna ya zaghachiri, “Anọ m ebe a, ị bụ onye nwa m?”
Jekọb asị nna ya, “Abụ m Ịsọ ọkpara gị, meere m dịka i siri gwa m. Biko kulie rie anụ nke m wetere ma nye m ngọzi gị”. Aịzik asị nwa ya, nwa m ị bịara n’oge karịa ka m si tụọ anya. Ya azaghachi sị, “Ọ bụ Yahweh Chineke gị mere ka ihe gaara m nke ọma”.
Aịzik sị Jekọb, “Bịa nso, nwa m, ka m nwee ike metụ gị aka mara n’ezie ma ị bụkwa nwa m nwoke Ịsọ, Jekọb bịaketere Aịzik nna ya nso, onye metụrụ ya aka sị, “Olu bụ olu Jekọb ma aka ndị a bụ aka Ịsọ”.
Ọ mataghị ya maka na aka ya abụọ dị ajị ajị dịka nke nwanne ya Ịsọ, o wee gọzie ya. Ọ sị, “Ị bụ nwa m Ịsọ n’ezie? Ọ zara ya, “Abụ m”. Aịzik asị, “Butere m ya, ka m rie anụ nwa m gbatara ma nye gị ngọzi m”.
O butere ya o rie, o nye ya mmanya, ọ ñụọ. Nna ya Aịzik asị ya, “Bịa m nso, ma susuo m ọnụ, nwa”. Ọ bịaketere ya nso ma susuo nna ya ọnụ, onye nụrụ isi uwe ya.
Ọ gọzie ya, sị, “Ee, nwa m na-esi ka ala Yahweh gọziri agọzi. Ka Chineke nye gị igirigi nke si n’Eluigwe na akụnụụba nke ụwa a, na ọtụtụ nri na mmanya!
Ka mba niile fee gị, ka ndị mmadụ kpọọ isi ala n’ihu gị! Bụrụ nnaukwu nke ụmụnne gị; ka ụmụnne gị ndịọzọ kpọọ isi ala n’ihu gị! Abụmọnụ dịrị onye ọbụla bụrụ gị ọnụ ma ngọzi dịrị onye ọbụla gọziri gị”.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 135:1-2, 3-4, 5-6
Azịza: Toonụ Onyenweanyị n’ihina ọ dị mma.
1. Alleluịa, Toonụ aha Onyenweanyị!
Toonụ Onyenweanyị, ụnụ ndị na-agbara ya odibo;
ndị na-agba odibo n’ụlọ Osebụrụwa,
n’ogige nke ụlọ nke Chineke anyị!
Azịza: Toonụ Onyenweanyị n’ihina ọ dị mma.
2. Toonụ Onyenweanyị n’ihina ọ dị mma;
Tierenụ aha ya egwu, n’ihina ọ dị ebere.
N’ihina Onyenweanyị ahọrọla Jekọb;
Ọ họrọla Izrel ka ọ bụrụ nke ya.
Azịza: Toonụ Onyenweanyị n’ihina ọ dị mma.
3. Amatala m n’onwe m na Onyenweanyị dị ukwuu,
na Chineke anyị kacha chi ndịọzọ niile.
Uche nke Onyenweanyị na-eme, ka n’eluigwe, ka n’ụwa
Ka n’ime osimiri na n’ime ime oke osimiri.
Azịza: Toonụ Onyenweanyị n’ihina ọ dị mma.
MBEKU – Ps. 119:34
Alleluia, Alleluịa:
Nye m nghọta ka m wee mata iwu gị, wee nwee ike iji obi m niile dobe iwu gị.
Alleluịa.
OZIỌMA – 9:14-17
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.
E mechaa, ụmụazụ Jọn bịakwutere ya jụọ ya sị, “Gịnị mere anyị na ndị Farisii ji ebu ọnụ ma ụmụazụ gị anaghị ebu ọnụ?
Jesu zara ha sị, “Ndị bịara oriri agbamakwụkwọ ha ga-anọ n’uru mgbe ha na nwoke na-agba akwụkwọ ka nọ? Oge na-abịa mgbe a ga-anapụ ha nwoke na-agba akwụkwọ, mgbe ahụ, ha ga-ebube ọnọ”.
O nweghị onye ga-ewere iperipe akwa ọhụrụ dụchie akwa ochie, n’ihina ọ ga-esi n’akwa ahụ dọkapụ, ndọka a ga-aka njọ. A naghịkwa agbanye mmanya ọhụrụ n’ime udu ochie.
E mee otu a, udu ahụ ga-agbawa, mmanya ahụ awụfuo, udu ahụ alakwaa n’iyi. Kama, a na-agbanye mmanya ọhụrụ n’ime udu ọhụrụ, n’ụzọ dị otu a ka e si echekwa ha abụọ.
Igbo Mass Readings for July 6 2025, Ụka nke Iri na anọ n’Oge Nkịtị – Afọ nke Atọ
Igbo Mass Readings for July 5 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.